< Jeremaya 18 >

1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
Neno la Bwana lilimjia Yeremia, kusema,
2 “Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.”
“Simama, uende kwa nyumba ya mfinyanzi; kwa maana nitakusikilizisha neno langu huko.
3 Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe.
Basi, nikaenda nyumbani kwa mfinyanzi, na tazama! Mfinyanzi alikuwa akifanya kazi kwenye gurudumu la mfinyanzi.
4 Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.
Lakini chombo cha udongo ambacho alikuwa akikifinyanga kiliharibika mkononi mwake, kwa hiyo alibadili mawazo yake na akafanya kitu kingine ambacho kilionekana kuwa kizuri machoni pake.
5 Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,
Ndipo neno la Bwana likanijia, kusema,
6 Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel.
“Je, siwezi kuwa kama huyu mfinyanzi kwenu, nyumba ya Israeli? Angalia! Kama udongo katika mkono wa mfinyanzi-ndivyo ulivyo mkononi mwangu, nyumba ya Israeli.
7 Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla,
Kwa wakati mmoja, ninaweza kutangaza jambo fulani juu ya taifa au ufalme, kwamba nitaufukuza, kuuvunja, au kuuharibu.
8 ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube.
Lakini kama taifa ambalo nimefanya tamko hilo linageuka na kuacha maovu yake, basi nitaghairi nisitende maafa niliyokuwa nimepanga.
9 Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya,
Wakati mwingine, ninaweza kutangaza jambo fulani kuhusu taifa au ufalme, kwamba nitaujenga au kuupanda.
10 ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya.
Lakini ikiwa watafanya mabaya machoni pangu kwa kutosikiliza sauti yangu, basi nitaghairi mema ambayo nilikuwa nimewaambia nitawafanyia.
11 “Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’
Basi sasa, waambie watu wa Yuda na wenyeji wa Yerusalemu, ukisema, 'Bwana asema hivi: Tazameni, nitawaangamiza. Mimi ni karibu kufinyanga mabaya dhidi yenu. Tubuni, kila mtu kutoka njia yake mbaya, hivyo njia zako na matendo yako yatakuletea mema.'
12 Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’”
Lakini watasema, 'Hili halina maana. Tutafanya kulingana na mipango yetu wenyewe. Kila mmoja wetu atafanya mabaya kwa kuufuata uchupavu wa moyo wake.'
13 Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya.
Kwa hiyo Bwana asema hivi, 'Uliza watu wa mataifa, ambao wamewahi kusikia habari kama hii? Bikira wa Israeli amefanya kitendo cha kutisha.
14 O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
Je, theluji ya Lebanoni imetoka milima yenye miamba juu ya pande zake? Je, mito ya mlima inayotoka mbali iliharibiwa, mito hiyo ya baridi?
15 Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.
Hata hivyo watu wangu wamesahau. Wamefanya sadaka kwa sanamu zisizo na maana na wamefanya mashaka katika njia zao; wameacha njia za kale za kutembea katika njia ndogo.
16 Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
Nchi yao itakuwa ya hofu, kitu cha kuzomewa milele. Kila mtu atakayepita karibu naye atashuhudia na kutingisha kichwa chake.
17 Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”
Nitawaangamiza mbele ya adui zao kama upepo wa mashariki. Nitawageuzia kisogo, wala sio uso wangu, siku ya msiba wao.'”
18 Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”
Basi watu wakasema, “Njoni, tufanye njama dhidi ya Yeremia, maana sheria haitapotea kabisa kwa makuhani, wala ushauri kutoka kwa wenye hekima, au maneno ya manabii. Njoo, mshambulie kwa maneno yetu na tusisikilize tena chochote anachosema.”
19 Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.
Sikiliza, Ee Bwana! Na kusikiliza sauti ya adui yangu.
20 O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.
Je, maafa kutoka kwao itakuwa malipo yangu kwa kuwa mema kwao? Kwa maana wamenichimbia shimo. Kumbuka jinsi nilivyosimama mbele yako ili niseme mema kwa ajili yao na kugeuza ghadhabu yako isiwapate.
21 Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.
Basi uwape watoto wao njaa, na uwatie mikononi mwa wale wanaotumia upanga. Basi, waache wanawake wao wafiwe na kuwa wajane, na watu wao watauawa, na vijana wao wauawe kwa upanga wa vita.
22 Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.
Kelele ya kusikitisha isikiwe kutoka katika nyumba zao, kama utakapoleta washambuliaji ghafla juu yao. Kwa kuwa wamechimba shimo kunikamata na wameficha mitego katika miguu yangu.
23 Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.
Lakini wewe, Bwana, unajua mipango yao yote dhidi yangu ya kuniua. Usisamehe uovu na dhambi zao. Usiondoe dhambi zao mbali nawe. Badala yake, waache waangamizwe mbele yako. Tenda juu yao wakati wa ghadhabu yako.

< Jeremaya 18 >