< Jeremaya 15 >
1 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ.
UThixo wasesithi kimi, “Lanxa uMosi loSamuyeli bengema phambi kwami, inhliziyo yami ingeke iphendukele kulababantu. Basuse phambi kwami! Kabahambe!
2 Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’
Bangakubuza bathi, ‘Sizakuya ngaphi na?’ uthi kubo, uThixo uthi: ‘Abamiselwe ukufa, baya ekufeni; abenkemba, enkembeni; abendlala, endlaleni; abokuthunjwa, ekuthunjweni.’
3 “Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ngizabathumela imihlobo emine yabachithi,” kutsho uThixo, “inkemba yokubulala lezinja zokuhudulela khatshana njalo lezinyoni zasemoyeni kanye lezinyamazana zeganga ukuba zidle zibhuqe.
4 Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
Ngizabenza banengeke emibusweni yonke yasemhlabeni ngenxa yalokho okwenziwa eJerusalema nguManase indodana kaHezekhiya inkosi yakoJuda.
5 “Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
Ngubani ozakuba lesihawu kuwe wena Jerusalema? Ngubani ozakukhalela na? Ngubani ozakuma abuze ukuthi unjani na?
6 Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.
Ungalile,” kutsho uThixo. “Uqhubeka uhlehlela emuva. Ngakho ngizabeka izandla phezu kwakho ngikuchithe; ngingeke ngibe lesihawu futhi.
7 Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
Ngizabahlungula ngefologwe yokwela emasangweni amadolobho elizwe. Ngizaletha ukufelwa lokuchitheka ebantwini bami, ngoba kabaguqulanga izindlela zabo.
8 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.
Ngizakwenza abafelokazi babo bande kakhulu kuletshebetshebe lasolwandle. Emini ngizakwehlisela umbulali phezu kwabonina bamajaha akibo; khonokho ngizabehlisela usizi lokwesaba.
9 Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Unina wabayisikhombisa uzaqaleka aphefumule okokucina. Ilanga lakhe lizatshona kusesemini; uzayangiswa njalo eyiswe. Izinsalela ngizaziqeda ngenkemba phambi kwezitha zazo,” kutsho uThixo.
10 Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.
Maye, wena mama, ngokuthi wangizala, mina muntu ilizwe lonke elibangisana laye njalo liphikisana laye! Kangikaze ngebolekise loba ngeboleke, kodwa bonke bayangithuka.
11 Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
UThixo wathi, “Ngeqiniso ngizakukhulula ngenjongo enhle; ngeqiniso ngizakwenza izitha zakho zikuncenge ezikhathini zomonakalo lezokuhlupheka.
12 “Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?
Umuntu angayiqamula insimbi, insimbi evela enyakatho kumbe ithusi na?
13 “Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.
Inotho yakho lamatshe akho aligugu ngizakwenza kube yimpango, yamahala, ngenxa yezono zakho kulolonke ilizwe lakini.
14 Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.”
Ngizakwenza ube yisigqili sezitha zakho elizweni ongalaziyo, ngoba ulaka lwami luzabhebha umlilo ozakutshisa.”
15 Ị maara O Onyenwe anyị, ya mere cheta m, lekọtaakwa m. Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m. Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi. Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.
Uyazwisisa wena Thixo; ngikhumbula ungikhathalele. Ungiphindiselele kwabangihluphayo. Uyabekezela, ungangigudluli; khumbula ukuthi ngithukwa njani ngenxa yakho.
16 Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
Ekufikeni kwamazwi akho, ngawadla; ayeyintokozo yami lenjabulo yenhliziyo yami, ngoba mina ngibizwa ngebizo lakho, wena Thixo Nkulunkulu Somandla.
17 O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.
Kangizange ngihlale enhlanganisweni yabazithokozisayo, kumbe ngijabule labo; ngahlala ngedwa ngoba isandla sakho sasiphezu kwami njalo wawungenze ngagcwala intukuthelo.
18 Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Kungani ubuhlungu engibuzwayo bungapheli lenxeba lami lilibi kakhulu njalo lingelapheki na? Kimi uzakuba njengesifula esikhohlisayo, lanjengomthombo ongelamanzi na?
19 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị, ime ka i guzokwa nʼihu m. Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m. Ndị a ga-alaghachikwute gị ma i gaghị alaghachikwuru ha.
Ngakho uThixo uthi: “Ungaphenduka, ngizakubuyisela ukuze ungikhonze; nxa ukhuluma amazwi afaneleyo, hatshi angasizi lutho, uzakuba yisikhulumeli sami. Abantu laba kabaphendukele kuwe, kodwa wena akumelanga uphendukele kubo.
20 Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ. Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo. Ha ga-ebuso gị agha, ma ha agaghị emeri gị nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị, nakwa ịzọpụta gị,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ngizakwenza ube ngumduli kulababantu, umduli ovikelweyo wethusi; bazakulwa lawe kodwa kabayikukwehlula, ngoba mina ngilawe ukuba ngikuhlenge ngikusize,” kutsho uThixo.
21 “Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”
“Ngizakuhlenga ezandleni zababi ngikukhulule ezandleni zabalesihluku.”