< Aịzaya 64 >
1 Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!
Ìwọ ìbá fa ọ̀run ya kí o sì sọ̀kalẹ̀ wá, tí àwọn òkè ńlá yóò fi wárìrì níwájú rẹ!
2 Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.
Gẹ́gẹ́ bí ìgbà tí iná mú ẹ̀ka igi jó tí ó sì mú kí omi ó hó, sọ̀kalẹ̀ wá kí orúkọ rẹ le di mí mọ̀ fún àwọn ọ̀tá rẹ kí o sì jẹ́ kí àwọn orílẹ̀-èdè kí ó wárìrì níwájú rẹ!
3 Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.
Nítorí nígbà tí o bá ṣe àwọn ohun ẹ̀rù tí àwa kò nírètí, o sọ̀kalẹ̀ wá, àwọn òkè ńlá sì wárìrì níwájú rẹ̀.
4 Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
Láti ìgbà àtijọ́ kò sí ẹni tí ó gbọ́ rí kò sí etí kan tí ó gbọ́ ọ, kò sí ojú tí ó tí ì rí Ọlọ́run mìíràn lẹ́yìn rẹ, tí ó máa ń ṣe nǹkan lórúkọ àwọn tí ó dúró dè é.
5 Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
Ìwọ a máa wá fún ìrànlọ́wọ́ àwọn tí wọn ń fi ayọ̀ ṣe ohun tó tọ́, tí ó rántí ọ̀nà rẹ. Ṣùgbọ́n nígbà tí a bẹ̀rẹ̀ sí dẹ́ṣẹ̀ sí wọn, inú bí ọ. Báwo ni a ó ṣe gbà wá là?
6 Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
Gbogbo wa ti dàbí ẹnìkan tí ó jẹ́ aláìmọ́, gbogbo òdodo wa sì dàbí èkísà ẹlẹ́gbin; gbogbo wa kákò bí ewé, àti bí afẹ́fẹ́, ẹ̀ṣẹ̀ wa ti gbá wa lọ kúrò.
7 Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
Ẹnikẹ́ni kò pe orúkọ rẹ tàbí kí ó gbìyànjú láti dì ẹ́ mú; nítorí ìwọ ti fi ojú rẹ pamọ́ fún wa ó sì jẹ́ kí àwa ṣòfò dànù nítorí àwọn ẹ̀ṣẹ̀ wa.
8 Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
Síbẹ̀síbẹ̀, Olúwa, ìwọ ni Baba wa. Àwa ni amọ̀, ìwọ ni amọ̀kòkò; gbogbo wa jẹ́ iṣẹ́ ọwọ́ rẹ.
9 Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.
Má ṣe bínú kọjá ààlà, ìwọ Olúwa, má ṣe rántí gbogbo ẹ̀ṣẹ̀ wa títí láé. Jọ̀wọ́, bojú wò wá, ni a gbàdúrà, nítorí ènìyàn rẹ ni gbogbo wa.
10 Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara; ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.
Àwọn ìlú mímọ́ rẹ ti di aṣálẹ̀; Sioni pàápàá di aṣálẹ̀, Jerusalẹmu di ahoro.
11 Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe, abụrụla ihe a gbara ọkụ. Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
Tẹmpili mímọ́ ológo wa, níbi tí àwọn baba wa ti yìn ọ́, ni a ti fi iná sun, àti ohun gbogbo tí í ṣe ìṣúra wa ti dahoro.
12 Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike? Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?
Lẹ́yìn gbogbo nǹkan wọ̀nyí, Olúwa, ìwọ ó ha sì tún fi ara rẹ pamọ́ bí? Ìwọ ó ha dákẹ́ kí o sì fìyà jẹ wá kọjá ààlà bí?