< Jeremaya 25 >

1 Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn.
Ilizwi elafika kuJeremiya mayelana labantu bonke bakoJuda, ngomnyaka wesine kaJehoyakhimi indodana kaJosiya, inkosi yakoJuda (kwakungumnyaka wokuqala kaNebhukadirezari, inkosi yeBhabhiloni),
2 Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
alikhulumayo uJeremiya umprofethi kubo bonke abantu bakoJuda, lakubo bonke abahlali beJerusalema, esithi:
3 Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.
Kusukela emnyakeni wetshumi lantathu kaJosiya, indodana kaAmoni, inkosi yakoJuda, kuze kube lamuhla, sekuyiminyaka engamatshumi amabili lantathu, ilizwi leNkosi lifikile kimi, njalo ngilikhulumile kini, ngivuka ngovivi ngikhuluma; kodwa kalilalelanga.
4 Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
Futhi iNkosi ithumile kini zonke izinceku zayo, abaprofethi, ivuka ngovivi ibathuma; kodwa kalilalelanga, kalibekanga indlebe yenu ukuthi lizwe;
5 Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
besithi: Phendukani khathesi ngulowo lalowo endleleni yakhe embi, lebubini bezenzo zenu, lihlale elizweni iNkosi elinike lina laboyihlo kusukela nininini kuze kube nininini;
6 Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
njalo lingalandeli abanye onkulunkulu ukubasebenzela lokubakhonza, lingangithukuthelisi ngomsebenzi wezandla zenu; khona ngingayikulenzela okubi.
7 “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
Kodwa kalingilalelanga, itsho iNkosi, ukuze lingithukuthelise ngomsebenzi wezandla zenu, kuze kube kubi kini.
8 Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
Ngakho itsho njalo iNkosi yamabandla: Ngenxa yokuthi lingawalalelanga amazwi ami,
9 Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
khangela, ngizathuma, ngilande zonke izinsapho zenyakatho, itsho iNkosi, lakuNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni inceku yami, ngibalethe bamelane lalelilizwe bamelane labakhileyo balo, bamelane lazo zonke lezizizwe inhlangothi zonke, ngibatshabalalise, ngibenze babe yisesabiso, babe ngokuncifelwayo, babe zincithakalo ezilaphakade.
10 Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
Futhi ngizaphelisa ngisuse kubo ilizwi lentokozo lelizwi lenjabulo, ilizwi lomyeni lelizwi likamakoti, umsindo wamatshe okuchola, lokukhanya kwesibane.
11 Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
Lelizwe lonke leli lizakuba lunxiwa libe yisesabiso; lalezizizwe zizasebenzela inkosi yeBhabhiloni iminyaka engamatshumi ayisikhombisa.
12 “Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
Kuzakuthi-ke iminyaka engamatshumi ayisikhombisa isiphelele ngijezise inkosi yeBhabhiloni lalesosizwe, itsho iNkosi, ngobubi babo, lelizwe lamaKhaladiya, ngilenze libe ngamanxiwa laphakade.
13 Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.
Ngehlisele phezu kwalelolizwe wonke amazwi ami engawakhuluma ngimelene lalo, konke okubhaliweyo kulolugwalo, uJeremiya akuprofethayo ngazo zonke izizwe.
14 A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”
Ngoba izizwe ezinengi lamakhosi amakhulu zizabasebenzisa bona uqobo; njalo ngizabaphindisela njengokwenza kwabo lanjengokomsebenzi wezandla zabo.
15 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.
Ngoba itsho njalo iNkosi uNkulunkulu kaIsrayeli kimi: Thatha inkezo yewayini yalolulaka esandleni sami, wenze zonke izizwe engikuthuma kuzo ziyinathe.
16 Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
Njalo zizanatha, zidiyazele, zihlanye, ngenxa yenkemba engizayithuma phakathi kwazo.
17 Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
Ngasengithatha inkezo esandleni seNkosi, nganathisa zonke izizwe iNkosi eyayingithume kizo,
18 Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
iJerusalema, lemizi yakoJuda, lamakhosi ayo, leziphathamandla zayo, ukubenza babe yincithakalo, babe yisesabiso, babe yinto yokuncifelwa, babe yisiqalekiso, njengalamuhla;
19 Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
uFaro inkosi yeGibhithe, lezinceku zakhe, leziphathamandla zakhe, labantu bakhe bonke;
20 na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ; na ndị eze Uz; na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd.
labo bonke abaxubeneyo, lawo wonke amakhosi elizwe leUzi, lawo wonke amakhosi elizwe lamaFilisti, leAshikeloni, leGaza, leEkhironi, lensali yeAshidodi;
21 Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;
iEdoma, loMowabi, labantwana bakoAmoni;
22 na ndị eze Taịa na Saịdọn, na ndị eze obodo ha dị nʼakụkụ osimiri, nke dị nʼofe nke ọzọ;
lawo wonke amakhosi eTire, lawo wonke amakhosi eSidoni, lamakhosi ezihlenge ezingaphetsheya kolwandle;
23 na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya.
iDedani, leTema, leBuzi, labo bonke abaqunywe ezingonsini;
24 Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
lamakhosi wonke eArabhiya, lamakhosi wonke abantu abaxubeneyo abahlala enkangala;
25 na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
lamakhosi wonke eZimri, lamakhosi wonke eElamu, lamakhosi wonke eMede;
26 na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
lawo wonke amakhosi enyakatho, aseduze lakhatshana, omunye lomunye, layo yonke imibuso yomhlaba, esebusweni bomhlaba; lenkosi yeSheshaki izanatha emva kwabo.
27 “Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
Ubususithi kibo: Itsho njalo INkosi yamabandla, uNkulunkulu kaIsrayeli: Nathani lidakwe, lihlanze, liwe, lingasukumi, ngenxa yenkemba engizayithuma phakathi kwenu.
28 Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Kuzakuthi-ke lapho besala ukuthatha inkezo esandleni sakho ukuthi banathe, uthi kibo: Itsho njalo iNkosi yamabandla: Lizanatha isibili.
29 Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
Ngoba khangela, ngiyaqala ukwenza okubi emzini obizwa ngebizo lami, lina-ke belizakuba ngabangelacala isibili yini? Kaliyikuba ngabangelacala; ngoba ngizabizela inkemba phezu kwabo bonke abakhileyo bomhlaba, itsho iNkosi yamabandla.
30 “Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
Wena-ke profetha wonke lamazwi umelene labo, uthi kubo: INkosi izabhonga iphezulu, iphumise ilizwi layo isendaweni yayo engcwele; izabhonga kakhulu phezu kwendawo yayo yokuhlala, imemeze iphendule njengabanyathela izithelo zevini, imelene labo bonke abakhileyo bomhlaba.
31 Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Umsindo uzafika emkhawulweni womhlaba; ngoba iNkosi ilempikisano lezizwe, izakwehlulela yonke inyama; abakhohlakeleyo izabanikela enkembeni, itsho iNkosi.
32 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
Itsho njalo iNkosi yamabandla: Khangela, ububi buzaphuma esizweni busiya esizweni, lesivunguzane esikhulu sizavuswa sisuka ezinhlangothini zomhlaba.
33 Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
Langalolosuku ababuleweyo beNkosi bazasukela komunye umkhawulo womhlaba baze bafike komunye umkhawulo; kabayikulilelwa, kabayikubuthwa, kabayikungcwatshwa; bazakuba ngumquba phezu kobuso bomhlaba.
34 Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.
Qhinqani isililo, belusi, likhale, lizibhuqe emlotheni, zikhulu zomhlambi; ngoba izinsuku zokuhlatshwa lezokuhlakazeka kwenu zigcwalisekile, njalo lizakuwa njengesitsha esiloyisekayo.
35 Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.
Lokubaleka kuzaphela kubelusi, lokuphunyuka kuzikhulu zomhlambi.
36 Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.
Kuzakuba lelizwi lokukhala kwabelusi lokuqhinqa isililo kwezikhulu zomhlambi; ngoba iNkosi izachitha idlelo labo.
37 Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị.
Lezibaya ezilokuthula zizachithwa ngenxa yokuvutha kolaka lweNkosi.
38 Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.
Itshiyile ubhalu lwayo njengesilwane esitsha, ngoba ilizwe labo seliyincithakalo ngenxa yokuvutha komcindezeli, langenxa yokuvutha kolaka lwayo.

< Jeremaya 25 >