< Jeremaya 17 >
1 “E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.
Kua oti te hara o Hura te tuhituhi ki te pene rino, ki te mata hoki o te taimana: he mea whaowhao rawa ki te papa o to ratou ngakau, ki runga hoki ki nga haona o a koutou aata;
2 Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile.
I a ratou tamariki e mahara ana ki a ratou aata, ki a ratou Aherimi hoki i te taha o nga rakau kouru nui i runga i nga pukepuke tiketike.
3 Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
E toku maunga i te parae, ka hoatu e ahau ou rawa, ou taonga katoa kia pahuatia, me ou wahi tiketike, he mea mo te hara, puta noa i ou rohe katoa.
4 Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
A ko koe, nau ake ano, ka mutu ki tou kainga tupu i hoatu na e ahau ki a koe; a ka meinga koe e ahau kia mahi ki ou hoariri ki te whenua kihai i mohiotia e koe: no te mea kua tahuna e koutou he ahi i ahau e riri ana, ko tona ka mo ake tonu atu.
5 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Ko te kupu tenei a Ihowa: Ka kanga te tangata e whakawhirinaki ana ki te tangata, e mea ana hoki i te kikokiko hei ringa mona, e kotiti ke ana hoki tona ngakau i a Ihowa.
6 Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.
Ka rite hoki ia ki te manoao i te koraha, e kore hoki e kite i te putanga mai o te pai; engari ko nga wahi waikore o te koraha hei kainga mona, he whenua tote, e kore nei e nohoia.
7 “Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
Ka manaakitia te tangata e whakawhirinaki ana ki a Ihowa, ko Ihowa tana e tumanako ai.
8 Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”
Ka rite hoki ia ki te rakau i whakatokia ki te taha o nga wai, e toro nei ona pakiaka ki te awa, a kahore e wehi i te tikakatanga mai o te ra, engari ka matomato tonu tona rau; e kore e manukanuka i te tau raki, e kore ano hoki e mutu tona whai h ua.
9 Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?
Ko te ngakau, he mea tinihanga atu i nga mea katoa, a he tino mate rawa: e mohiotia ranei e wai?
10 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”
Ko taku, ko ta Ihowa, he rapu i te ngakau, he whakamatautau i nga whatumanawa, kia hoatu ai ki tenei, ki tenei kia rite ki tona ara ake, kia rite hoki ki nga hua o ana mahi.
11 Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.
Ka rite ki te patiri, e whakawhaiti nei i nga pi, ehara i a ia i whakawhanau, he pera te tangata e whiwhi ana ki te taonga, a kahore i tika mana; i waenganui o ona ra ka mahue ia i a ratou, a wairangi noa iho ia i tona mutunga iho.
12 Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ.
Ko to tatou wahi tapu he torona kororia, he mea whakanoho ki te wahi tiketike mai i te timatanga.
13 Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.
E Ihowa, e ta Iharaira e tumanako nei, ka whakama te hunga katoa e whakarere ana i a koe; ka tuhituhia ki te whenua te hunga e kotiti ana i ahau, mo ratou i whakarere i a Ihowa, i te puna wai ora.
14 Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.
Rongoatia ahau, e Ihowa, a ka mahu toku mate; whakaorangia ahau, a ka ora ahau: ko koe hoki taku e whakamoemiti ai.
15 Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị? Ya mezuonụ ugbu a!”
Nana, kei te ki mai ratou ki ahau, Kei hea te kupu a Ihowa? tena ra, kia puta mai.
16 Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.
Na, ko ahau nei, kihai ahau i hohoro atu i te mahi hepara i muri i a koe, kihai hoki i hiahia ki te ra o te mamae; e mohio ana ano koe: i mua i tou kanohi te mea i puta mai i oku ngutu.
17 A ghọrọla m ihe na-eyi egwu, nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.
Kei waiho koe hei whakawehi moku: ko koe taku e whakamanawa atu ai i te ra o te he.
18 Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.
Kia whakama te hunga e tukino ana i ahau, kaua ia ahau e whakama: kia wehi ratou, kaua ia ahau e wehi: kawea te ra o te kino ki runga ki a ratou, kia rua hoki nga whakangaromanga e whakangaro ai koe i a ratou.
19 Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.
I penei mai ta Ihowa kupu ki ahau, Haere, e tu ki te kuwaha o nga tama a te iwi, e tomo ai nga kingi o Hura, e haere atu ai hoki, a ki nga kuwaha katoa o Hiruharama:
20 Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’
A ka mea ki a ratou, Whakarongo ki te kupu a Ihowa, e nga kingi o Hura, e Hura katoa, e nga tangata katoa hoki o Hiruharama, e tomo nei ma enei kuwaha:
21 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.
Ko te kupu tenei a Ihowa, Kia tupato ki a koutou, a kaua he kawenga e waha i te ra hapati, kaua ano e maua mai ki roto ma nga kuwaha o Hiruharama;
22 Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu.
Kaua hoki he kawenga e maua atu i o koutou whare i te ra hapati, kaua hoki koutou e mahi i tetahi mahi; engari me whakatapu e koutou te ra hapati, kia rite ki taku i whakahau ai ki o koutou matua;
23 Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.
Otiia kihai ratou i rongo, kihai hoki i tahuri to ratou taringa, engari i whakapakeke i to ratou kaki, kei rongo ratou, kei manako hoki ki te ako.
24 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,
Na, ki te ata whakarongo koutou ki ahau, e ai ta Ihowa, kia kaua e mau kawenga ma nga kuwaha o tenei pa i te ra hapati, engari kia whakatapu i te ra hapati, kia kaua e mahi i tetahi mahi i reira;
25 mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.
Katahi ka tomo ki nga kuwaha o tenei pa he kingi, he rangatira, e noho ana i runga i te torona o Rawiri, e eke ana ki te hariata, ki te hoiho, ratou, a ratou rangatira, me nga tangata o Hura, me te hunga e noho ana i Hiruharama; a ka tuturu tene i pa a ake ake.
26 Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị.
A ka haere mai nga tangata i nga pa o Hura, i nga wahi i nga taha o Hiruharama, i te whenua o Pineamine, i te mania, i nga maunga, i te tonga hoki, me te mau mai he tahunga tinana, he patunga tapu, he whakahere, he whakakakara, a ka maua mai hok i he whakawhetai, ki te whare o Ihowa.
27 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’”
Ki te kore ia koutou e whakarongo ki taku kia whakatapua te ra hapati, kia kaua hoki e maua he kawenga, a ka tomo ki nga kuwaha o Hiruharama i te ra hapati; katahi ka ngiha i ahau he ahi i nga kuwaha o reira, a ka pau nga whare kingi o Hiruharam a, e kore ano e tineia.