< Jeremaya 3 >
1 “Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Bí ọkùnrin kan bá sì kọ ìyàwó rẹ̀ sílẹ̀ tí obìnrin náà sì lọ fẹ́ ọkọ mìíràn, ǹjẹ́ ọkùnrin náà tún lè tọ̀ ọ́ wá? Ǹjẹ́ ilẹ̀ náà kò ní di aláìmọ́ bí? Ṣùgbọ́n ìwọ ti gbé pẹ̀lú onírúurú panṣágà gẹ́gẹ́ bí olùfẹ́, ṣé ìwọ yóò tún padà sọ́dọ̀ mi bí?” ni Olúwa wí.
2 “Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.
“Gbé ojú rẹ sókè sí ibi gíga wọ̀n-ọn-nì, kí o sì wò ó ibi kan ha wà tí a kò bà ọ́ jẹ́? Ní ojú ọ̀nà, ìwọ jókòó de àwọn olólùfẹ́, bí i ará Arabia kan nínú aginjù, ìwọ sì ti ba ilẹ̀ náà jẹ́ pẹ̀lú ìwà àgbèrè àti ìwà búburú rẹ.
3 Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.
Nítorí náà, a ti fa ọ̀wààrà òjò sẹ́yìn, kò sì ṣí òjò àrọ̀kúrò. Síbẹ̀ ìwọ ní ojú líle ti panṣágà, ìwọ sì kọ̀ láti ní ìtìjú.
4 Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.
Ǹjẹ́ ìwọ kò ha a pè mí láìpẹ́ yìí pé, ‘Baba mi, ìwọ ọ̀rẹ́ mi láti ìgbà èwe mi.
5 Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”
Ìwọ yóò ha máa bínú títí? Ìbínú rẹ yóò ha máa lọ títí láé?’ Báyìí ni o ṣe ń sọ̀rọ̀ ìwọ ṣe gbogbo ibi tí ìwọ le ṣe.”
6 Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.
Ní àkókò ìjọba Josiah ọba, Olúwa wí fún mi pé, “Ṣé o ti rí nǹkan tí àwọn Israẹli aláìnígbàgbọ́ ti ṣe? Wọ́n ti lọ sí àwọn òkè gíga àti sí abẹ́ àwọn igi, wọ́n sì ti ṣe àgbèrè níbẹ̀.
7 Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya.
Mo rò pé nígbà tí wọ́n ti ṣe èyí wọn yóò padà, wọn kò padà, Juda aláìgbàgbọ́ arábìnrin rẹ̀ náà sì rí i.
8 Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.
Mo fún Israẹli aláìnígbàgbọ́ ní ìwé ìkọ̀sílẹ̀, mo sì ké wọn kúrò nítorí gbogbo àgbèrè wọn. Síbẹ̀ mo rí pé Juda tí ó jẹ́ arábìnrin rẹ̀ kò bẹ̀rù, òun náà sì jáde lọ láti lọ ṣe àgbèrè.
9 Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.
Nítorí ìwà èérí Israẹli kò jọ ọ́ lójú, ó ti ba ilẹ̀ jẹ́, ó sì ti ṣe àgbèrè pẹ̀lú òkúta àti igi.
10 Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Látàrí gbogbo nǹkan wọ̀nyí Juda arábìnrin rẹ̀ aláìgbàgbọ́ kò padà tọ̀ mí wá pẹ̀lú gbogbo ọkàn rẹ̀, bí kò ṣe nípa fífarahàn bí olóòtítọ́,” ni Olúwa wí.
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.
Olúwa wí fún mi pé, “Israẹli aláìnígbàgbọ́ ṣe òdodo ju Juda tí ó ní ìgbàgbọ́ lọ.
12 Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.
Lọ polongo ọ̀rọ̀ náà, lọ sí ìhà àríwá: “‘Yípadà, Israẹli aláìnígbàgbọ́,’ ni Olúwa wí. ‘Ojú mi kì yóò korò sí ọ mọ́, nítorí mo jẹ́ aláàánú, ni Olúwa wí. Èmi kì yóò sì bínú mọ́ títí láé.
13 Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Sá à ti mọ ẹ̀bi rẹ, ìwọ ti ṣọ̀tẹ̀ sí Olúwa Ọlọ́run rẹ, ìwọ ti wá ojúrere rẹ lọ́dọ̀ ọlọ́run àjèjì lábẹ́ gbogbo igikígi tí ó gbilẹ̀, ẹ̀yin kò gba ohun mi gbọ́,’” ni Olúwa wí.
14 “Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
“Padà, ẹ̀yin ènìyàn aláìnígbàgbọ́,” ni Olúwa wí, “nítorí èmi ni ọkọ rẹ. Èmi ó yàn ọ́, ọ̀kan láti ìlú àti méjì láti ẹ̀yà. Èmi ó sì mú ọ wá sí Sioni.
15 Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.
Lẹ́yìn èyí, èmi ó fún ọ ní àwọn olùṣọ́-àgùntàn láti inú ọkàn mi, tí wọn yóò ṣáájú yín pẹ̀lú òye àti ìmọ̀.
16 Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.
Ní ọjọ́ wọ̀n-ọn-nì, tí ẹ̀yin bá pọ̀ sí i lórí ilẹ̀ náà,” ni Olúwa wí, “àwọn ènìyàn kò tún lè sọ pé, ‘Àpótí ẹ̀rí Olúwa.’ Kò ní wá sí ìrántí wọn mọ́, a kì yóò pàdánù rẹ̀, bẹ́ẹ̀ ni a kì yóò sì tún kan òmíràn mọ́.
17 Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.
Ní ìgbà náà, wọn yóò pe Jerusalẹmu ní ìtẹ́ Olúwa gbogbo orílẹ̀-èdè yóò péjọ sí Jerusalẹmu láti bọ̀wọ̀ fún orúkọ Olúwa, wọn kì yóò sì tún tẹ̀lé àyà líle búburú wọn mọ́.
18 Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”
Ní ọjọ́ wọ̀n-ọn-nì ni ilé Juda yóò darapọ̀ mọ́ ilé Israẹli. Wọn yóò sì wá láti ilẹ̀ àríwá wá sí ilẹ̀ tí mo fi fún àwọn baba ńlá yín gẹ́gẹ́ bí ilẹ̀ ìní.
19 “Mụ onwe m kwuru sị, “‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.
“Èmi fúnra mi sọ wí pé, “‘Báwo ni inú mi yóò ti dùn tó, kí èmi kí ó tọ́ ọ bí ọmọkùnrin kí n sì fún ọ ní ilẹ̀ tí ó tó.’ Mo rò pé ìwọ yóò pè mí ní ‘Baba mi’ o kò sì ní ṣàì tọ̀ mí lẹ́yìn.
20 Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ṣùgbọ́n gẹ́gẹ́ bí aláìgbàgbọ́ obìnrin sí ọkọ rẹ̀, bẹ́ẹ̀ gẹ́gẹ́ o jẹ́ aláìgbàgbọ́ sí mi. Ìwọ ilé Israẹli,” ni Olúwa wí.
21 A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
A gbọ́ ohùn àgàn láti ibi gíga, ẹkún àti ẹ̀bẹ̀ àwọn ọmọ Israẹli, nítorí wọ́n ti yí ọ̀nà wọn po, wọ́n sì ti gbàgbé Olúwa Ọlọ́run wọn.
22 “Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.
“Padà, ẹ̀yin ènìyàn aláìnígbàgbọ́, Èmi ó wo ìpadàsẹ́yìn kúrò ní ọ̀nà títọ́ rẹ sàn.” “Bẹ́ẹ̀, ni a ó wá sọ́dọ̀ rẹ nítorí ìwọ ni Olúwa Ọlọ́run wa.
23 Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.
Nítòótọ́, asán ni ìbọ̀rìṣà àti ìrúkèrúdò tí ó wà ní àwọn orí òkè kéékèèké àti àwọn òkè gíga, nítòótọ́, nínú Olúwa Ọlọ́run wa ni ìgbàlà Israẹli wà.
24 Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.
Láti ìgbà èwe wa ni àwọn òrìṣà ìtìjú ti jẹ èso iṣẹ́ àwọn baba wa run, ọ̀wọ́ ẹran wọn àti agbo ẹran wọn, ọmọkùnrin àti ọmọbìnrin wọn.
25 Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”
Jẹ́ kí a dùbúlẹ̀ nínú ìtìjú wa, kí ìtìjú wa bò wá mọ́lẹ̀. A ti ṣẹ̀ sí Olúwa Ọlọ́run wa, àwa àti àwọn baba wa, láti ìgbà èwe wa títí di òní a kò gbọ́rọ̀ sí Olúwa Ọlọ́run wa.”