< Jeremaya 30 >

1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
Leli yilizwi elafika kuJeremiya livela kuThixo lisithi:
2 “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.
“UThixo, uNkulunkulu ka-Israyeli uthi, ‘Loba encwadini wonke amazwi engiwakhulume kuwe.
3 Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”
Insuku ziyeza,’ kutsho uThixo, ‘lapho engizabuyisa abantu bami u-Israyeli loJuda bevela ekuthunjweni ngibabuyisele elizweni engalinika okhokho babo ukuba libe ngelabo,’ kutsho uThixo.”
4 Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda.
Amazwi akhulunywa nguThixo ngo-Israyeli loJuda:
5 “Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.
“Wathi: ‘Ukukhala kokwesaba kuzwakele, ukwesaba okukhulu, hatshi ukuthula.
6 Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
Buzani libone: Indoda ingazala abantwana na? Pho kungani ngibona wonke amadoda aqinileyo ebambe izisu zawo ngezandla njengowesifazane ohelelwayo, ubuso bonke sebube mhlotshana okokufa?
7 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.
Yeka ukwesabeka okuzakuba yilolosuku! Kalukho oluzakuba njengalo. Kuzakuba yisikhathi sokuhlupheka kukaJakhobe, kodwa uzahlengwa kukho.
8 “‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
Ngalolosuku,’ kutsho uThixo uSomandla, ‘ngizalephula ijogwe entanyeni zabo ngiqamule lezibopho zabo; abezizweni kabasayikubagqilaza futhi.
9 Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.
Esikhundleni salokho, bazasebenzela uThixo uNkulunkulu wabo, loDavida inkosi yabo, engizabavusela yona.
10 “‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
Ngakho ungesabi, wena Jakhobe nceku yami; ungadangali, wena Israyeli,’ kutsho uThixo. ‘Ngeqiniso ngizakuhlenga ezindaweni ezikude, lenzalo yakho elizweni lokuthunjwa kwayo. UJakhobe uzakuba lokuthula futhi kanye lokuvikeleka, njalo kakho ozamenza esabe.
11 Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri, ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
Ngilawe njalo ngizakuhlenga,’ kutsho uThixo. ‘Lanxa ngizichitha ngokupheleleyo zonke izizwe engikuhlakazela kuzo, wena angiyikukuchitha ngokupheleleyo. Ngizakuqondisa kodwa ngokufaneleyo kuphela; kangiyikukuyekela ungajeziswanga.’
12 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.
UThixo uthi: ‘Isilonda sakho kaselapheki, ukulimala kwakho akupholi.
13 O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
Kakho okhulumela inhloso yakho, akulamuthi wesilonda sakho, akukho kuphola kuwe.
14 Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.
Bonke abangane bakho sebekukhohliwe; kabalandaba lawe. Ngikutshaye njengokungenziwa yisitha ngakujezisa njengokungenziwa ngolesihluku, ngoba icala lakho likhulu kakhulu lezono zakho zinengi kakhulu.
15 Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.
Kungani ukhaliswa linxeba lakho, ubuhlungu bakho obungelaphekiyo na? Ngenxa yecala lakho elikhulu lezono ezinengi ngenze lezizinto kuwe.
16 “‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
Kodwa bonke abakudlayo bazadliwa; zonke izitha zakho zizathunjwa. Labo abakuphangayo bazaphangwa; bonke abakwemukayo ngizabemuka.
17 Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
Kodwa ngizakusilisa ngipholise lamanxeba akho,’ kutsho uThixo, ‘ngoba kuthiwa ungolahliweyo, iZiyoni okungekho olendaba lalo.’
18 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.
UThixo uthi: ‘Ngizavuselela inotho yasemathenteni kaJakhobe ngibe lesihawu emakhaya akhe; idolobho lizakwakhiwa kutsha emanxiweni alo, lendlu yobukhosi izakuma endaweni yayo uqobo.
19 Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya.
Kubo kuzavela izingoma zokubonga kanye lomsindo wokuthokoza. Ngizakwandisa amanani abo, njalo kabayikuphungulwa; ngizabenza bahlonitshwe, njalo kabayikweyiswa.
20 Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.
Abantwana babo bazakuba njengezinsukwini zakudala, lebandla labo lizamiselwa phambi kwami; ngizabajezisa bonke ababancindezelayo.
21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Umkhokheli wabo uzakuba ngomunye wabakibo; umbusi wabo uzavela phakathi kwabo. Ngizamsondeza eduze, uzakuza phansi kwami, ngoba ngubani lowo ongazinikela ukuba seduze kwami na?’ kutsho uThixo.
22 ‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’”
‘Ngakho lina lizakuba ngabantu bami, mina ngibe nguNkulunkulu wenu.’”
23 Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.
Khangelani, isiphepho sikaThixo sizakhupha ulaka, umoya osasivunguzane usehlela phezu kwamakhanda ababi.
24 Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a.
Ulaka olwesabekayo lukaThixo kaluyikudeda aze ayifeze ngokupheleleyo injongo yenhliziyo yakhe. Ensukwini ezizayo lizakuzwisisa lokhu.

< Jeremaya 30 >