< Jeremaya 10 >

1 Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.
Gbọ́ ọ̀rọ̀ tí Olúwa sọ fún yín ẹ̀yin ilé Israẹli.
2 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
Báyìí ni Olúwa wí: “Má ṣe kọ́ ìwà àwọn kèfèrí, kí àmì ọ̀run kí ó má sì dààmú yín, nítorí pé wọ́n ń dààmú orílẹ̀-èdè.
3 Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
Nítorí pé asán ni àṣà àwọn ènìyàn, wọ́n gé igi láti inú igbó, oníṣọ̀nà sì gbẹ́ ẹ pẹ̀lú àáké rẹ̀.
4 Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda.
Wọ́n fi fàdákà àti wúrà ṣe é lọ́ṣọ̀ọ́. Wọ́n fi òòlù kàn án àti ìṣó kí ó má ba à ṣubú.
5 Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”
Wọ́n wé mọ́ igi bí ẹ̀gúnsí inú oko, òrìṣà wọn kò le è fọhùn. Wọ́n gbọdọ̀ máa gbé wọn nítorí pé wọn kò lè rìn. Má ṣe bẹ̀rù wọn; wọn kò le è ṣe ibi kankan bẹ́ẹ̀ ni wọn kò si lè ṣe rere kan.”
6 O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
Kò sí ẹni tí ó dàbí rẹ Olúwa; o tóbi orúkọ rẹ sì tóbi lágbára.
7 Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.
Ta ni kò yẹ kí ó bẹ̀rù rẹ? Ọba àwọn orílẹ̀-èdè? Nítorí tìrẹ ni. Láàrín àwọn ọlọ́gbọ́n ènìyàn ní orílẹ̀-èdè àti gbogbo ìjọba wọn, kò sí ẹni tí ó dàbí rẹ.
8 Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
Gbogbo wọn jẹ́ aláìlóye àti aṣiwèrè, wọ́n ń kọ́ ẹ̀kọ́ àwọn ère igi tí kò níláárí.
9 A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
Fàdákà tí a ti kàn ni a mú wá láti Tarṣiṣi, àti wúrà láti Upasi. Èyí tí àwọn oníṣọ̀nà àti alágbẹ̀dẹ ṣe tí wọ́n kùn ní àwọ̀ aró àti elése àlùkò, èyí jẹ́ iṣẹ́ ọwọ́ àwọn ọlọ́gbọ́n oníṣọ̀nà.
10 Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
Ṣùgbọ́n Olúwa ni Ọlọ́run tòótọ́, òun ni Ọlọ́run alààyè, ọba ayérayé. Nígbà tí ó bá bínú, ayé yóò wárìrì; orílẹ̀-èdè kò lè fi ara da ìbínú rẹ̀.
11 “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’”
“Sọ èyí fún wọn: ‘Àwọn ọlọ́run kéékèèké tí kò dá ọ̀run àti ayé ni yóò ṣègbé láti ayé àti ní abẹ́ ọ̀run.’”
12 Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
Ọlọ́run dá ayé pẹ̀lú agbára rẹ̀, ó dá àgbáyé pẹ̀lú ọgbọ́n rẹ̀, ó mú kí ọ̀run kí ó fẹ̀ síta nípa òye rẹ̀.
13 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
Nígbà tí ó bá sán àrá, àwọn omi lọ́run a sì pariwo; ó mú kí ìkùùkuu ru sókè láti òpin ayé. Ó rán mọ̀nàmọ́ná pẹ̀lú òjò, ó sì ń mú afẹ́fẹ́ wá láti ilé ìṣúra rẹ̀.
14 Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
Gbogbo ènìyàn jẹ́ aṣiwèrè àti aláìnímọ̀, ojú ti gbogbo alágbẹ̀dẹ níwájú ère rẹ̀, nítorí ère dídá rẹ̀ èké ni, kò sì ṣí ẹ̀mí nínú rẹ̀.
15 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
Asán ni wọ́n, iṣẹ́ ìṣìnà; nígbà ìbẹ̀wò wọn, wọn yóò ṣègbé.
16 Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
Ẹni tí ó bá jẹ́ ìpín Jakọbu kò sì dàbí èyí, nítorí òun ni ó ṣẹ̀dá ohun gbogbo àti Israẹli tí ó jẹ́ ẹ̀yà ìjogún rẹ̀. Olúwa àwọn ọmọ-ogun ni orúkọ rẹ̀.
17 Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
Kó ẹrù rẹ kúrò láti fi ilẹ̀ náà sílẹ̀ ìwọ tí o ń gbé ní ìlú tí a dó tì.
18 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
Nítorí èyí ni Olúwa wí: “Ní àkókò yìí, èmi yóò gbọn àwọn tí ó ń gbé ilẹ̀ náà jáde. Èmi yóò mú ìpọ́njú bá wọn, kí wọn kí ó lè rí wọn mú.”
19 Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
Ègbé ni fún mi nítorí ìpalára mi! Ọgbẹ́ mi jẹ́ èyí tí kò lè sàn, bẹ́ẹ̀ ni mọ sọ fún ara mi, “Èyí ni àìsàn mi, mo sì gbọdọ̀ fi orí tì í.”
20 Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
Àgọ́ mi bàjẹ́, gbogbo okùn rẹ̀ sì já. Àwọn ọmọ mi ti lọ lọ́dọ̀ mi, wọn kò sì sí mọ́, kò sí ẹnìkankan tí yóò na àgọ́ mi ró mọ́, tàbí yóò ṣe ibùgbé fún mi.
21 Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
Àwọn olùṣọ́-àgùntàn jẹ́ aṣiwèrè, wọn kò sì wá Olúwa: nítorí náà wọn kì yóò ṣe rere àti pé gbogbo agbo wọn ni yóò túká.
22 Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.
Fetísílẹ̀! ariwo igbe ń bọ̀, àti ìdàrúdàpọ̀ ńlá láti ilẹ̀ àríwá wá! Yóò sì sọ ìlú Juda di ahoro, àti ihò ọ̀wàwà.
23 O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
Èmi mọ̀ Olúwa wí pé ọ̀nà ènìyàn kì í ṣe ti ara rẹ̀, kì í ṣe fún ènìyàn láti tọ́ ìgbésẹ̀ ara rẹ̀.
24 Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
Tún mi ṣe Olúwa, pẹ̀lú ìdájọ́ nìkan kí o má sì ṣe é nínú ìbínú rẹ, kí ìwọ má ṣe sọ mí di òfo.
25 Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.
Tú ìbínú rẹ jáde sórí àwọn orílẹ̀-èdè tí kò mọ̀ ọ́n, sórí àwọn ènìyàn tí wọn kò pe orúkọ rẹ. Nítorí pé wọ́n ti jẹ Jakọbu run, wọ́n ti jẹ ẹ́ run pátápátá, wọ́n sì sọ ibùgbé rẹ̀ di ahoro.

< Jeremaya 10 >