< Aịzaya 7 >

1 Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike.
In the time of Ahaz, the son of Jotham, the son of Uzziah, king of Judah, Rezin, king of Syria, and Pekah, the son of Remaliah, king of Israel, came up against Jerusalem to besiege it; but he could not prevail against it.
2 Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe.
And when it was told the house of David, that the Syrians had encamped in Ephraim, his heart was moved, and the hearts of his people, as the trees of the forest are moved with the wind.
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.
Then said Jehovah to Isaiah, Go forth to meet Ahaz, thou and Shear-Jashub thy son, at the end of the aqueduct of the upper pool, in the way to the fuller's field;
4 Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya.
and say to him: Take heed, and be quiet! Fear not, neither let thy heart he faint On account of the two tails of these smoking firebrands, On account of the fierce wrath of Rezin with the Syrians, and of the son of Remaliah,
5 E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị,
Because Syria deviseth evil against thee, Ephraim and the son of Remaliah, saying,
6 “Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.”
“Let us go up against Judah, and besiege the city, And take it, And set a king in the midst of it, Even the son of Tabeal.”
7 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa.
Thus saith the Lord Jehovah: “It shall not stand, neither shall it be;
8 Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem.
But the head of Syria shall still be Damascus, And the head of Damascus, Rezin; [[And within threescore and five years shall Ephraim be broken, that he be no more a people.]]
9 Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’”
And the head of Ephraim shall still be Samaria, And the head of Samaria, the son of Remaliah. If ye will not believe, neither shall ye thrive.”
10 Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị,
Jehovah spake also again to Ahaz:
11 “Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” (Sheol h7585)
“Ask thee a sign of Jehovah, thy God; Ask it from below, or in the height above!” (Sheol h7585)
12 Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.”
And Ahaz said, I will not ask; I will not tempt Jehovah!
13 Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?
Then he said, Hear ye now, O house of David! Is it too small a thing for you to weary men, That ye should weary my God also?
14 Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.
Therefore shall Jehovah himself give you a sign: Behold, the damsel shall conceive, and bear a son, And she shall call his name Immanuel.
15 Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.
Milk and honey shall he eat, Until he learn to refuse the evil, and choose the good;
16 Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.
For before this child shall have learned to refuse the evil and choose the good, The land shall become desolate, On account of whose two kings thou art in terror.
17 Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”
Yet Jehovah shall bring upon thee, and upon thy people, and upon thy father's house, Days such as have not been Since Ephraim revolted from Judah. [[Even the king of Assyria.]]
18 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa.
And it shall come to pass in that day That Jehovah shall whistle for the fly that is at the end of the streams of Egypt, And the bee that is in the land of Assyria,
19 Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile.
And they shall come, and light all of them In the desolate valleys, and fissures of the rocks, And upon all hedges, and upon all pastures.
20 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile.
In that day shall Jehovah shave, with a razor hired beyond the river, [[with the king of Assyria, ]] The head, and the hair of the feet; Yea, even the beard shall he take away.
21 Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ.
And it shall come to pass in that day, That a man shall keep a young cow, and two sheep;
22 Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.
And for the abundance of milk which they produce, shall he eat cheese; For milk and honey shall all eat Who are left in the land,
23 Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.
And it shall come to pass in that day, That every place where stood a thousand vines, worth a thousand shekels of silver, Shall be covered with briers and thorns.
24 Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.
With arrows and with bows shall men go thither; For all the land shall become briers and thorns.
25 Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.
All the hills that were digged with the mattock Shall no one approach through fear of briers and thorns; They shall be for the pasturage of oxen, And the trampling of sheep.

< Aịzaya 7 >