< Jemis 4 >

1 Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu?
FROM whence come wars and conflicts among you? spring they not from hence, even from your passions, which war in your members?
2 Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.
Ye eagerly covet, yet have not: ye murder, and are envious, yet cannot obtain your object; ye wage war, but have not, because ye pray not.
3 Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.
Ye ask, and receive nothing, because ye ask vilely, in order to consume it on your sensual appetites.
4 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
Ye adulterers and adultresses, know ye not that friendship with the world is enmity against God? whosoever therefore will be a friend of the world is set down an enemy to God.
5 Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”
Think ye that the scripture saith without meaning, The spirit which dwelleth in you strongly urges to envy?
6 Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
But he giveth mightier grace. Wherefore he saith, “God sets himself against the proud, but giveth grace to the lowly.”
7 Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
Be in subjection then to God. Resist the devil, and he will fly from you.
8 Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.
Draw nigh to God, and he will draw nigh to you. Make clean your hands, ye sinners; and purify your hearts, ye double-minded.
9 Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.
Be bitterly afflicted and lament, and let your tears run down; let your laughter be converted into mourning, and your joy into dejection.
10 Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
Be humbled in the presence of God, so he will exalt you.
11 Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.
Traduce not one another, brethren. He that traduceth his brother, and judgeth his brother, traduceth the law, and judgeth the law: but if thou judgest the law, thou art not a doer of the law, but as judge.
12 Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
There is one lawgiver, who can save or destroy: who art thou that judgest another man?
13 Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”
Come now, ye that talk, To-day or to-morrow we will go to such a town, and do business there during one year, and traffic, and make great profits:
14 Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.
though ye know nothing of what shall be to-morrow. For what is your life? It is but a vapour which appeareth for a little while, and then vanishes away.
15 Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.”
Instead of your saying, If the Lord pleases, and we are alive, then we will do this or that thing.
16 Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.
But now ye glory in your proud boastings: all such glorying is wicked.
17 Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.
Therefore if a man knoweth how to act properly, and doth not, he is criminal.

< Jemis 4 >