< Jeremaya 14 >

1 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke rutere Jeremaya banyere ụkọ mmiri.
Hili ndilo neno la Bwana kwa Yeremia kuhusu ukame:
2 “Juda na-eru ụjụ, ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya. Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ, ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.
“Yuda anaomboleza, miji yake inayodhoofika; wanaomboleza kwa ajili ya nchi, nacho kilio kinapanda kutoka Yerusalemu.
3 Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.
Wakuu wanawatuma watumishi wao maji; wanakwenda visimani lakini humo hakuna maji. Wanarudi na vyombo bila maji; wakiwa na hofu na kukata tamaa, wanafunika vichwa vyao.
4 Ala na-agbawa nʼihi enweghị mmiri ozuzo. Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha nʼihi obi ọjọọ ha.
Ardhi imepasuka nyufa kwa sababu hakuna mvua katika nchi; wakulima wana hofu na wanafunika vichwa vyao.
5 Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa, na-ahapụ nwa ọhụrụ ya, nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị.
Hata kulungu mashambani anamwacha mtoto wake aliyezaliwa wakati huo huo kwa sababu hakuna majani.
6 Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị. Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa; anya ha adabamiela ha nʼisi nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”
Punda-mwitu wanasimama juu ya miinuko iliyo kame na kutweta kama mbweha; macho yao yanakosa nguvu za kuona kwa ajili ya kukosa malisho.”
7 Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama, Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị. Anyị emehiela megide gị. Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.
Ingawa dhambi zetu zinashuhudia juu yetu, Ee Bwana, tenda jambo kwa ajili ya jina lako. Kwa kuwa kukengeuka kwetu ni kukubwa, nasi tumetenda dhambi dhidi yako.
8 Gị, onye bụ olileanya Izrel. Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ, gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a, dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?
Ee Tumaini la Israeli, Mwokozi wake wakati wa taabu, kwa nini unakuwa kama mgeni katika nchi, kama msafiri anayekaa kwa usiku mmoja tu?
9 Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede, dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta? Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị; ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị. Ahapụkwala anyị!
Mbona unakuwa kama mtu aliyeshtukizwa, kama shujaa asiye na uwezo wa kuokoa? Wewe uko katikati yetu, Ee Bwana, nasi tunaitwa kwa jina lako; usituache!
10 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a, “Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu. Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe. Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ. Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha, ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
Hili ndilo Bwana asemalo kuhusu watu hawa: “Wanapenda sana kutangatanga, hawaizuii miguu yao. Hivyo Bwana hawakubali; sasa ataukumbuka uovu wao na kuwaadhibu kwa ajili ya dhambi zao.”
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.
Kisha Bwana akaniambia, “Usiombe kwa ajili ya mafanikio ya watu hawa.
12 Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”
Ingawa wanafunga, sitasikiliza kilio chao; hata wakitoa dhabihu za kuteketezwa na dhabihu za nafaka, sitazikubali. Badala yake, nitawaangamiza kwa upanga, njaa na tauni.”
13 Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’”
Lakini nikasema, “Aa, Bwana Mwenyezi, manabii wanaendelea kuwaambia, ‘Hamtaona upanga wala kukabiliwa na njaa. Naam, nitawapa amani ya kudumu mahali hapa.’”
14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara.
Ndipo Bwana akaniambia, “Manabii wanatabiri uongo kwa jina langu. Sikuwatuma, wala sikuwaweka, wala sikusema nao. Wanawatabiria maono ya uongo, maaguzi, maono ya sanamu zisizofaa kitu, na madanganyo ya mawazo yao wenyewe.
15 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ.
Kwa hiyo, hili ndilo Bwana asemalo kuhusu manabii wanaotabiri kwa jina langu: Mimi sikuwatuma, lakini wanasema, ‘Hakuna upanga wala njaa itakayoigusa nchi hii.’ Manabii hao hao watakufa kwa upanga na njaa.
16 A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.
Nao watu hao wanaowatabiria watatupwa nje katika barabara za Yerusalemu kwa sababu ya njaa na upanga. Hapatakuwepo yeyote wa kuwazika wao au wake zao, wana wao au binti zao. Nitawamwagia maafa wanayostahili.
17 “Gwa ha okwu ndị a, “‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị, nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke, ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu, ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.
“Nena nao neno hili: “‘Macho yangu na yatiririkwe na machozi usiku na mchana bila kukoma; kwa kuwa binti yangu aliye bikira, yaani watu wangu, amepata jeraha baya, pigo la kuangamiza.
18 Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo; Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu, ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara. Ma onye amụma ma onye nchụaja agaala nʼala nke ha amaghị.’”
Kama nikienda mashambani, ninaona wale waliouawa kwa upanga; kama nikienda mjini, ninaona maangamizi ya njaa. Nabii na kuhani kwa pamoja wamekwenda katika nchi wasiyoijua.’”
19 Ị jụla Juda kpamkpam? Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ? Gịnị mere i ji tigbuo anyị ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị? Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya ọgwụgwọ, ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.
Je, umemkataa Yuda kabisa? Umemchukia Sayuni kabisa? Kwa nini umetuumiza hata hatuwezi kuponyeka? Tulitarajia amani, lakini hakuna jema lililotujia; tulitarajia wakati wa kupona lakini kuna hofu kuu tu.
20 Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.
Ee Bwana, tunatambua uovu wetu na kosa la baba zetu; kweli tumetenda dhambi dhidi yako.
21 Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị. Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ. Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara; emebikwala ya.
Kwa ajili ya jina lako usituchukie kabisa; usikidharau kiti chako cha enzi kilichotukuka. Kumbuka agano lako nasi na usilivunje.
22 Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo? Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị? Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a. Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị, nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.
Je, kuna sanamu yoyote isiyofaa kitu ya mataifa iwezayo kuleta mvua? Je, anga peke yake zaweza kutoa mvua? La hasha, ni wewe peke yako, Ee Bwana, Mungu wetu. Kwa hiyo tumaini letu liko kwako, kwa kuwa wewe ndiwe ufanyaye haya yote.

< Jeremaya 14 >