< Jeremaya 28 >

1 O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m.
Kaka na mobu wana, mobu ya minei, na ebandeli ya bokonzi ya Sedesiasi, mokonzi ya Yuda, na sanza ya mitano, mosakoli Anania, mwana mobali ya Azuri, moto ya mboka Gabaoni, alobaki na ngai kati na Tempelo ya Yawe na miso ya Banganga-Nzambe mpe ya bato nyonso:
2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn.
« Tala liloba oyo Yawe, Mokonzi ya mampinga, Nzambe ya Isalaele, alobi: ‹ Nakobuka ekangiseli ya mokonzi ya Babiloni.
3 Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn.
Etikali kaka mibu mibale; nakozongisa na esika oyo bisalelo nyonso ya Tempelo ya Yawe, oyo Nabukodonozori, mokonzi ya Babiloni, azwaki na esika oyo mpe amemaki na Babiloni.
4 Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Nakozongisa lisusu na esika oyo: Yekonia, mwana mobali ya Yeoyakimi, mokonzi ya Yuda, mpe bato nyonso oyo, wuta na Yuda, bakendeki na bowumbu, na Babiloni, › elobi Yawe, ‹ pamba te nakobuka ekangiseli ya mokonzi ya Babiloni. › »
5 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị
Bongo Mosakoli Jeremi azongiselaki mosakoli Anania eyano na miso ya Banganga-Nzambe mpe ya bato nyonso oyo batelemaki kati na Tempelo ya Yawe.
6 Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn.
Mosakoli Jeremi alobaki: « Amen! Tika ete Yawe asala bongo! Tika ete Yawe akokisa maloba oyo osili kosakola, azongisa na esika oyo, wuta na Babiloni, bisalelo ya Tempelo ya Yawe mpe bato nyonso oyo bakendeki na bowumbu!
7 Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a.
Nzokande, yoka maloba oyo nalingi koloba na yo mpe na bato nyonso:
8 Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche.
Wuta kala, basakoli oyo basakolaki liboso ete yo mpe ngai tozala, basakolaki bitumba, pasi mpe bokono oyo ebomaka, mpo na kotelemela bikolo ebele mpe mikili ya makasi;
9 Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”
kasi soki mosakoli asakoli kimia, akondimama ete azali solo mosakoli oyo Yawe atindi masakoli na ye ekokisami. »
10 Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.
Bongo mosakoli Anania alongolaki ekangiseli na kingo ya mosakoli Jeremi mpe abukaki yango.
11 Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa.
Anania alobaki liboso ya bato nyonso: « Tala liloba oyo Yawe alobi: ‹ Liboso ete mibu mibale ekoka, nakobuka ndenge wana ekangiseli ya Nabukodonozori, mokonzi ya Babiloni, na kingo ya bikolo nyonso. › » Mpe mosakoli Jeremi akendeki na ye.
12 Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
Sima na mosakoli Anania kobuka ekangiseli na kingo ya mosakoli Jeremi, Yawe alobaki na Jeremi:
13 “Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe.
« Kende koloba na Anania: ‹ Tala liloba oyo Yawe alobi: Solo, obuki ekangiseli ya banzete; kasi na esika na yango, okolata nde ekangiseli ya ebende.
14 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’”
Pamba te, tala liloba oyo Yawe, Mokonzi ya mampinga, Nzambe ya Isalaele, alobi: Nasili kotia ekangiseli ya ebende na kingo ya bikolo nyonso mpo ete esalela Nabukodonozori, mokonzi ya Babiloni, mpe ekosalela ye solo. Nakopesa ye bokonzi ata likolo ya banyama ya zamba. › »
15 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha.
Bongo mosakoli Jeremi alobaki lisusu na mosakoli Anania: « Anania, yoka! Yawe atindi yo te; mpe ozali kotindika bato oyo na kotia motema na makambo ya lokuta!
16 Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’”
Mpo na yango, tala liloba oyo Yawe alobi: ‹ Nakolongola yo na mokili oyo, okokufa kaka na mobu oyo; pamba te otindiki bato na kotombokela Yawe. › »
17 Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.
Kaka na mobu wana, na sanza ya sambo, mosakoli Anania akufaki.

< Jeremaya 28 >