< Jeremaya 25 >

1 Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn.
The word that came to Jeremiah concerning all the people of Judah, in the fourth year of Jehoiakim the son of Josiah, king of Judah (this was the first year of Nebuchadnezzar king of Babylon),
2 Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
which Jeremiah the prophet spoke to all the people of Judah, and to all the inhabitants of Jerusalem:
3 Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.
From the thirteenth year of Josiah the son of Amon, king of Judah, even to this day, these twenty-three years, the LORD’s word has come to me, and I have spoken to you, rising up early and speaking; but you have not listened.
4 Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
The LORD has sent to you all his servants the prophets, rising up early and sending them (but you have not listened or inclined your ear to hear),
5 Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
saying, “Return now everyone from his evil way, and from the evil of your doings, and dwell in the land that the LORD has given to you and to your fathers, from of old and even forever more.
6 Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
Don’t go after other gods to serve them or worship them, and don’t provoke me to anger with the work of your hands; then I will do you no harm.”
7 “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
“Yet you have not listened to me,” says the LORD, “that you may provoke me to anger with the work of your hands to your own hurt.”
8 Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
Therefore the LORD of Hosts says: “Because you have not heard my words,
9 Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
behold, I will send and take all the families of the north,” says the LORD, “and I will send to Nebuchadnezzar the king of Babylon, my servant, and will bring them against this land, and against its inhabitants, and against all these nations around. I will utterly destroy them, and make them an astonishment, and a hissing, and perpetual desolations.
10 Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
Moreover I will take from them the voice of mirth and the voice of gladness, the voice of the bridegroom and the voice of the bride, the sound of the millstones, and the light of the lamp.
11 Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
This whole land will be a desolation, and an astonishment; and these nations will serve the king of Babylon seventy years.
12 “Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
“It will happen, when seventy years are accomplished, that I will punish the king of Babylon and that nation,” says the LORD, “for their iniquity. I will make the land of the Kasdim desolate forever.
13 Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.
I will bring on that land all my words which I have pronounced against it, even all that is written in this book, which Jeremiah has prophesied against all the nations.
14 A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”
For many nations and great kings will make bondservants of them, even of them. I will recompense them according to their deeds, and according to the work of their hands.”
15 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.
For the LORD, the God of Israel, says to me: “Take this cup of the wine of wrath from my hand, and cause all the nations to whom I send you to drink it.
16 Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
They will drink, and reel back and forth, and be insane, because of the sword that I will send amongst them.”
17 Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
Then I took the cup at the LORD’s hand, and made all the nations to drink, to whom the LORD had sent me:
18 Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
Jerusalem, and the cities of Judah, with its kings and its princes, to make them a desolation, an astonishment, a hissing, and a curse, as it is today;
19 Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
Pharaoh king of Egypt, with his servants, his princes, and all his people;
20 na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ; na ndị eze Uz; na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd.
and all the mixed people, and all the kings of the land of Uz, all the kings of the Philistines, Ashkelon, Gaza, Ekron, and the remnant of Ashdod;
21 Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;
Edom, Moab, and the children of Ammon;
22 na ndị eze Taịa na Saịdọn, na ndị eze obodo ha dị nʼakụkụ osimiri, nke dị nʼofe nke ọzọ;
and all the kings of Tyre, all the kings of Sidon, and the kings of the isle which is beyond the sea;
23 na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya.
Dedan, Tema, Buz, and all who have the corners of their beard cut off;
24 Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
and all the kings of Arabia, all the kings of the mixed people who dwell in the wilderness;
25 na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
and all the kings of Zimri, all the kings of Elam, and all the kings of the Medes;
26 na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
and all the kings of the north, far and near, one with another; and all the kingdoms of the world, which are on the surface of the earth. The king of Sheshach will drink after them.
27 “Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
“You shall tell them, ‘The LORD of Hosts, the God of Israel says: “Drink, and be drunk, vomit, fall, and rise no more, because of the sword which I will send amongst you.”’
28 Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
It shall be, if they refuse to take the cup at your hand to drink, then you shall tell them, ‘The LORD of Hosts says: “You shall surely drink.
29 Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
For, behold, I begin to work evil at the city which is called by my name; and should you be utterly unpunished? You will not be unpunished; for I will call for a sword on all the inhabitants of the earth, says the LORD of Hosts.”’
30 “Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
“Therefore prophesy against them all these words, and tell them, “‘The LORD will roar from on high, and utter his voice from his holy habitation. He will mightily roar against his fold. He will give a shout, as those who tread grapes, against all the inhabitants of the earth.
31 Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
A noise will come even to the end of the earth; for the LORD has a controversy with the nations. He will enter into judgement with all flesh. As for the wicked, he will give them to the sword,”’ says the LORD.”
32 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
The LORD of Hosts says, “Behold, evil will go out from nation to nation, and a great storm will be raised up from the uttermost parts of the earth.”
33 Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
The slain of the LORD will be at that day from one end of the earth even to the other end of the earth. They won’t be lamented. They won’t be gathered or buried. They will be dung on the surface of the ground.
34 Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.
Wail, you shepherds, and cry. Wallow in dust, you leader of the flock; for the days of your slaughter and of your dispersions have fully come, and you will fall like fine pottery.
35 Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.
The shepherds will have no way to flee. The leader of the flock will have no escape.
36 Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.
A voice of the cry of the shepherds, and the wailing of the leader of the flock, for the LORD destroys their pasture.
37 Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị.
The peaceful folds are brought to silence because of the fierce anger of the LORD.
38 Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.
He has left his covert, as the lion; for their land has become an astonishment because of the fierceness of the oppression, and because of his fierce anger.

< Jeremaya 25 >