< Jeremaya 1 >

1 Ndị a bụ okwu Jeremaya nwa Hilkaya, bụ otu onye nʼime ndị nchụaja, nọ nʼAnatot nke dị nʼala Benjamin.
Words of Jeremiah son of Hilkiah, of the priests who [are] in Anathoth, in the land of Benjamin,
2 Onye okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere nʼafọ nke iri na atọ nʼoge ọchịchị Amọn, eze Juda bụ nwa Josaya.
to whom the word of YHWH has been in the days of Josiah son of Amon, king of Judah, in the thirteenth year of his reign,
3 Ozi ndị ọzọ rukwara ya ntị nʼoge Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda, ruokwa nʼọnwa nke ise nʼafọ nke iri na otu nke Zedekaya nwa Josaya, bụ eze Juda kwụsịrị, mgbe a dọkpụụrụ ndị Jerusalem nʼagha buru ha ka ha gaa biri na mba ọzọ.
and it is in the days of Jehoiakim son of Josiah, king of Judah, until the completion of the eleventh year of Zedekiah son of Josiah, king of Judah, until the expulsion of Jerusalem in the fifth month.
4 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị,
And there is a word of YHWH to me, saying,
5 “Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”
“Before I form you in the belly, I have known you; and before you come forth from the womb I have separated you; I have made you a prophet to the nations.”
6 Asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị.”
And I say, “Aah! Lord YHWH! Behold, I have not known—to speak, for I [am] a youth.”
7 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu.
And YHWH says to me, “Do not say, I [am] a youth, for to all to whom I send you—go, and all that I command you—speak.
8 Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
Do not be afraid of their faces, for I [am] with you to deliver you,” a declaration of YHWH.
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ.
And YHWH puts forth His hand, and strikes against my mouth, and YHWH says to me, “Behold, I have put My words in your mouth.
10 Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”
See, I have charged you this day concerning the nations, and concerning the kingdoms, to pluck up, and to break down, and to destroy, and to throw down, to build, and to plant.”
11 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.”
And there is a word of YHWH to me, saying, “What are you seeing, Jeremiah?” And I say, “I am seeing a rod of an almond tree.”
12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ị hụrụ nke ọma, nʼihi na m na-eche okwu ọnụ ịhụ m na m mezuru ha.”
And YHWH says to me, “You have seen well: for I am watching over My word to do it.”
13 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.”
And there is a word of YHWH to me a second time, saying, “What are you seeing?” And I say, “I am seeing a blown pot, and its face [is] from the north.”
14 Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a.
And YHWH says to me, “From the north the evil is loosed against all inhabitants of the land.
15 Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem, imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu, na imegidekwa obodo niile nke Juda.
For behold, I am calling for all families of the kingdoms of the north,” a declaration of YHWH, “And they have come, and each put his throne at the opening of the gates of Jerusalem, and by its walls all around, and by all cities of Judah.
16 Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.
And I have spoken My judgments with them concerning all their evil, in that they have forsaken Me, and make incense to other gods, and bow themselves to the works of their own hands.
17 “Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.
And you, you gird up your loins, and have arisen, and spoken to them all that I command you: do not be frightened because of them, lest I frighten you before them.
18 Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.
And I, behold, have given you this day for a fortified city, and for an iron pillar, and for bronze walls over all the land, to the kings of Judah, to its heads, to its priests, and to the people of the land;
19 Ha ga-agbalị ka ha megide gị, ma ha agaghị emeri gị. Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m anapụtakwa gị.” Otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
and they have fought against you, and they do not prevail against you; for I [am] with you,” a declaration of YHWH, “to deliver you.”

< Jeremaya 1 >