< Aịzaya 8 >

1 Onyenwe anyị siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz.
And Jehovah said to me, Take thee a great tablet, and with a man's writing-instrument write on it, Hasteth-the-prey, Speedeth-the-spoil.
2 Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.”
And I took with me faithful witnesses, Uriah the priest, and Zechariah, the son of Berechiah.
3 Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz.
I went in to the prophetess, and she conceived and bore a son. Then said Jehovah to me, Call his name, Hasteth-the-prey, Speedeth-the-spoil.
4 Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.”
For before the child shall learn to say, My father, and My mother, the riches of Damascus and the spoil of Samaria shall be borne away before the king of Assyria.
5 Onyenwe anyị gwakwara m okwu ọzọ sị,
Moreover, Jehovah spake to me again, saying:
6 “Nʼihi na ndị a ajụla mmiri Shiloa nke ji nwayọọ na-asọ ma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezin na nwa nwoke Remalaya,
Because this people despiseth The soft-flowing waters of Siloah, And rejoiceth in Rezin, and the son of Remaliah,
7 ya mere, Onyenwe anyị na-aga iweta iju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha, bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile. Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile, ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile,
Therefore, behold, the Lord bringeth upon them the strong and mighty waters of the river; [[The king of Assyria and all his glory.]] He shall rise above all his channels, And go over all his banks.
8 wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile, ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru. Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị, O Ịmanụel.”
And he shall pass through Judah, overflowing and spreading; Even to the neck shall he reach, And his stretched-out wings shall fill the whole breadth of thy land, O Immanuel!
9 Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu. Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya. Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu. Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu.
Rage, ye nations, and despair! Give ear, all ye distant parts of the earth! Gird yourselves, and despair! Gird yourselves, and despair!
10 Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
Form your plan, and it shall come to naught; Give the command, and it shall not stand; For God is with us.
11 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị:
For thus spake Jehovah to me with a strong hand, Instructing me not to walk in the way of this people:
12 “Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.
Call not everything a confederacy which this people calleth a confederacy; Fear ye not what they fear, Neither be afraid!
13 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.
Jehovah of hosts, sanctify ye him; Let him be your fear, and let him be your dread!
14 Ọ ga-abụkwa ebe nsọ; nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya.
And he shall be to you a sanctuary; But a stone of stumbling, and a rock to strike against, To the two houses of Israel, A trap and a snare to the inhabitants of Jerusalem.
15 Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ; ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara. Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.”
And many among them shall stumble; They shall fall, and be broken; They shall be ensnared and taken.
16 Kechie ihe ịgba ama nke iwu a kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya.
Bind up the revelation, Seal the word, with my disciples!
17 Aga m echere Onyenwe anyị, onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a. Aga m atụkwasị obi m na ya.
I will, therefore, wait for Jehovah, Who now hideth his face from the house of Jacob; Yet will I look for him.
18 Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn.
Behold, I, and the children which Jehovah hath given me, Are signs and tokens in Israel From Jehovah of hosts, who dwelleth upon mount Zion.
19 Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ?
And when they shall say to you, “Inquire of the necromancers and the wizards, That chirp, and that murmur,” [[Then say ye, ]] “Should not a people inquire of their God? Should they inquire of the dead for the living?”
20 Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.
To the word, to the revelation! If they speak not according to this, For them no bright morning shall arise.
21 Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha.
They shall pass through the land distressed and famished; And when they are famished, they shall be enraged, and curse their king and their God, And look upward.
22 Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.
And if they look to the earth, Behold distress and darkness, fearful darkness! And into darkness shall they be driven.

< Aịzaya 8 >