< Jeremaya 13 >

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.”
Yehova anandiwuza kuti, “Pita kagule lamba wansalu yosalala ndipo ukavale mʼchiwuno mwako, koma usakamuviyike mʼmadzi.”
2 Ejere m zụta ajị ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m.
Choncho ndinakagula lambayo, monga momwe anandiwuzira Yehova, ndipo ndinamanga mʼchiwuno mwanga.
3 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m,
Kenaka Yehova anandiyankhulanso kachiwiri kuti,
4 “Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.”
“Tenga lamba amene unagula ndi kuvala mʼchiwuno mwako uja. Tsono pita ku mtsinje wa Yufurate ndipo ukamubise lambayo mʼmingʼalu ya mʼmatanthwe.”
5 Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.
Ndipo ndinapitadi ndi kukabisa lambayo ku Yufurate, monga anenera Yehova.
6 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.”
Patapita masiku ambiri Yehova anandiwuzanso kuti, “Pitanso ku Yufurate ndipo ukatenge lamba amene ndinakuwuza kuti ukamubise kumeneko.”
7 Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla.
Choncho ndinapita ku Yufurate kukafukula lambayo ndi kumuchotsa pamalo pamene ndinamubisa, koma nthawi imeneyi nʼkuti lambayo atawonongeka kotheratu ndipo analibenso ntchito.
8 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Pamenepo Yehova anandiwuza kuti,
9 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem.
“Izi ndi zimene ine ndikunena: ‘Umu ndi mmene ndidzawonongere zimene akunyadira kwambiri a ku Yuda ndi a ku Yerusalemu.
10 Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla.
Anthuwa ndi oyipa. Iwo akana kumvera mawu anga. Mʼmalo mwake amawumirira kutsata milungu ina, kuyitumikira ndi kuyipembedza. Anthu amenewa adzakhala ngati lamba wopanda ntchitoyu.
11 Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Monga momwe lamba amakanirira mʼchiwuno cha munthu, momwemonso ndinakonza kuti nyumba yonse ya Israeli ndi nyumba yonse ya Yuda indikangamire Ine kuti akhale anthu anga, kuti azitamanda dzina langa ndi kulemekeza Ine. Koma iwo sanamvere,’ akutero Yehova.
12 Sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’
“Awuze anthuwo kuti, ‘Yehova Mulungu wa Israeli akuti: Mtsuko uliwonse adzawudzaza ndi vinyo.’ Ndipo ngati iwo anena kwa iwe kuti, ‘Kodi ngati ife sitikudziwa kuti mtsuko uliwonse udzadzazidwa ndi vinyo?’
13 Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem.
Tsono iwe uwawuze kuti, Yehova akuti ‘Ine ndidzaledzeretsa anthu onse okhala mʼdziko muno, kuyambira mafumu amene amakhala pa mpando waufumu wa Davide, ansembe, aneneri, pamodzi ndi anthu onse amene akukhala mu Yerusalemu.
14 Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ndidzawagundanitsa mitu kuti aphwanyane okhaokha ngati mitsuko, makolo ndi ana awo, akutero Yehova. Sindidzawamvera chisoni kapena kuwachitira chifundo kapena kukhudzidwa nawo kuti ndileke kuwawononga.’”
15 Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
Imvani inu Aisraeli ndipo tcherani khutu, musadzitukumule, pakuti ndi Yehova amene akuyankhula.
16 Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.
Lemekezani Yehova Mulungu wanu asanagwetse mdima, mapazi anu asanayambe kupunthwa mʼchisisira chamʼmapiri. Asanasandutse kuwala mukuyembekezerako kukhala mdima wandiweyani.
17 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
Koma ngati simumvera, ndidzalira kwambiri chifukwa cha kunyada kwanu. Mʼmaso mwanga mwadzaza ndi misozi yowawa chifukwa nkhosa za Yehova zatengedwa ukapolo.
18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”
Uza mfumu pamodzi ndi amayi ake kuti, “Tsikani pa mipando yaufumuyo, pakuti zipewa zanu zaufumu zokongolazo zagwa pansi.”
19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.
Mizinda ya ku Negevi yatsekedwa ndipo palibe wina woti nʼkuyitsekula. Yuda yense watengedwa kupita ku ukapolo, watengedwa yense ukapolo.
20 Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?
Tukula maso ako kuti uwone amene akubwera kuchokera kumpoto. Kodi nkhosa zimene anakusungitsa zili kuti, nkhosa zanu zokongola zija?
21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?
Kodi udzanena chiyani pamene [Yehova] adzakuyikira anthu amene unkanena kuti ndi abale ako akukugonjetsa ndi kukulamulira? Kodi sudzamva zowawa ngati za mayi pa nthawi yake yochira?
22 Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.
Ndipo ngati udzadzifunsa kuti, “Kodi zimenezi zandichitikira chifukwa chiyani?” Ndi chifukwa cha machimo anu ambiri kuti zovala zanu zingʼambike ndiponso kuti akuchitireni nkhanza.
23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.
Kodi wa dziko la Kusi nʼkusintha khungu lake, kapena kambuku kusintha mawanga ake? Inunso amene munazolowera kuchita zoyipa simungathe kusintha.
24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.
“Ine ndidzakumwazani ngati mankhusu amene amawuluka ndi mphepo ya ku chipululu.
25 Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche.
Limeneli ndiye gawo lanu, chilango chimene ndakukonzerani chifukwa chondiyiwala Ine ndi kutumikira milungu yabodza, akutero Yehova.
26 Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.
Ine ndidzakwinya zovala zanu mpaka ku maso kuti umaliseche wanu uwonekere.
27 Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”
Ndaona zonyansa zanu: zigololo zanu, kutchetcherera kwanu ndi ziwerewere zanu, zochitika pa mapiri ndi mʼminda. Tsoka iwe Yerusalemu! Udzakhala wosayeretsedwa pa zachipembedzo mpaka liti?”

< Jeremaya 13 >