< Jeremaya 20 >
1 Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu,
Ka jadolo Pashur wuod Imer, jatelo maduongʼ manie hekalu mar Jehova Nyasaye, nowinjo Jeremia kakoro gigie,
2 o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
nomiyo Jeremia janabi ogo mi otweye e lodi mar Dhorangach Mamalo mar Benjamin mantiere e hekalu mar Jehova Nyasaye.
3 Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “Onyenwe anyị akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu.
Kinyne, ka Pashur nogonye e lodi, Jeremia nowachone niya, “Jehova Nyasaye ok luongi ni Pashur, to oluongi ni Magor-Misabib.
4 Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.
Nimar ma e gima Jehova Nyasaye wacho: ‘Anami ibed masira ni in iwuon kaachiel gi osiepeni duto; gi wengeni iwuon ininegi ka inegogi gi ligangla mar wasikgi. Anachiw jo-Juda duto ni ruodh Babulon, manotergi e piny Babulon kata negogi gi ligangla.
5 Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn.
Anami wasikgi mwandu duto mar dala maduongʼni gige duto moloso, gige duto ma nengogi tek kod mwandu duto mokan mag ruodhi Juda. Ginikawgi kaka gima opee mi notingʼ-gi ka iterogi Babulon.
6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’”
To in, Pashur, kod jogo duto modak e odi noteru e twech Babulon. Kanyo unuthoe kendo noyiku, in kod osiepeni duto mane isekoronegi miriambo.’”
7 Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị.
Yaye Jehova Nyasaye, ne iwuonda kendo nowuonda; ne ihewa kendo iloya giteko. Itugo koda odiechiengʼ mangima; kendo ji duto nyiera.
8 Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.
Sa moro amora ma awuoyo, aywak ka goyo milome mar lweny kod kethruok. Omiyo wach Jehova Nyasaye osekelona ayany kod wichkuot odiechiengʼ mangima.
9 Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
To ka awacho. “Ok analuonge kata wuoyo kendo e nyinge,” wachne chalo mach e chunya, mana ka mach marewo chokega. Aol gi tingʼe e chunya; adier, ok anyal.
10 Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”
Awinjo ji mangʼeny kakwodho wach, “Bwok nitie koni gi koni! Wadonjneuru! Wadonjneuru!” Osiepena duto rito mondo dhoga okier, kagiwacho, “Sa moro inyalo wuonde; eka bangʼe wanapodh kuome kendo wanachul kuor kuome.”
11 Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha; nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m. Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu; a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.
To Jehova Nyasaye ni koda kaka jalweny maratego; omiyo jogo masanda nochwanyre kendo ok giniloya. Ok ginilo kendo ginibedi gi wichkuot malich; wichkuot margi wich ok nowil godo.
12 Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.
Yaye Jehova Nyasaye Maratego, in ngʼatno manono joma ratiro, kendo manyo matut mar chuny kod paro, mad iol gero mari kuomgi, nimar ne in asetieko kora.
13 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ! Nyenụ Onyenwe anyị otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume.
Werne Jehova Nyasaye! Pak Jehova Nyasaye! Oreso ngima joma nigidwaro, e lwet joma timbegi mono.
14 Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
Okwongʼ chiengʼ mane onywola! Mad odiechiengʼ mane minwa onywola kik gwedhi!
15 Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”
Okwongʼ ngʼatno mane okelone wuonwa wach, manomiye obedo gi mor, kowacho, “Nyathi monywolni en wuowi!”
16 Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie.
Mad ngʼatno chal gi mier mane Jehova Nyasaye owito oko maonge ngʼwono. Mad owinj dengo gokinyi kod ywak mar kedo e dier odiechiengʼ tir.
17 Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m, hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m, ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.
Nimar ne ok onega e ich, ka ii minwa bedo kaka bur miika, noyawre nyaka chiengʼ.
18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
Angʼo momiyo ne awuok e ich mondo ane thagruok kod lit, kendo atiek odiechiengega e wichkuot?