< Jeremaya 22 >

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.
Yehova anandiwuza kuti, “Pita ku nyumba ya mfumu ya ku Yuda ndipo ukayiwuze kuti,
2 ‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa.
‘Imva mawu a Yehova, iwe mfumu ya ku Yuda, amene umakhala pa mpando waufumu wa Davide; iwe, nduna zako pamodzi ndi anthu ako amene amalowera pa zipata izi.
3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.
Yehova akuti, uziweruza molungama ndi mosakondera. Uzipulumutsa munthu amene walandidwa katundu mʼdzanja la womuzunza. Usazunze kapena kupondereza mlendo, ana amasiye kapena akazi amasiye. Usaphe munthu wosalakwa pa malo pano.
4 Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.
Pakuti ngati udzamvera malamulo awa, ndiye kuti mafumu onse okhala pa mpando waufumu wa Davide azidzalowabe pa zipata za nyumba yaufumu ino, atakwera magaleta ndi akavalo, iwowo pamodzi ndi nduna zawo ndi anthu awo.
5 Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’”
Koma ngati sumvera malamulo awa, akutero Yehova, ndikulumbira pali Ine ndemwe kuti nyumba ino yaufumu idzasanduka bwinja.’”
6 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
Pakuti zimene Yehova akunena za nyumba yaufumu ya mfumu ya ku Yuda ndi izi: “Ngakhale iwe uli ngati Giliyadi kwa Ine, ngati msonga ya phiri la Lebanoni, komabe ndidzakusandutsa chipululu, ngati mizinda yopanda anthu.
7 Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.
Ndidzatuma anthu oti adzakuwononge, munthu aliyense ali ndi zida zake, ndipo adzadula mikungudza yako yokongola nadzayiponya pa moto.
8 “Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’
“Pamene anthu a mitundu ina adzadutsa pa mzinda umenewu adzafunsana kuti, ‘Chifukwa chiyani Yehova wachita chinthu chotere pa mzinda waukuluwu?’
9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’”
Ndipo yankho lake lidzakhala lakuti, ‘Chifukwa anasiya pangano limene anapangana ndi Yehova Mulungu wawo ndipo anapembedza ndi kutumikira milungu ina.’”
10 Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.
Musayilire mfumu Yosiya, musamuyimbire nyimbo womwalirayo; mʼmalo mwake, mulire kwambiri chifukwa cha Yehowahazi amene wapita ku ukapolo, chifukwa sadzabwereranso kapena kuonanso dziko lake lobadwira.
11 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.
Pakuti zimene Yehova akunena za Yehowahazi mwana wa Yosiya, amene anatenga mpando waufumu wa Yuda mʼmalo mwa abambo ake koma nʼkuwusiya ndi izi: “Iye sadzabwereranso.
12 Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”
Iyeyo adzafera ku ukapoloko. Sadzalionanso dziko lino.”
13 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.
“Tsoka kwa munthu womanga nyumba yake mopanda chilungamo, womanga zipinda zake zosanja monyenga, pogwiritsa ntchito abale ake mwathangata, osawapatsa malipiro a ntchito yawo.
14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
Munthuyo amati, ‘Ndidzadzimangira nyumba yayikulu ya zipinda zikuluzikulu zamʼmwamba.’ Kotero ndidzapanga mazenera akuluakulu, ndi kukhomamo matabwa a mkungudza ndi kukongoletsa ndi makaka ofiira.
15 “Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
“Kodi kukhala ndi nyumba ya mkungudza wambiri zingachititse iwe kukhala mfumu? Ganiza za abambo ako. Suja anali ndi zonse zakudya ndi zakumwa. Abambo ako ankaweruza molungama ndi mosakondera, ndipo zonse zinkawayendera bwino.
16 O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka Onyenwe anyị kwupụtara
Iye ankateteza anthu osauka ndi osowa, ndipo zonse zinkamuyendera bwino. Kodi zimenezi sindiye tanthauzo la kudziwa Ine?” akutero Yehova.
17 Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
“Koma maso ako ndi mtima sizili penanso, koma zili pa phindu lachinyengo, pa zopha anthu osalakwa ndi pa kuzunza ndi pakulamulira mwankhanza.”
18 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
Nʼchifukwa chake Yehova ponena za Yehoyakimu mwana wa Yosiya mfumu ya ku Yuda akuti, “Anthu sadzamulira maliro kapena kunena kuti, ‘Kalanga ine, mʼbale wanga! Kalanga ine mlongo wanga! Anthu ake sadzamulira maliro kuti, Kalanga ine, mbuye wathu! Taonani ulemerero wake wapita!’
19 A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”
Adzayikidwa ngati bulu, kuchita kumuguguza ndi kukamutaya kunja kwa zipata za Yerusalemu.”
20 “Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
“Tsono inu anthu a ku Yerusalemu, pitani ku mapiri a Lebanoni kuti mukalire mofuwula kumeneko, mawu anu akamveke mpaka ku Basani. Mulire mofuwula muli ku Abarimu chifukwa abwenzi ako onse awonongeka.
21 Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.
Ndinakuchenjezani pamene munali pa mtendere. Koma inu munati, ‘Sindidzamvera.’ Umu ndi mmene mwakhala mukuchitira kuyambira mukali aangʼono. Simunandimvere Ine.
22 Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ. Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala nʼihi ajọ omume gị niile.
Mphepo idzakuchotserani abusa anu onse, ndipo abwenzi anu adzatengedwa ku ukapolo. Pamenepo mudzachita manyazi ndi kunyozedwa chifukwa cha zoyipa zanu zonse.
23 Gị onye na-ebi na Lebanọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
Inu amene mumakhala mʼnyumba ya ku Lebanoni, amene munamanga nyumba zanu pakati pa mikungudza, mudzabuwula kwambiri pamene zowawa zidzakugwerani, zonga za mkazi pa nthawi yake yochira!
24 “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,
“Pali Ine wamoyo, akutero Yehova, ngakhale iwe, Yehoyakini mwana wa Yehoyakimu mfumu ya ku Yuda, ukanakhala ngati mphete ya ku dzanja langa lamanja, ndikanakuvula nʼkukutaya.
25 were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.
Ndidzakupereka kwa amene akufuna kukupha, amene iwe umawaopa. Ndidzakupereka kwa Nebukadinezara, mfumu ya ku Babuloni ndi anthu ake.
26 Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.
Iwe pamodzi ndi amayi ako amene anakubereka ndidzakupititsani ku dziko lachilendo. Ngakhale inu simunabadwire kumeneko, komabe mudzafera komweko.
27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”
Simudzabwereranso ku dziko limene mudzafuna kubwerera.”
28 Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?
Kodi Yehoyakini wakhala ngati mbiya yonyozeka, yosweka imene anthu sakuyifunanso? Kodi nʼchifukwa chake iye pamodzi ndi ana ake, achotsedwa nʼkutayidwa ku dziko limene iwo sakulidziwa?
29 Ala, ala, ala, nụrụ okwu Onyenwe anyị.
Iwe dziko, dziko, dziko, Imva mawu a Yehova!
30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”
Yehova akuti, “Munthu ameneyu mumutenge ngati wopanda ana, munthu amene sadzakhala wochita bwino pamoyo wake wonse, pakuti palibe ndi mmodzi yemwe mwa zidzukulu zake zomwe zidzachita bwino. Palibe amene adzathe kukhala pa mpando waufumu wa Davide ndi kulamulira Yuda.”

< Jeremaya 22 >