< Jeremaya 21 >
1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia,
Ko te kupu i puta mai ki a Heremaia, he mea na Ihowa, i te ngarenga a Kingi Terekia i a Pahuru tama a Merekia, i a Tepania hoki, tama a Maaheia tohunga, ki a ia, hei ki,
2 sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.”
Rapua koa tetahi tikanga i a Ihowa mo tatou; kei te whawhai nei hoki a Nepukareha kingi o Papurona ki a tatou: tera pea ta Ihowa mahi ki a tatou e rite ki ana mea whakamiharo katoa, a ka haere atu ia i to tatou wahi.
3 Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,
Katahi a Heremaia ka mea atu ki a ratou, Ko ta koutou tenei e korero ai ki a Terekia:
4 ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.
Ko te kupu tenei a Ihowa, a te Atua o Iharaira, Nana, ka whakahokia atu e ahau nga patu mo te whawhai i o koutou ringa, mo ta koutou whawhai ki te kingi o Papurona, ki nga Karari, e whakapae nei i a koutou i waho o te taiepa, ka huihuia hoki rato u e ahau ki waenganui o tenei pa.
5 Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu.
A ko ahau nei ano hei whawhai ki a koutou ki te ringa maro, ki te takakau kaha, i runga i te riri, i te weriweri, i te aritarita nui.
6 Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.
A ka patua e ahau nga tangata o tenei pa, te tangata, te kararehe: ka mate ratou i te mate uruta nui.
7 Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’
Na, muri iho, e ai ta Ihowa, ka hoatu e ahau a Terekia kingi o Hura ratou ko ana tangata, ko te iwi, ara ko te hunga o tenei pa e toe i te mate uruta, i te hoari, i te hemokai, ki te ringa o Nepukareha kingi o Papurona, ki te ringa o o ratou hoa whawhai, ki te ringa hoki o te hunga e whai ana kia whakamatea ratou: a ka patua ratou e ia ki te mata o te hoari; e kore ratou e tohungia e ia, e kore e manawapatia, e kore e arohaina.
8 “Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ.
Korero atu ano hoki koe ki tenei iwi, Ko te kupu tenei a Ihowa, Nana, kua takoto i ahau ki to koutou aroaro te ara ki te ora, me te ara ki te mate.
9 Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.
Ko te tangata ka noho i tenei pa, ka mate i te hoari, i te hemokai, i te mate uruta; ko te tangata ia e haere atu ana, a ka taka atu ki nga Karari e whakapae nei i a koutou, ka ora ia, a ko tona oranga hei taonga parakete ki a ia.
10 Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’
No te mea kua whakamau atu toku mata ki tenei pa hei kino, kahore hoki hei pai, e ai ta Ihowa: ka hoatu ki te ringa o te kingi o Papurona, a ka tahuna e ia ki te ahi.
11 “Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.
Na, ko te mea mo te whare o te kingi o Hura, whakarongo koutou ki te kupu a Ihowa;
12 Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.
E te whare o Rawiri, ko te kupu tenei a Ihowa, Whakaritea te whakawa i te ata, whakaorangia ake hoki te tangata e pahuatia ana i roto i te ringa o te kaitukino, kei puta toku riri ano he ahi, a ka ka, te taea te tinei, mo te kino hoki o a koutou mahi.
13 Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem, gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a, onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha? Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”
Nana, hei hoariri ahau mou, e te wahine e noho na i te raorao, i te kamaka hoki o te wahi papatairite, e ai ta Ihowa; koutou nana na te kupu, Ko wai e haere mai ki a tatou? ko wai ranei e tomo ki o tatou nohoanga?
14 Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile, nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’”
A ka rite ki nga hua o a koutou mahi taku whiu i a koutou, e ai ta Ihowa: a ka ngiha i ahau he ahi i tona ngahere, e pau ai nga mea katoa a taka noa, taka noa i a ia.