< Aịzaya 1 >

1 Ọhụ Aịzaya nwa Emọz, nke ọ hụrụ banyere Juda na Jerusalem nʼoge ọchịchị Ụzaya, Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda.
The visions of Isaiah son of Amoz, that he has seen concerning Judah and Jerusalem, in the days of Uzziah, Jotham, Ahaz, Hezekiah, kings of Judah.
2 Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa! Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola okwu: “Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha, ma ha enupula isi megide m.
Hear, O heavens, and give ear, O earth, For YHWH has spoken: “I have nourished and brought up sons, And they transgressed against Me.
3 Ehi maara onyenwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri, ma Izrel amaghị m, ndị m adịghị aghọtakwa.”
An ox has known its owner, And a donkey the crib of its master, Israel has not known, My people have not understood.”
4 Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha.
Oh, sinning nation, a people heavy [with] iniquity, A seed of evildoers, sons—corrupters! They have forsaken YHWH, They have despised the Holy One of Israel, They have gone away backward.
5 Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.
Why are you struck anymore? You add apostasy! Every head has become diseased, and every heart [is] sick.
6 O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke, site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu; ọnya, na ntihịa ahụ, na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ; e kechikwaghị ha, e tekwaghị ha mmanụ.
From the sole of the foot—to the head, There is no soundness in it, Wound, and bruise, and fresh striking! They have not been closed nor bound, Nor have they softened with ointment.
7 Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.
Your land [is] a desolation, your cities burned with fire, Your ground—strangers are consuming it before you, And a desolation as overthrown by strangers!
8 Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.
And the daughter of Zion has been left, As a shelter in a vineyard, As a lodge in a place of cucumbers—as a city besieged.
9 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.
Unless YHWH of Hosts had left a remnant to us, Shortly—we had been as Sodom, We had been like to Gomorrah!
10 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.
Hear the word of YHWH, you rulers of Sodom, Give ear to the Law of our God, you people of Gomorrah,
11 “Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja, gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?” ka Onyenwe anyị sịrị. “Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ; Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi adịghị atọkwa m ụtọ.
“Why the abundance of your sacrifices to Me?” says YHWH, “I have been satiated [with] burnt-offerings of rams, And fat of fatlings; And blood of bullocks, and lambs, And I have not desired male goats.
12 Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.
When you come to appear before Me, Who has required this of your hand, To trample My courts?
13 Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ. Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile, apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru.
Do not add to bring in a vain present, Incense—it [is] an abomination to Me, New moon, and Sabbath, calling of convocation! Do not render iniquity—and a restraint!
14 Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha.
My soul has hated your new moons and your set seasons, They have been on Me for a burden, I have been weary of bearing.
15 Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!
And in your spreading forth your hands, I hide My eyes from you, Also when you increase prayer, I do not hear, Your hands have been full of blood.
16 Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
Wash yourselves, make yourselves pure, Turn aside the evil of your doings, from before My eyes, Cease to do evil, learn to do good.
17 Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
Seek judgment, make the oppressed blessed, Judge the fatherless, strive [for] the widow.
18 “Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
Now come, and we settle this,” says YHWH, “If your sins are as scarlet, they will be white as snow, If they are red as crimson, they will be as wool!
19 Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.
If you are willing, and have listened, The good of the land you consume,
20 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.
And if you refuse, and have rebelled, You are consumed [by] the sword,” For the mouth of YHWH has spoken.
21 Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.
How has a faithful city become a harlot? I have filled it [with] judgment, Righteousness lodges in it—now murderers.
22 Ọlaọcha gị aghọọla unyi, ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke.
Your silver has become dross, Your drink defiled with water.
23 Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.
Your princes [are] apostates, and companions of thieves, Everyone loving a bribe, and pursuing rewards, They do not judge the fatherless, And the plea of the widow does not come to them.
24 Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.
Therefore—a declaration of the Lord—YHWH of Hosts, the Mighty One of Israel: “Oh, I relieve Myself from My adversaries, And avenge Myself against My enemies,
25 Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.
And I turn back My hand on you, And I refine your dross as purity, And I turn aside all your tin,
26 Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”
And I give back your judges as at the first, And your counselors as in the beginning, After this you are called, A city of righteousness—a faithful city.”
27 A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.
Zion is redeemed in judgment, And her captivity in righteousness.
28 Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.
And the destruction of transgressors and sinners [is] together, And those forsaking YHWH are consumed.
29 “Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ.
For [men] are ashamed because of the oaks That you have desired, And you are confounded because of the gardens That you have chosen.
30 Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ.
For you are as an oak whose leaf is fading, And as a garden that has no water.
31 Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ; ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụ nke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu. Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.”
And the strong has been for tow, And his work for a spark, And both of them have burned together, And there is none quenching!

< Aịzaya 1 >