< Jeremaya 10 >

1 Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.
“Hear the word that Yahweh is announcing to you, house of Israel.
2 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
Yahweh says this, 'Do not learn the ways of the nations, and do not be dismayed by the signs in the heavens, for the nations are dismayed by these.
3 Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
For the religious customs of these people are worthless. They cut down a tree in the forest, and the craftsman carves the wood.
4 Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda.
Then they decorate it with silver and gold. They strengthen it with hammer and nails so it will not fall over.
5 Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”
What they make with their hands is like scarecrows in a cucumber field, because they, too, can say nothing, and they have to be carried because they cannot walk. Do not fear them, for they cannot bring about evil, nor are they able to do anything good.'”
6 O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
There is no one like you, Yahweh. You are great, and your name is great in power.
7 Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.
Who does not fear you, king of the nations? For this is what you deserve, for there is no one like you among all the wise men of the nations or all their royal kingdoms.
8 Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
They are all the same, they are brutish and stupid, disciples of idols that are nothing but wood.
9 A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
They bring hammered silver from Tarshish, and gold from Uphaz made by artificers, the hands of refiners. Their clothes are blue and purple cloth. Their skillful men made all of these things.
10 Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
But Yahweh is the true God. He is the living God and eternal king. The earth quakes at his anger, and the nations cannot endure his anger.
11 “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’”
You will speak to them like this, “The gods that did not make the heavens and earth will perish from the earth and from under these heavens.”
12 Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
But it was he who made the earth by his power, and he established the world by his wisdom, and by his understanding he stretched out the heavens.
13 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
His voice makes the roar of waters in the heavens, and he brings up the mists from the ends of the earth. He makes lightning for the rain and sends out wind from his storehouse.
14 Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
Every man has become ignorant, without knowledge. Every metalworker is put to shame by his idols. For his cast images are frauds; there is no life in them.
15 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
They are useless, the work of mockers; they will perish at the time of their punishment.
16 Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
But God, the portion of Jacob, is not like these, for he is the molder of all things. Israel is the tribe of his inheritance; Yahweh of hosts is his name.
17 Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
Gather your bundle and leave the land, you people who have been living under the siege.
18 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
For Yahweh says this, “See, I am about to throw the inhabitants of the land out this time. I will cause them distress, and they will find it to be so.”
19 Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
Woe to me! Because of my broken bones, my wound is infected. So I said, “Surely this is agony, but I must bear it.”
20 Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
My tent is devastated, and all of my tent cords are cut in two. They have taken my children away from me, so they no longer exist. There is no longer anyone to spread out my tent or to raise up my tent curtains.
21 Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
For the shepherds are stupid and they do not seek Yahweh; so they have not prospered, and all their flock has been scattered.
22 Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.
The report of news has arrived, “See! It is coming, a great earthquake is coming from the land of the north To make the cities of Judah into ruins, hideouts for jackals.”
23 O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
I know, Yahweh, that the way of a man does not come from himself. No person walking directs his own steps.
24 Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
Discipline me, Yahweh, with justice, not in your anger or you would destroy me.
25 Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.
Pour your fury on the nations that do not know you and on the families that do not call on your name. For they have devoured Jacob and consumed him so as to completely destroy him and demolish his habitation.

< Jeremaya 10 >