< Jeremaya 27 >

1 Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ Onyenwe anyị rute Jeremaya ntị.
In the beginning of the reign of Zedekiah, the son of Josiah, king of Judah, came this word to Jeremiah from Jehovah.
2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị.
Thus said Jehovah to me: Make thee bands and yokes, and put them upon thy neck,
3 Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi.
and send them to the king of Edom, and to the king of Moab, and to the king of the children of Ammon, and to the king of Tyre, and to the king of Zidon, by the hands of the messengers that are come to Jerusalem, to Zedekiah, king of Judah.
4 Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,
And command them to say to their masters, Thus saith Jehovah of hosts, the God of Israel: Thus shall ye say to your masters:
5 Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma.
The earth, and the men and the beasts which are upon the earth, have I made by my great power and my outstretched arm, and I give it to whomsoever it seemeth meet to me.
6 Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu.
And now I give all these lands into the hand of Nebuchadnezzar, the king of Babylon, my servant; the beasts of the field also I give him to serve him.
7 Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.
And all nations shall serve him, and his son, and his son's son, until the time of his land, even his, shall come, and then shall many nations and great kings make him their servant.
8 “‘“Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
And the nation and the kingdom that will not serve him, Nebuchadnezzar, the king of Babylon, and put their neck under the yoke of the king of Babylon, —with the sword and with famine and with pestilence will I punish that nation, saith Jehovah, until I have consumed them by his hand.
9 Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’
Therefore hearken ye not to your prophets, and your diviners, and your dreamers, your soothsayers, and your sorcerers, who say to you, Ye shall not serve the king of Babylon.
10 Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi.
For they prophesy a lie to you, to remove you far from your land, and that I should drive you out, and that ye should perish.
11 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”’”
But the nations that bring their neck under the yoke of the king of Babylon, and serve him, those will I let remain still in their own land, saith Jehovah, and they shall till it, and dwell therein.
12 Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.
And to Zedekiah, king of Judah, also, spake I according to all these words, and said: Bring your necks under the yoke of the king of Babylon, and serve him and his people, and live.
13 Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn?
Why will ye die, thou and thy people, by the sword, by famine, and by pestilence, as Jehovah hath spoken concerning the nation that will not serve the king of Babylon?
14 Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.
Therefore hearken not to the prophets, that say to you, Ye shall not serve the king of Babylon; for they prophesy a lie to you.
15 ‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’”
For I have not sent them, saith Jehovah; but they prophesy a lie in my name, that I may drive you out, and that ye may perish, ye and the prophets that prophesy to you.
16 Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.
To the priests, also, and to all the people; spake I, saying, Thus saith Jehovah: Hearken not to the words of your prophets who prophesy to you, and say, Behold the vessels of the house of Jehovah shall be brought back from Babylon now shortly; for they prophesy a lie to you.
17 Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?
Hearken ye not to them; serve the king of Babylon, and live! Why should this city become a desolation?
18 Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn.
But if they be indeed prophets, and if the word of Jehovah be with them, let them now make intercession to Jehovah of hosts, that the vessels which are left in the house of Jehovah, and in the house of the king of Judah, and in Jerusalem, may not go to Babylon.
19 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a,
For thus saith Jehovah of hosts concerning the pillars, and concerning the sea, and concerning the bases, and concerning the residue of the vessels that are let in this city,
20 nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn.
which Nebuchadnezzar, king of Babylon, took not, when he carried away captive Jeconiah, the son of Jehoiakim, king of Judah, from Jerusalem to Babylon, with all the nobles of Judah and Jerusalem;
21 E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.
yea, thus saith Jehovah of hosts, the God of Israel, concerning the vessels that are left in the house of Jehovah, and in the house of the king of Judah and of Jerusalem:
22 ‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’”
They shall be carried to Babylon, and there shall they be until the day when I shall visit them, saith Jehovah. Then will I bring them up, and restore them to this place.

< Jeremaya 27 >