< Jeremaya 23 >

1 “Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Woe to the shepherds who destroy and scatter the sheep of my pasture!” says the LORD.
2 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Therefore the LORD, the God of Israel, says against the shepherds who feed my people: “You have scattered my flock, driven them away, and have not visited them. Behold, I will visit on you the evil of your doings,” says the LORD.
3 “Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
“I will gather the remnant of my flock out of all the countries where I have driven them, and will bring them again to their folds; and they will be fruitful and multiply.
4 Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
I will set up shepherds over them who will feed them. They will no longer be afraid or dismayed, neither will any be lacking,” says the LORD.
5 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
“Behold, the days come,” says the LORD, “that I will raise to David a righteous Branch; and he will reign as king and deal wisely, and will execute justice and righteousness in the land.
6 Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.
In his days Judah will be saved, and Israel will dwell safely. This is his name by which he will be called: The LORD our righteousness.
7 “Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’
“Therefore, behold, the days come,” says the LORD, “that they will no more say, ‘As the LORD lives, who brought up the children of Israel out of the land of Egypt;’
8 ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
but, ‘As the LORD lives, who brought up and who led the offspring of the house of Israel out of the north country, and from all the countries where I had driven them.’ Then they will dwell in their own land.”
9 Ma banyere ndị amụma, obi m na-agbawa nʼime m, ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha. Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu, dịka onye ṅụbigara mmanya oke, nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị, na site nʼokwu nsọ ya.
Concerning the prophets: My heart within me is broken. All my bones shake. I am like a drunken man, and like a man whom wine has overcome, because of the LORD, and because of his holy words.
10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.
“For the land is full of adulterers; for because of the curse the land mourns. The pastures of the wilderness have dried up. Their course is evil, and their might is not right;
11 “Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
for both prophet and priest are profane. Yes, in my house I have found their wickedness,” says the LORD.
12 “Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Therefore their way will be to them as slippery places in the darkness. They will be driven on, and fall therein; for I will bring evil on them, even the year of their visitation,” says the LORD.
13 “Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.
“I have seen folly in the prophets of Samaria. They prophesied by Baal, and caused my people Israel to err.
14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”
In the prophets of Jerusalem I have also seen a horrible thing: they commit adultery and walk in lies. They strengthen the hands of evildoers, so that no one returns from his wickedness. They have all become to me as Sodom, and its inhabitants as Gomorrah.”
15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”
Therefore the LORD of Hosts says concerning the prophets: “Behold, I will feed them with wormwood, and make them drink poisoned water; for from the prophets of Jerusalem ungodliness has gone out into all the land.”
16 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha
The LORD of Hosts says, “Don’t listen to the words of the prophets who prophesy to you. They teach you vanity. They speak a vision of their own heart, and not out of the mouth of the LORD.
17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’
They say continually to those who despise me, ‘The LORD has said, “You will have peace;”’ and to everyone who walks in the stubbornness of his own heart they say, ‘No evil will come on you.’
18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso, hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu? Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?
For who has stood in the council of the LORD, that he should perceive and hear his word? Who has listened to my word, and heard it?
19 Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, nke ga-abịa bufuo ndị ajọ omume a.
Behold, the LORD’s storm, his wrath, has gone out. Yes, a whirling storm! It will burst on the head of the wicked.
20 Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya tutu ruo mgbe o mezuru ihe niile dị ya nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu, unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.
The LORD’s anger will not return until he has executed and performed the intents of his heart. In the latter days, you will understand it perfectly.
21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a, ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu. O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu, ma ha nọkwa na-ebu amụma.
I didn’t send these prophets, yet they ran. I didn’t speak to them, yet they prophesied.
22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
But if they had stood in my council, then they would have caused my people to hear my words, and would have turned them from their evil way, and from the evil of their doings.
23 “Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso, ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Am I a God at hand,” says the LORD, “and not a God afar off?
24 “O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Can anyone hide himself in secret places so that I can’t see him?” says the LORD. “Don’t I fill heaven and earth?” says the LORD.
25 “Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
“I have heard what the prophets have said, who prophesy lies in my name, saying, ‘I had a dream! I had a dream!’
26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
How long will this be in the heart of the prophets who prophesy lies, even the prophets of the deceit of their own heart?
27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.
They intend to cause my people to forget my name by their dreams which they each tell his neighbor, as their fathers forgot my name because of Baal.
28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
The prophet who has a dream, let him tell a dream; and he who has my word, let him speak my word faithfully. What is the straw to the wheat?” says the LORD.
29 “Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
“Isn’t my word like fire?” says the LORD; “and like a hammer that breaks the rock in pieces?
30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.
“Therefore behold, I am against the prophets,” says the LORD, “who each steal my words from his neighbor.
31 E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
Behold, I am against the prophets,” says the LORD, “who use their tongues, and say, ‘He says.’
32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Behold, I am against those who prophesy lying dreams,” says the LORD, “who tell them, and cause my people to err by their lies, and by their vain boasting; yet I didn’t send them or command them. They don’t profit this people at all,” says the LORD.
33 “Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’
“When this people, or the prophet, or a priest, asks you, saying, ‘What is the message from the LORD?’ Then you shall tell them, ‘“What message? I will cast you off,” says the LORD.’
34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.
As for the prophet, the priest, and the people, who say, ‘The message from the LORD,’ I will even punish that man and his household.
35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’
You will say everyone to his neighbor, and everyone to his brother, ‘What has the LORD answered?’ and, ‘What has the LORD said?’
36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.
You will mention the message from the LORD no more, for every man’s own word has become his message; for you have perverted the words of the living God, of the LORD of Hosts, our God.
37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’
You will say to the prophet, ‘What has the LORD answered you?’ and, ‘What has the LORD spoken?’
38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’
Although you say, ‘The message from the LORD,’ therefore the LORD says: ‘Because you say this word, “The message from the LORD,” and I have sent to you, telling you not to say, “The message from the LORD,”
39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.
therefore behold, I will utterly forget you, and I will cast you off with the city that I gave to you and to your fathers, away from my presence.
40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”
I will bring an everlasting reproach on you, and a perpetual shame, which will not be forgotten.’”

< Jeremaya 23 >