< Aịzaya 66 >

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”
Hæc dicit Dominus: Cælum sedes mea, terra autem scabellum pedum meorum: quæ est ista Domus, quam ædificabitis mihi? et quis est iste locus quietis meæ?
2 Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.
Omnia hæc manus mea fecit, et facta sunt universa ista, dicit Dominus. ad quem autem respiciam, nisi ad pauperculum, et contritum spiritu, et trementem sermones meos?
3 Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.
Qui immolat bovem, quasi qui interficiat virum: qui mactat pecus, quasi qui excerebret canem: qui offert oblationem, quasi qui sanguinem suillum offerat: qui recordatur thuris, quasi qui benedicat idolo. Hæc omnia elegerunt in viis suis, et in abominationibus suis anima eorum delectata est.
4 Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”
Unde et ego eligam illusiones eorum: et quæ timebant, adducam eis: quia vocavi, et non erat qui responderet: locutus sum, et non audierunt: feceruntque malum in oculis meis, et quæ nolui elegerunt.
5 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.
Audite verbum Domini, qui tremitis ad verbum eius: dixerunt fratres vestri odientes vos, et abiicientes propter nomen meum: glorificetur Dominus, et videbimus in lætitia vestra: ipsi autem confundentur.
6 Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.
Vox populi de civitate, vox de templo, vox Domini reddentis retributionem inimicis suis.
7 “Tupu ime amalite ime ya, ọ mụpụtalarị nwa ya. Tupu ihe mgbu ya ebido, ọ mụpụtala nwa nwoke.
Antequam parturiret peperit: antequam veniret partus eius, peperit masculum.
8 Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya.
Quis audivit umquam tale? et quis vidit huic simile? numquid parturiet terra in die una? aut parietur gens simul, quia parturivit et peperit Sion filios suos?
9 Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ.
Numquid ego, qui alios parere facio, ipse non pariam, dicit Dominus? si ego, qui generationem ceteris tribuo, sterilis ero, ait Dominus Deus tuus?
10 “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.
Lætamini cum Ierusalem, et exultate in ea, omnes qui diligitis eam: gaudete cum ea gaudio universi, qui lugetis super eam
11 Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
ut sugatis, et repleamini ab ubere consolationis eius: ut mulgeatis, et deliciis affluatis ab omnimoda gloria eius.
12 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya.
Quia hæc dicit Dominus: Ecce ego declinabo super eam quasi fluvium pacis, et quasi torrentem inundantem gloriam Gentium, quam sugetis: ad ubera portabimini, et super genua blandientur vobis.
13 Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
Quomodo si cui mater blandiatur, ita ego consolabor vos, et in Ierusalem consolabimini.
14 Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
Videbitis, et gaudebit cor vestrum, et ossa vestra quasi herba germinabunt, et cognoscetur manus Domini servis eius, et indignabitur inimicis suis.
15 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
Quia ecce Dominus in igne veniet, et quasi turbo quadrigæ eius: reddere in indignatione furorem suum, et increpationem suam in flamma ignis:
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
quia in igne Dominus diiudicabit, et in gladio suo ad omnem carnem, et multiplicabuntur interfecti a Domino,
17 “Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
qui sanctificabantur, et mundos se putabant in hortis post ianuam intrinsecus, qui comedebant carnem suillam, et abominationem et murem: simul consumentur, dicit Dominus.
18 “Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.
Ego autem opera eorum, et cogitationes eorum: venio ut congregem cum omnibus gentibus et linguis: et venient et videbunt gloriam meam.
19 “Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya, na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.
Et ponam in eis signum, et mittam ex eis, qui salvati fuerint, ad Gentes in mare, in Africam, et Lydiam tendentes sagittam: in Italiam et Græciam, ad insulas longe, ad eos, qui non audierunt de me, et non viderunt gloriam meam. Et annunciabunt gloriam meam Gentibus,
20 Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha.
et adducent omnes fratres vestros de cunctis Gentibus donum Domino in equis, et in quadrigis, et in lecticis, et in mulis, et in carrucis, ad montem sanctum meum Ierusalem, dicit Dominus, quomodo si inferant filii Israel munus in vase mundo in domum Domini.
21 Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.
Et assumam ex eis in sacerdotes, et levitas, dicit Dominus:
22 “Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri.
Quia sicut cæli novi, et terra nova, quæ ego facio stare coram me, dicit Dominus: sic stabit semen vestrum, et nomen vestrum.
23 Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru.
Et erit mensis ex mense, et sabbatum ex sabbato: veniet omnis caro ut adoret coram facie mea, dicit Dominus.
24 “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”
Et egredientur, et videbunt cadavera virorum, qui prævaricati sunt in me: vermis eorum non morietur, et ignis eorum non extinguetur: et erunt usque ad satietatem visionis omni carni.

< Aịzaya 66 >