< Jeremaya 3 >
1 “Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.
試問:若男人離棄了自己的妻子,她離開他而另嫁了別人,前夫豈能再回到她那裏去﹖像這樣的女人,豈不是已全被玷污了嗎﹖你已與許多愛人行淫,你還想回到我這裏來嗎﹖──上主的斷語──
2 “Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.
你舉目環顧高丘.看看在什麼地方你沒有受過玷污﹖你坐在路旁等候他們,像個在阿刺伯人,以你淫亂和邪惡玷污了這土地。
3 Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.
秋雨不降,春雨不來。你具有娼妓的面孔,仍然不知羞恥。
4 Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.
從此以後,你要向我喊說:「我父! 你是我青年時的良友!」
5 Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”
心想:「衪豈能永遠發怒,懷恨到底﹖」看,你雖如此說,卻仍盡力作惡。
6 Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.
在若史雅為王的時日裏,上主對我說:「失節的以色列所做的,你看見了沒有﹖她上到一切高處上,走到所有的綠樹下,在那裏行淫。
7 Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya.
我以為她作了這一切以後,會回到我這裏來;但是她沒有回來。她失信的姊妹猶大也看見了此事:
8 Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.
雖然看見了我為了失節的以色列所犯的種種姦淫,而命她離去,給了她休書,她這失信的姊妹猶大卻不害怕,竟然也去行淫。
9 Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.
由於她輕易行淫,與石碣和木偶淫亂,玷污了這土土也。
10 Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
儘管這樣,她失信的姊妹猶大回到我這裏來,仍不是全心,只是假意──上主的斷語。」
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.
上主於是對我說:「失節的以色列比失信的猶大 ,更顯得正義。
12 Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.
你去向北方宣布這些話說:失節的以色列! 請你歸來──上主的斷語──我不會對你怒容相向,因為我是仁慈的──我不會永遠發怒,
13 Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
只要你承認你的罪過,承認背叛上主你的天主,在一切綠樹下,與異邦神祗恣意相愛,沒有聽我的聲音,上主的斷語。
14 “Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
失節的女子,妳們歸來──上主的斷語──因為我是你們的主人,我要選取妳們,每城選一人,每族選二人,領妳們進入熙雍;
15 Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.
在那裏給妳們一些隨我心意的牧者,以智慧和明智牧養妳們。
16 Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.
你們在這地上繁衍增值的時日裏──上主的斷語──人不再提「上主的約櫃」,也不再思念,不再追憶,不再關懷,不再製造。
17 Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.
那時,人要稱耶路撒冷為「上主的御座」,萬民要奉上主的名,匯集在耶路撒冷,不再隨從自己邪惡而頑固的人行事。
18 Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”
在那些時日內,猶大家與以色列家同行,從北方起回到我賜給了你們祖先作基業的地內。
19 “Mụ onwe m kwuru sị, “‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.
我曾想過:多麼願意你像一個兒子,賜給你賞心悅目的土地,列國中最美好的領土,我以為你會以「我父」稱呼我,不會轉身遠離我;
20 Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
但是,你們,以色列家對待我,正如對自己良友不忠的婦女──上主的斷語。
21 A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
在荒丘上可聽到一片喧嚷:那是以色列子民的哀號哭泣,因為他們走入了邪途,忘卻了自己的天主。
22 “Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.
歸來! 失節的子民,讓我療愈你們的失節。」「看,我回到你這裏,的確,你是上主,我們的天主。
23 Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.
誠然丘嶺和山卜的狂歡盡是虛幻;唯在上主,我們的天主那裏,有以色列的救援。
24 Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.
可恥的神祗,自我們幼年就吞噬了我們祖先的收入,他們的羊群、牛群和子女。
25 Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”
讓我們躺臥在我們恥辱中,讓我們以羞慚遮蓋我們,因為我們和我們的祖先,自我們幼年直到今日,得罪了上主我們的天主,從來沒有聽從上主我們的天主的聲音。」