< Aịzaya 9 >

1 Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.
For [there will be] no gloom on her who [is] distressed as at the former time. The land of Zebulun and the land of Naphtali, So the latter has honored the way of the sea, Beyond the Jordan, Galilee of the nations.
2 Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.
The people who are walking in darkness Have seen a great light, Dwellers in a land of death-shade, Light has shone on them.
3 I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.
You have multiplied the nation, You have made its joy great, They have rejoiced before You as the joy in harvest, As [men] rejoice in their apportioning spoil.
4 Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.
Because the yoke of its burden, And the staff of its shoulder, the rod of its exactor, You have broken as [in] the day of Midian.
5 Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
For every battle of a warrior [is] with rushing, and raiment rolled in blood, And it has been for burning—fuel of fire.
6 Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
For a Child has been born to us, A Son has been given to us, And the dominion is on His shoulder, And He calls His Name Wonderful, Counselor, Mighty God, Father of Eternity, Prince of Peace.
7 Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
Of the increase of [His] dominion, And of peace, there is no end, On the throne of David, and on His kingdom, To establish it, and to support it, In judgment and in righteousness, From now on, even for all time, The zeal of YHWH of Hosts does this.
8 Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.
The Lord has sent a word into Jacob, And it has fallen in Israel.
9 Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị,
And the people have known—all of it, Ephraim, and the inhabitant of Samaria, In pride and in greatness of heart, saying,
10 “Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
“Bricks have fallen, and we build hewn work, Sycamores have been cut down, and we renew cedars.”
11 Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha.
And YHWH sets the adversaries of Rezin on high above him, And he joins his enemies together,
12 Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Aram from before, and Philistia from behind, And they devour Israel with the whole mouth. With all this His anger has not turned back, And His hand is still stretched out.
13 Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
And the people has not turned back to Him who is striking it, And they have not sought YHWH of Hosts.
14 Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
And YHWH cuts off head and tail from Israel, Branch and reed—the same day.
15 Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
Elderly and accepted of faces—he [is] the head, And prophet teaching falsehood—he [is] the tail.
16 Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
And the eulogists of this people are causing to err, And its eulogized ones are consumed.
17 Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Therefore, the Lord does not rejoice over its young men, And He does not pity its orphans and its widows, For everyone [is] profane, and an evildoer, And every mouth is speaking folly. With all this His anger has not turned back, And His hand is still stretched out.
18 Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.
For wickedness has burned as a fire, It devours brier and thorn, And it kindles in thickets of the forest, And they lift themselves up, an exaltation of smoke!
19 Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.
In the wrath of YHWH of Hosts The land has been consumed, And the people is as fuel of fire; A man has no pity on his brother,
20 Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
And cuts down on the right, and has been hungry, And he devours on the left, And they have not been satisfied, They each devour the flesh of his own arm.
21 Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Manasseh—Ephraim, and Ephraim—Manasseh, Together they [are] against Judah, With all this His anger has not turned back. And His hand is still stretched out!

< Aịzaya 9 >