< Aịzaya 65 >
1 “Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m. Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m. Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m, asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’
“Ndakazviratidza kuna avo vasina kundibvunza; ndakawanikwa neavo vasina kunditsvaka. Kurudzi rwakanga rusina kudana kuzita rangu ndakati, ‘Ndiri pano, ndiri pano.’
2 Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,
Zuva rose ndakatambanudzira maoko angu kurudzi rwakasindimara, vanofamba munzira dzisina kunaka vachitevera zvavanofunga,
3 ndị na-anọgide na-akpasu m iwe nʼihu m mgbe niile, ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige, nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,
vanhu vanogara vachindigumbura ipo pamberi pangu chaipo, vachibayira zvibayiro pamapindu uye vachipisira zvinonhuhwira paaritari dzezvitinha;
4 ndị na-anọdụ nʼetiti ili, ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche; ndị na-eri anụ ezi, ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;
vanogara pakati pamarinda uye vanopedza usiku hwavo vachinyengetera vari munzira yakavanda: vanodya nyama yenguruve, uye hari dzavo dzine furo renyama yakasvibiswa;
5 ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso, nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’ Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m. Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.
vanoti, ‘Gara kure; usaswedera pedyo neni, nokuti ndiri mutsvene kupfuura iwe.’ Vanhu vakadaro utsi mumhuno dzangu, moto unoramba uchipfuta zuva rose.
6 “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha.
“Tarirai, zvakanyorwa pamberi pangu zvinoti: Handinganyarari asi ndicharipira zvakazara; ndichazviripa pamakumbo avo,
7 Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
zvakaipa zvenyu nezvamadzibaba enyu,” ndizvo zvinotaura Jehovha. “Nokuti vakapisira zvibayiro pamusoro pezvikomo, ndichayera pamakumbo avo muripo wakazara wamabasa avo akare.”
8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.
Zvanzi naJehovha: “Sezvazvakangoita kana musvi uchiri kuwanikwa musumbu ramazambiringa uye vanhu vachiti, ‘Musauparadza, muchine zvakanaka mauri,’ saizvozvo ndizvo zvandichaitira varanda vangu; handingavaparadzi vose.
9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Ndichabudisa marudzi kuna Jakobho, uye nokubva kuna Judha avo vachatora makomo angu; vasanangurwa vangu vachagara nhaka, uye varanda vangu vachagara ikoko.
10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike.
Sharoni richava mafuro amakwai, uye Mupata weAkori uchava uvato hwemombe dzavanhu vangu vanonditsvaka.
11 “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.
“Asi kana murimi munosiya Jehovha uye munokanganwa gomo rangu dzvene, munowaridzira Rombo Rakanaka tafura, uye munozadza zvirongo newaini yakavhenganisirwa Magumo,
12 Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”
ndichakuendesai kumunondo, uye mose muchakotamira pasi kuti mubayiwe, nokuti ndakadana asi hamuna kudavira, ndakataura asi hamuna kuteerera. Makaita zvakaipa pamberi pangu mukasarudza zvisingandifadzi.”
13 Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “Ndị ohu m ga-eriju afọ, ma unu ga-anọ agụụ, akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ, ma ha ga-aṅụ mmiri. Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere, ma ha ga-anọ nʼọṅụ.
Naizvozvo zvanzi naIshe Jehovha: “Varanda vangu vachadya, asi imi muchanzwa nzara; varanda vangu vachanwa, asi imi muchava nenyota; varanda vangu vachafara, asi imi muchanyadziswa.
14 Ndị ohu m ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha, ma unu ga-akwa akwa, nʼihi ihe mgbu nke obi unu, tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.
Varanda vangu vachaimba zvichibva mumufaro wemwoyo yavo, asi imi muchachema nokurwadziwa nemwoyo uye muchaungudza mukupwanyika kwomweya.
15 Unu ga-ahapụ aha unu nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ; nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu, ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.
Muchasiyira zita renyu kuvasanangurwa vangu sechituko; Ishe Jehovha achakuurayai, asi achapa varanda vake rimwe zita.
16 Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m.
Ani naani achati nyika iropafadzwe achazviita naMwari wechokwadi; ani naani achaita mhiko munyika achapika naMwari wechokwadi. Nokuti matambudziko akare achakanganwikwa, uye achavanzirwa meso angu.
17 “Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.
“Tarirai, ndichasika matenga matsva nenyika itsva. Zvinhu zvakare hazvichazorangarirwi, kana kuuya mundangariro.
18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
Asi farai mupembere nokusingaperi mune zvandichasika, nokuti ndichasika Jerusarema kuti rifadze uye kuti vanhu varo vave mufaro.
19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa.
Ndichapembera pamusoro peJerusarema, uye ndichafarira vanhu vangu; maungira okuchema kana kurira haachazonzwikwazve imomo.
20 “Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ, a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ.
“Mariri hamungazovazve nomucheche achararama mazuva mashoma shoma, kana mutana asingasvitsi makore ake okurarama; uyo anofa ane zana ramakore achangotorwa somujaya; uyo anotadza kusvika pazana ramakore achatorwa sowakatukwa.
21 Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
Vachavaka dzimba vagogara madziri; vachadyara mazambiringa vagodya michero yawo.
22 Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ, maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie. Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.
Havachazovakazve dzimba dzinozogarwa navamwe, kana kudyara vamwe vachizodya. Nokuti sezvakaita mazuva omuti, ndizvo zvichaita mazuva avanhu vangu; vasanangurwa vangu vachafara kwenguva refu mumabasa amaoko avo.
23 Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ. Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri, ha na ụmụ ụmụ ha.
Havachazoshandira pasina kana kubereka vana vanoparadzwa; nokuti vachava vanhu vakaropafadzwa naJehovha, ivo nezvizvarwa zvavo.
24 Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha. Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.
Vasati vadana ndichavapindura; vachiri kutaura ndichavanzwa.
25 Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe, ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi, ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja! Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ, maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
Bumhi negwayana zvichafura pamwe chete, uye shumba ichadya uswa senzombe, asi guruva richava chokudya chenyoka. Hazvichazokuvadza kana kuparadza pamusoro pegomo rangu dzvene rose,” ndizvo zvinotaura Jehovha.