< Jeremaya 11 >
1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya,
The word which came to Jeremiah from Jehovah, saying:
2 “Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem.
Hear ye the words of this covenant, And speak ye to the men of Judah, And the inhabitants of Jerusalem.
3 Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a,
And say thou to them, Thus saith Jehovah, the God of Israel: Cursed is the man who will not obey the words of this covenant,
4 bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼIjipt, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa Chineke unu.
Which I commanded your fathers, When I brought them forth from the land of Egypt, From the iron furnace, saying, “Obey ye my voice, And do all which I command you; So shall ye be my people, And I will be your God;
5 ‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.”
So that I may perform the oath, Which I made to your fathers, To give them a land flowing with milk and honey, as it is this day.” Then answered I, and said, So may it be, O Jehovah!
6 Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru.
Then said Jehovah to me, Proclaim all these words in the cities of Judah, And the streets of Jerusalem, saying: Hear ye the words of this covenant, and do them!
7 Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.”
For I have earnestly admonished your fathers, From the time when I brought them up from the land of Egypt to this day, Rising early and admonishing them, saying, “Obey ye my voice!”
8 Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’”
Yet they obeyed not, nor inclined their ear, But walked every one in the obstinacy of his evil heart; Therefore have I brought upon them all the words of this covenant, Which I commanded them to obey, And they obeyed not.
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị Juda na ndị bi na Jerusalem.
Jehovah also said to me: A conspiracy hath been found among the men of Judah, And the inhabitants of Jerusalem.
10 Ha alaghachila azụ nʼụdị mmehie ahụ nna nna ha mehiere, bụ ndị ahụ jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha agbasoola chi ndị ọzọ na-efe ha. Ụlọ Izrel na ụlọ Juda adịghị edebekwa ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara.
They turn back to the iniquities of their forefathers, Who refused to hearken to my words; They go after strange gods and serve them; The house of Israel and the house of Judah have broken the covenant Which I made with their fathers.
11 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị.
Therefore thus saith Jehovah: Behold I bring upon them a calamity, From which they shall not be able to escape; And though they cry to me, I will not hear them.
12 Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha.
Then may the cities of Judah and the inhabitants of Jerusalem go, And cry to the gods to whom they burn incense; But they shall not save them at all in the time of their calamity.
13 Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’
For according to the number of thy cities are thy gods, O Judah! According to the number of the streets of Jerusalem have ye set up altars to a thing of shame, Altars for burning incense to Baal.
14 “Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.
Therefore pray not thou for this people, Nor lift up a cry or a prayer for them; For I will not hear when they cry to me On account of their calamity.
15 “Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.”
What hath my beloved to do in my house, While many pollute it with wickedness? The holy flesh shall pass away from thee, For when thou doest evil, thou rejoicest.
16 Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.
Jehovah hath called thee an olive-tree, Green, fair, and of goodly fruit; With the noise of a great crackling doth he kindle a fire upon it, And the branches of it shall be broken.
17 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.
For Jehovah of hosts, who planted thee, Hath pronounced evil against thee, On account of the wickedness of the house of Israel and of Judah, which they have committed In provoking me to anger by burning incense to Baal.
18 Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ.
Jehovah made it known to me, and I knew it; Thou didst show me their machinations!
19 Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ”
For I was like a tame lamb, that is led to the slaughter, And knew not that they had formed plots against me, [[saying, ]] “Let us destroy the tree with its fruit, Let us cut him off from the land of the living, That his name may no more be remembered!”
20 Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.
But, O Jehovah of hosts, the righteous judge, Who triest the reins and the heart, I shall see thy vengeance on them, For to thee have I revealed my cause!
21 Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.”
Therefore thus saith Jehovah against the men of Anathoth, Who seek thy life, and say, “Prophesy not in the name of Jehovah, Lest thou die by our hand!”
22 Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom.
Therefore thus saith Jehovah of hosts: Behold, I will punish them; Their young men shall die by the sword; Their sons and their daughters shall die by famine,
23 O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị Anatot nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.”
There shall be none of them left; For I will bring evil upon the men of Anathoth, At the time of their punishment.