< Jeremaya 31 >

1 “Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”
Zu jener Zeit - ist der Spruch Jahwes - will ich allen Geschlechtern Israels Gott sein, und sie sollen mein Volk sein.
2 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ndị ahụ gbanarịrị mma agha ga-ahụta ihuọma nʼọzara. Aga m abịa iwetara Izrel izuike.”
So spricht Jahwe: Gnade fand in der Wüste das Volk der dem Schwert Entronnenen: gehe hin, daß du ihm, - Israel - Ruhe verschaffest!
3 Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.
Von fern her erschien mir Jahwe: ja, mit immerwährender Liebe habe ich dich geliebt, darum habe ich dir meine Huld langmütig bewahrt.
4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.
Ich will dich wiederum aufbauen, daß du wohl auferbaut seiest, o Jungfrau Israel! Du sollst dich wiederum mit deinen Handpauken zieren, daß du im Reigen Fröhlicher ausziehest!
5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.
Du sollst wiederum Weingärten pflanzen auf Samariens Bergen - die sie angepflanzt haben, die sollen sie auch zu nutzen anfangen!
6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’”
Ja, einen Tag wird's geben, da Wächter auf dem Gebirge Ephraim rufen: Auf, laßt uns nach dem Zion, zu Jahwe, unserem Gotte, hinausziehen!
7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’
Denn so spricht Jahwe: Jubelt über Jakob voll Freude und jauchzt über das Haupt der Völker! Preiset laut und sagt: Hilf, Jahwe, deinem Volke, dem Überreste Israels!
8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!
Fürwahr, ich will sie aus dem Nordlande herbringen und sie sammeln vom äußersten Rande der Erde, - unter ihnen Blinde und Lahme, Schwangere und Wöchnerinnen zumal: eine große Schar sollen sie hierher zurückkehren!
9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.
Mit Weinen werden sie kommen und mit flehentlichen Gebeten: geleiten will ich sie, sie zu Wasserbächen führen, auf ebenem Wege, darauf sie nicht straucheln können; denn Vater bin ich Israel geworden, und Ephraim ist mein Erstgeborener!
10 “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Hört das Wort Jahwes, ihr Völker, und thut es kund auf den Inseln in der Ferne und sprecht: Der Israel zerstreute, sammelt es und wird es behüten wie ein Hirte seine Herde!
11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
Denn Jahwe befreit Jakob und erlöst ihn aus der Gewalt des, der ihm zu stark war,
12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.
daß sie kommen und jubeln auf Zions Höhe und hinströmen zu der Güte Jahwes, zum Getreide und zum Most und zum Öl und zu den jungen Schafen und Rindern, und daß ihre Seele einem wohl bewässerten Garten gleiche, und sie fernerhin nicht mehr dahinschmachten.
13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
Alsdann wird sich die Jungfrau am Reigen erfreuen, und Jünglinge und Greise zumal, und ich will ihre Trauer in Wonne wandeln und sie trösten und fröhlich machen nach ihrem Kummer.
14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta, afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Und ich will die Seelen der Priester mit Fett laben, und mein Volk soll sich sättigen an meiner Güte - ist der Spruch Jahwes.
15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”
So spricht Jahwe: Horch! in Rama wird Klage laut, bitterliches Weinen! - Rahel beweint ihre Kinder, und will sich nicht trösten lassen um ihrer Kinder willen, weil sie nicht mehr sind!
16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.
Doch so spricht Jahwe: Höre auf mit deinem lauten Weinen und laß deine Augen nicht länger Thränen vergießen, denn es giebt noch einen Lohn für deine Mühe - ist der Spruch Jahwes: sie sollen heimkehren aus des Feindes Land.
17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
Ja, es giebt noch eine Hoffnung für deine Zukunft - ist der Spruch Jahwes: die Kinder sollen heimkehren in ihr Gebiet!
18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.
Ich höre wohl, wie Ephraim beweglich klagt: Du hast mich gezüchtigt, und ich mußte mich züchtigen lassen, einem jungen Rinde gleich, das noch ungezähmt, - laß mich heimkehren, und so will ich umkehren, denn du bist Jahwe, mein Gott!
19 Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’
Denn nachdem ich mich von dir abgewendet, bin ich reumütig geworden, und nachdem ich zur Einsicht gelangt bin, schlage ich mich auf die Hüfte: ich schäme mich, ja, ich bin tief beschämt, weil ich die Schmach meiner Jugend trage.
20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ist mir denn Ephraim ein so teurer Sohn oder ein Lieblingskind, daß, so oft ich ihn auch bedrohte, ich doch immer wieder seiner gedenken muß? Darum tobt mein Inneres von Mitleid für ihn - ich muß mich seiner erbarmen! - ist der Spruch Jahwes.
21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.
Stelle dir Wegweiser auf, errichte dir Merkzeichen, richte dein Augenmerk auf die Bahn, den Weg, den du gegangen bist, - kehre heim, Jungfrau Israel, kehre heim in diese deine Städte!
22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”
Wie lange willst du dich scheu umherdrücken, du abtrünnige Tochter? Fürwahr, etwas Neues schafft Jahwe auf Erden: das Weib umkreist den Mann!
23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’
So spricht Jahwe der Heerscharen, der Gott Israels: Aufs Neue wird man im Lande Juda und in seinen Städten, wenn ich ihr Geschick gewendet habe, dieses Wort sagen: Jahwe segne dich, du Aue der Gerechtigkeit, du heiliger Berg!
24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.
Und Juda soll darin wohnen mit allen seinen Städten zumal, Ackerleute und solche, die mit der Herde ziehen:
25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
denn ich labe die lechzenden Seelen und jegliche dahinschmachtende Seele sättige ich.
26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
Darob wird man alsdann sagen: Ich bin aufgewacht und schaue, und der Schlaf war mir so süß!
27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.
Fürwahr, es kommt die Zeit - ist der Spruch Jahwes -, da will ich das Gebiet Israels und das Gebiet Judas mit Menschensamen und mit Viehsamen besäen,
28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
und gleichwie ich über ihnen gewacht habe, sie auszurotten und zu zerstören, niederzureißen und zu verderben und mit Unheil zu verfolgen, so will ich über ihnen wachen, sie zu bauen und zu pflanzen! - ist der Spruch Jahwes.
29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
In jenen Tagen wird man nicht mehr sagen: die Väter haben Herlinge gegessen, und den Kindern sind die Zähne davon stumpf geworden!
30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
Vielmehr ein jeglicher wird um seiner eigenen Verschuldung willen sterben; wer irgend Herlinge ißt, dem sollen die Zähne stumpf werden!
31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.
Fürwahr, es kommt die Zeit - ist der Spruch Jahwes -, da will ich mit dem Hause Israel und mit dem Hause Juda einen neuen Bund schließen,
32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
nicht wie der Bund war, den ich mit ihren Vätern schloß, als ich sie bei der Hand nahm, um sie aus Ägypten wegzuführen, welchen Bund mit mir sie gebrochen haben, obwohl ich doch ihr Eheherr war! - ist der Spruch Jahwes.
33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
Vielmehr darin soll der Bund bestehen, den ich nach dieser Zeit mit dem Hause Israel schließen will - ist der Spruch Jahwes: Ich lege mein Gesetz in ihr Inneres und schreibe es ihnen ins Herz, und so will ich ihr Gott sein, und sie sollen mein Volk sein!
34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Fürderhin sollen sie nicht mehr einer den andern oder ein Bruder den andern also belehren: Erkennet Jahwe! Denn sie werden mich allesamt erkennen vom Kleinsten bis zum Größten - ist der Spruch Jahwes -, denn ich will ihnen ihre Verschuldung vergeben und ihrer Sünde nicht mehr gedenken!
35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
So spricht Jahwe, der die Sonne bestimmt hat, daß sie bei Tage leuchte, die Ordnungen des Mondes und der Sterne, daß sie leuchten bei Nacht, der das Meer aufwühlt, daß seine Wogen brausen, - Jahwe der Heerscharen ist sein Name:
36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
So wenig diese Ordnungen sich je vor mir ändern werden - ist der Spruch Jahwes -, so wenig sollen die Nachkommen Israels jemals aufhören, ein Volk vor mir zu sein!
37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, na ịdị omimi nke ntọala ụwa, ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, nʼihi ihe niile ha mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
So spricht Jahwe: So wenig der Himmel droben ausgemessen oder die Grundfesten der Erde drunten erforscht werden können, so wenig werde ich die gesamte Nachkommenschaft Israels verwerfen wegen alles dessen, was sie gethan, - ist der Spruch Jahwes.
38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.
Fürwahr, es kommt die Zeit - ist der Spruch Jahwes -, da soll die Stadt für Jahwe wieder aufgebaut werden vom Turme Hananeels bis zum Eckthor,
39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.
und weiter soll sich die Meßschnur geradeaus zum Hügel Gareb hinüberziehen und dann umbiegen nach Goah.
40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”
Und das ganze Thal der Aeser und der Asche und der ganze Anger bis zum Kidronbache, bis östlich zur Ecke des Roßthors sollen Jahwe heilig sein: nie soll da mehr zerstört oder niedergerissen werden!

< Jeremaya 31 >