< Aịzaya 66 >
1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”
Itsho njalo iNkosi: Amazulu ayisihlalo sami sobukhosi, lomhlaba uyisenabelo senyawo zami. Ingaphi leyondlu elizangakhela yona? Njalo ingaphi indawo yami yokuphumula?
2 Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.
Ngoba zonke lezizinto isandla sami sazenza, lazo zonke lezizinto zikhona, itsho iNkosi. Kodwa kulowo ngizakhangela, kulowo ongumyanga lolomoya odabukileyo, lothuthumela ngelizwi lami.
3 Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.
Ohlaba inkabi unjengobulala umuntu; onikela umhlatshelo ngewundlu unjengowephula intamo yenja; onikela umnikelo wokudla unjengonikela igazi lengulube; otshisa impepha yesikhumbuzo unjengobusisa isithombe. Yebo, bona bakhethile izindlela zabo, lomphefumulo wabo uthokoza ngezinengiso zabo.
4 Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”
Lami ngizakhetha izigcono zabo, ngibehlisele abakwesabayo; ngoba ngabiza, akwaphendula muntu; ngakhuluma, akwalalela muntu; kodwa benza okubi emehlweni ami, bakhetha lokho engingathokozanga ngakho.
5 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.
Zwanini ilizwi leNkosi, lina elithuthumela ngelizwi layo. Abafowenu abalizondayo, abalixotsha ngenxa yebizo lami, bathi: Kayidunyiswe iNkosi; khona sizabona intokozo yenu; bona-ke bazayangeka.
6 Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.
Ilizwi lomsindo elivela emzini, ilizwi elivela ethempelini, ilizwi leNkosi elibuyisela izinzuzo ezitheni zayo.
7 “Tupu ime amalite ime ya, ọ mụpụtalarị nwa ya. Tupu ihe mgbu ya ebido, ọ mụpụtala nwa nwoke.
Ingakahelelwa, yazala; kungakafiki ubuhlungu bayo, yabeletha owesilisa.
8 Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya.
Ngubani owake wezwa okunje? Ngubani owake wabona izinto ezinje? Umhlaba uzakwenziwa uzale yini ngosuku olulodwa? Kumbe isizwe singabelethwa yini ngesikhathi sinye? Ngoba iZiyoni ithe ihelelwa, yazala abantwana bayo.
9 Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ.
Mina ngizasondeza ekuzalweni, ngingazalisi yini? itsho iNkosi. Ngizazalisa, besengivala yini? utsho uNkulunkulu wakho.
10 “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.
Thokozani kanye leJerusalema, lijabule layo, lina lonke eliyithandayo; thokozani kanye layo ngentokozo, lina lonke eliyililelayo;
11 Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
ukuze limunye, lisuthe ngamabele ezinduduzo zayo; ukuze limunyisise lizithokozise ngobunengi bodumo lwayo.
12 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya.
Ngoba itsho njalo iNkosi: Khangelani, ngizaqhelisa ukuthula kuye njengomfula, lodumo lwezizwe njengesifula esikhukhulayo; khona lizamunya, lithwalwe enhlangothini, lidlaliswe emadolweni.
13 Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
Njengalowo unina amduduzayo, ngokunjalo mina ngizaliduduza; njalo lizaduduzeka eJerusalema.
14 Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
Lapho libona lokhu, inhliziyo yenu izathokoza, lamathambo enu ahlume njengohlaza; lesandla seNkosi sizakwaziwa ngasezincekwini zayo, njalo izakuba lolaka ngasezitheni zayo.
15 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
Ngoba khangela, iNkosi izafika ngomlilo, lezinqola zayo njengesivunguzane, ukubuyisela intukuthelo yayo ngokufutheka, lokukhuza kwayo ngamalangabi omlilo.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
Ngoba ngomlilo langenkemba yayo iNkosi izangena ekwahluleleni layo yonke inyama, lababuleweyo beNkosi bazakuba banengi.
17 “Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Labo abazingcwelisayo, bazihlambulule ezivandeni ngemva kwesihlahla esisodwa esiphakathi, besidla inyama yezingulube, lesinengiso, legundwane, bazaqedwa kanyekanye, itsho iNkosi.
18 “Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.
Ngoba mina ngiyayazi imisebenzi yabo lemicabango yabo; kuzafika ukuthi ngibuthe zonke izizwe lezinlimi; njalo zizafika, zibone udumo lwami.
19 “Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya, na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.
Ngizabeka-ke isibonakaliso phakathi kwazo, ngithume abaphunyukileyo babo baye ezizweni, eTarshishi, iPhuli, leLudi, abadonsa idandili, eThubhali, leJavani, izihlenge ezikhatshana ezingakezwa indumela yami, lezingakaboni udumo lwami; njalo zizamemezela udumo lwami phakathi kwezizwe.
20 Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha.
Bazaletha-ke bonke abafowenu babe ngumnikelo eNkosini bephuma kuzo zonke izizwe bephezu kwamabhiza, langezinqola, langamathala, laphezu kwezimbongolo, laphezu kwezinyamazana ezilejubane, entabeni yami engcwele eJerusalema, itsho iNkosi, njengabantwana bakoIsrayeli beletha umnikelo ngesitsha esihlambulukileyo endlini yeNkosi.
21 Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.
Ngizathatha-ke lakubo babe ngabapristi njalo babe ngamaLevi, itsho iNkosi.
22 “Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ngoba njengamazulu amatsha lomhlaba omutsha engizakwenza kuzakuma phambi kwami, itsho iNkosi, ngokunjalo inzalo yakho lebizo lakho kuzakuma.
23 Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru.
Kuzakuthi-ke ekuthwaseni kwenye inyanga kusiya kwenye, njalo kusukela kwelinye isabatha kusiya kwelinye, yonke inyama izakuzakhonza phambi kwami, itsho iNkosi.
24 “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”
Bazaphuma-ke, babone izidumbu zabantu abaphambeke bemelene lami; ngoba impethu yabo kayiyikufa, lomlilo wabo kawuyikucitsha; njalo bazakuba yisinengiso kuyo yonke inyama.