< Jeremaya 13 >

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.”
Saa sagde Herren til mig: Gak og køb dig et linnet Bælte, og læg det om dine Lænder, men lad det ikke komme i Vand.
2 Ejere m zụta ajị ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m.
Og jeg købte Bæltet, efter Herrens Ord, og lagde det om mine Lænder.
3 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m,
Da kom Herrens Ord til mig anden Gang saaledes:
4 “Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.”
Tag Bæltet, som du købte, og som er om dine Lænder, og staa op, gak til Eufrat, og skjul det der i en Klipperevne!
5 Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.
Og jeg gik og skjulte det ved Eufrat, som Herren bød mig.
6 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.”
Og det skete efter mange Dages Forløb, da sagde Herren til mig: Staa op, gak til Eufrat, og hent derfra det Bælte, som jeg befalede dig at skjule der.
7 Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla.
Og Jeg gik til Eufrat og grov og tog Bæltet fra det Sted, hvor jeg havde skjult det; og se, Bæltet var fordærvet, det duede ikke til noget.
8 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Da kom Herrens Ord til mig saalunde:
9 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem.
Saa siger Herren: Saaledes vil jeg tilintetgøre Judas Stolthed, ja, Jerusalems store Stolthed.
10 Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla.
Dette onde Folk, de, som vægre sig ved at høre mine Ord, de, som vandre i deres Hjertes Stivhed og gaa efter andre Guder for at tjene dem og at tilbede dem, det blive som dette Bælte, der ikke duer til noget.
11 Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Thi ligesom Bæltet slutter sig til en Mands Lænder, saa lod jeg alt Israels Hus og alt Judas Hus slutte sig til mig, siger Herren, for at de skulde blive mig til et Folk og til et Navn og til Lov og til Ære; men de hørte ikke.
12 Sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’
Og du skal sige dette Ord til dem: Saa siger Herren, Israels Gud: Hver Flaske skal fyldes med Vin; og de skulle sige til dig: Mon vi ikke vide det, at hver Flaske skal fyldes med Vin?
13 Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem.
Og du skal sige til dem: Saa siger Herren: Se, jeg fylder alle dette Lands Indbyggere, baade de Konger, som efter David sidde paa hans Trone, og Præsterne og Profeterne og alle Indbyggerne i Jerusalem med Beruselse.
14 Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Og jeg vil sønderslaa dem, den ene imod den anden, baade Fædrene og Børnene tillige, siger Herren; jeg vil hverken skaane, ej heller spare, ej heller forbarme mig, at jeg jo ødelægger dem.
15 Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
Hører og laaner Øren, ophøjer eder ikke! thi Herren har talt.
16 Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.
Giver Herren eders Gud Ære, før han lader det blive mørkt, og før eders Fødder støde paa Mørkets Bjerge, og I skulle forvente Lys, men han skal gøre det til Dødens Skygge og omskifte det til Mørkhed.
17 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
Men dersom I ikke ville høre dette, skal min Sjæl græde i Løndom over Hovmodigheden, og den skal fælde bitre Taarer, og mit Øje rinde med Graad; thi Herrens Hjord er ført tangen bort.
18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”
Sig til Kongen og til Herskerinden: Sætter eder lavere! thi nedfaldne ere eders Hovedsmykker, ja, eders dejlige Krone.
19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.
Stæderne i Sydlandet ere tillukkede, og der er ingen, som oplader dem; al Juda er bortført, fuldstændigt bortført.
20 Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?
Opløfter eders Øjne, og ser dem, som komme fra Norden; hvor er nu Hjorden, som dig var given, dine dejlige Faar?
21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?
Hvad vil du sige, naar han sætter Venner, som du selv har lært at være dig imod, til Overhoved over dig; mon Smerter ikke skulle betage dig som en Kvinde, der føder?
22 Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.
Og naar du vil sige i dit Hjerte: Hvorfor vederfares mig disse Ting, saa er det for din Misgernings Mangfoldigheds Skyld, at dit Slæb er slaaet op, at dine Hæle have lidt Overlast.
23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.
Kan en Morian omskifte sin Hud eller en Parder sine Pletter, saa skulle ogsaa I kunne gøre vel, I, som have lært at gøre ilde!
24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.
Derfor vil jeg adsprede dem som Halm, der farer hen for et Vejr fra Ørken.
25 Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche.
Dette er din Lod, din til— maalte Del fra mig, siger Herren, du, som har glemt mig og forladt dig paa Løgn.
26 Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.
Saa har da ogsaa jeg opslaaet dit Slæb for dit Ansigt, og din Skam er set.
27 Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”
Dine Horerier og din Vrinsken, din Bolens Skændsel paa Højene, paa Marken, ja, dine Vederstyggeligheder har jeg set; ve dig, Jerusalem! du vil ikke blive ren, hvor længe det endnu herefter varer.

< Jeremaya 13 >