< Aịzaya 64 >

1 Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!
Аще отверзеши небо, трепет приимут от Тебе горы и растают,
2 Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.
яко тает воск от лица огня, и попалит огнь супостаты, и явлено будет имя Твое в сопротивных Твоих: от лица Твоего языцы возмятутся:
3 Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.
егда сотвориши славная, трепет приимут от Тебе горы.
4 Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
От века не слышахом, ниже очи наши видеша бога, разве Тебе, и дела Твоя, яже сотвориши ждущым милости.
5 Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
Милость бо срящет творящих правду, и пути Твоя помянутся: се, Ты разгневался еси, и мы согрешихом.
6 Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
Сего ради заблудихом и быхом яко нечисти вси мы, якоже порт нечистыя вся правда наша, и отпадохом яко листвие беззаконий ради наших: тако ветр восхитит нас.
7 Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
И несть призываяй имя Твое и помянувый удержати Тя: яко отвратил еси лице Твое от нас и предал ны еси беззаконий ради наших.
8 Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
И ныне, Господи, Отец наш еси Ты, мы же брение, дела руку Твоею вси:
9 Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.
не прогневайся на ны зело и не помяни во время беззаконий наших, и ныне призри, яко людие Твои вси мы.
10 Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara; ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.
Град святилища Твоего бысть пуст, Сион якоже пустыня бысть, Иерусалим на проклятие:
11 Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe, abụrụla ihe a gbara ọkụ. Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
дом святый наш и слава, юже благословиша отцы наши, бысть огнем пожжен, и вся славная наша купно падоша.
12 Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike? Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?
И о всех сих терпел еси, Господи, и молчал, и смирил еси ны зело.

< Aịzaya 64 >