< Jeremaya 24 >

1 Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.
Sima na Nabukodonozori, mokonzi ya Babiloni, komema na bowumbu, longwa na Yelusalemi kino na Babiloni: Yekonia, mwana mobali ya Yeoyakimi, mokonzi ya Yuda, bakalaka ya Yuda, bato ya misala ya maboko mpe bato oyo balambaka bibende na moto; Yawe alakisaki ngai bitunga mibale ya bambuma ya figi oyo batiaki liboso ya Tempelo ya Yawe.
2 Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.
Kitunga moko ezalaki na bambuma kitoko ya figi lokola bambuma oyo etelaka liboso; mpe kitunga mosusu ezalaki na bambuma ekawuka oyo bakoki kolia te.
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”
Yawe atunaki ngai: — Jeremi, ozali komona nini? Nazongisaki: — Nazali komona bambuma ya figi: bambuma oyo ya kitoko ezali elengi, kasi oyo ekawuka ezali mabe mpe moto moko te akoki kolia yango.
4 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Bongo Yawe alobaki na ngai:
5 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.
— Tala liloba oyo Yawe, Nzambe ya Isalaele, alobi: « Ndenge bambuma kitoko oyo ya figi ezali, ndenge wana mpe nazali komona bato ya Yuda oyo natindaki na bowumbu, longwa na esika oyo kino na Babiloni.
6 Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.
Miso na Ngai ekozala likolo na bango mpo na kosalela bango bolamu, mpe nakozongisa bango kati na mokili oyo. Nakobongisa bango lisusu, kasi nakobebisa bango lisusu te; nakolona bango lokola nzete, nakopikola bango lisusu te.
7 Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.
Nakopesa bango motema oyo ekoyeba Ngai, mpo ete basosola ete nazali Yawe. Bakozala bato na Ngai, mpe Ngai nakozala Nzambe na bango, pamba te bakozongela Ngai na motema na bango mobimba.
8 “‘Ma dịka fiig ọjọọ ndị a, bụ ndị dị njọ nke ukwuu na-enweghị ike iri ha eri,’ Onyenwe anyị sịrị, ‘otu a ka m gaa emeso Zedekaya, eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ahụ niile fọdụrụ ndụ na Jerusalem, ma ha bi nʼime ya, maọbụ biri nʼIjipt.
Kasi ndenge bambuma ya figi oyo ekawuka ezali mabe mpe bakoki kolia yango te, » elobi Yawe, « ndenge wana mpe nakosala Sedesiasi, mokonzi ya Yuda, bakalaka na ye mpe batikali ya Yelusalemi, ezala ba-oyo batikali na mboka mpe ba-oyo bazali na Ejipito:
9 Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.
nakokomisa bango eloko ya koyoka somo mpe ya koyokela pasi, na miso ya bikolo nyonso ya mabele; eloko ya kotiola, eloko ya kosakanela, eloko ya maseki, eloko ya lisuma, kati na bisika nyonso epai wapi nakobengana bango.
10 Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’”
Nakotindela bango mopanga, nzala makasi mpe bokono oyo ebomaka, kino tango ekosilisa koboma bango na mokili oyo napesaki bango elongo na batata na bango. »

< Jeremaya 24 >