< Jeremaya 16 >
1 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
And the word of the Lord came to me, saying:
2 “Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.”
Thou shalt not take thee a wife, neither shalt thou have thee sons and daughters in this place.
3 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.
For thus saith the Lord concerning the sons and daughters, that are born in this place, and concerning their mothers that bore them: and concerning their fathers, of whom they were born in this land:
4 “Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.”
They shall die by the death of grievous illnesses: they shall not be lamented, and they shall not be buried, they shall be as dung upon the face of the earth: and they shall be consumed with the sword, and with famine: and their carcasses shall be meat for the fowls of the air, and for the beasts of the earth.
5 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
For thus saith the Lord: Enter not into the house of feasting, neither go thou to mourn, nor to comfort them: because I have taken away my peace from this people, saith the Lord, my mercy and commiserations.
6 “Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha.
Both the great and the little shall die in the land: they shall not be buried nor lamented, and men shall not cut themselves, nor make themselves bald for them.
7 O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi.
And they shall not break bread among them to him that mourneth, to comfort him for the dead: neither shall they give them to drink of the cup, to comfort them for their father and mother.
8 “Abanyekwala nʼụlọ ebe e nwere oriri soro ndị nọ nʼebe ahụ nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ
And do not thou go into the house of feasting, to sit with them, and to eat and drink.
9 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’
For thus saith the Lord of hosts, the God of Israel: Behold I will take away out of this place in your sight, and in your days the voice of mirth, and the voice of gladness, the voice of the bridegroom, and the voice of the bride.
10 “Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide Onyenwe anyị Chineke anyị?’
And when thou shalt tell this people all these words, and they shall say to thee: Wherefore hath the Lord pronounced against us all this great evil? what is our iniquity? and what is our sin, that we have sinned against the Lord our God?
11 Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu.
Thou shalt say to them: Because your fathers forsook me, saith the Lord: and went after strange gods, and served them, and adored them: and they forsook me, and kept not my law.
12 Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.
And you also have done worse than your fathers: for behold every one of you walketh after the perverseness of his evil heart, so as not to hearken to me.
13 Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’
So I will cast you forth out of this land, into a land which you know not, nor you fathers: and there you shall serve strange gods day and night, which shall not give you any rest.
14 “Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’
Therefore behold the days come, saith the Lord, when it shall be said no more: The Lord liveth, that brought for the children of Israel out of the land of Egypt:
15 Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.
But, the Lord liveth, that brought the children of Israel out of the land of the north, and out of all the lands to which I cast them out: and I will bring them again into their land, which I gave to their fathers.
16 “Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha.
Behold I will send many fishers, saith the Lord, and they shall fish them: and after this I will send them many hunters, and they shall hunt them from every mountain, and from every hill, and out of the holes of the rocks.
17 Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.
For my eyes are upon all their ways: they are not hid from my face, and their iniquity hath not been hid from my eyes.
18 Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.”
And I will repay first their double iniquities, and their sins: because they have defiled my land with the carcasses of their idols, and they have filled my inheritance with their abominations.
19 Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị. Ha ga-abịakwute gị sị gị, “Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie. Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.”
O Lord, my might, and my strength, and my refuge in the day of tribulation: to thee the Gentiles shall come from the ends of the earth, and shall say: Surely our fathers have possessed lies, a vanity which hath not profited them.
20 Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi? E, ma chi ndị ahụ abụghị chi.
Shall a man make gods unto himself, and there are no gods?
21 “Ya mere, aga m eme ka ha mata. Nʼoge a ka m ga-eme ka ha mata ike m, na ịdị ike m. Mgbe ahụ, ha ga-amata na aha m bụ Onyenwe anyị.
Therefore, behold I will this once cause them to know, I will shew them my hand and my power: and they shall know that my name is the Lord.