< Aịzaya 62 >
1 Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu.
Nítorí Sioni èmi kì yóò dákẹ́, nítorí i Jerusalẹmu èmi kì yóò sinmi ẹnu, títí tí òdodo rẹ̀ yóò fi tàn bí òwúrọ̀, àti ìgbàlà rẹ̀ bí i fìtílà tí ń jó geere.
2 Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.
Àwọn orílẹ̀-èdè yóò rí òdodo rẹ, àti gbogbo ọba ògo rẹ a ó sì máa pè ọ́ ní orúkọ mìíràn èyí tí ẹnu Olúwa yóò fi fún un.
3 Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.
Ìwọ yóò sì jẹ́ adé dídán ní ọwọ́ Olúwa, adé ọba ní ọwọ́ Ọlọ́run rẹ.
4 A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye.
Wọn kì yóò pè ọ́ ní ìkọ̀sílẹ̀ mọ́ tàbí kí wọ́n pe ilẹ̀ rẹ ní ahoro. Ṣùgbọ́n a ó máa pè ọ́ ní Hẹfsiba, àti ilẹ̀ rẹ ní Beula; nítorí Olúwa yóò yọ́nú sí ọ àti ilẹ̀ rẹ ni a ó gbé níyàwó.
5 Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
Gẹ́gẹ́ bí ọ̀dọ́mọkùnrin tí í gbé ọ̀dọ́mọbìnrin níyàwó, bẹ́ẹ̀ ni àwọn ọmọkùnrin rẹ yóò gbé ọ níyàwó Gẹ́gẹ́ bí ọkọ ìyàwó ṣe é yọ̀ lórí ìyàwó rẹ̀, bẹ́ẹ̀ ni Ọlọ́run rẹ yóò yọ̀ lórí rẹ.
6 Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem. Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị. Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị, unu enyela onwe unu izuike.
Èmi ti fi olùṣọ́ ránṣẹ́ sórí odi rẹ ìwọ Jerusalẹmu; wọn kì yóò lè dákẹ́ tọ̀sán tòru. Ẹ̀yin tí ń ké pe Olúwa, ẹ má ṣe fúnra yín ní ìsinmi,
7 Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike, meekwa ya otuto nke ụwa niile.
àti kí ẹ má ṣe fún òun pẹ̀lú ní ìsinmi títí tí yóò fi fi ìdí Jerusalẹmu múlẹ̀ tí yóò sì fi ṣe ìyìn orí ilẹ̀ ayé.
8 Onyenwe anyị ewerela aka nri ya werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị, “Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya.
Olúwa ti búra pẹ̀lú ọwọ́ ọ̀tún rẹ̀ àti nípa agbára apá rẹ: “Èmi kì yóò jẹ́ kí ìyẹ̀fun rẹ di oúnjẹ fún ọ̀tá rẹ bẹ́ẹ̀ ni àwọn àjèjì kì yóò mu wáìnì tuntun rẹ mọ́ èyí tí ìwọ ti ṣe làálàá fún;
9 Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa Onyenwe anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.”
ṣùgbọ́n àwọn tí ó bá kóórè rẹ̀ ni yóò jẹ ẹ́, tí wọn ó sì yin Olúwa, àti àwọn tí wọ́n bá kó àjàrà jọ ni wọn ó mú un, nínú àgbàlá ilé mímọ́ mi.”
10 Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile.
Ẹ kọjá, ẹ kọjá ní ẹnu ibodè náà! Ẹ tún ọ̀nà ṣe fún àwọn ènìyàn. Ẹ mọ ọ́n sókè, ṣe ojú ọ̀nà òpópó! Ẹ ṣa òkúta kúrò. Ẹ gbé àsíá sókè fún àwọn orílẹ̀-èdè.
11 Onyenwe anyị ekwusaala okwu nye nsọtụ niile nke ụwa sị, “Gwanụ Ada Zayọn, ‘Lee Onye Nzọpụta gị na-abịa! Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’”
Olúwa ti ṣe ìkéde títí dé òpin ilẹ̀ ayé: “Ẹ sọ fún ọmọbìnrin Sioni pé, ‘Kíyèsi i, Olùgbàlà rẹ ń bọ̀! Kíyèsi i, èrè ń bẹ pẹ̀lú rẹ̀, àti ẹ̀san rẹ̀ pẹ̀lú n tẹ̀lé e lẹ́yìn.’”
12 A ga-akpọ ha Ndị Nsọ, ndị Onyenwe anyị gbapụtara; a ga-akpọkwa unu ndị a na-achọsi ike, Obodo a na-agbakụtaghị azụ.
A ó sì pè wọ́n ní Ènìyàn Mímọ́, ẹni ìràpadà Olúwa; a ó sì máa pè ọ́ ní ìwákiri, ìlú tí a kì yóò kọ̀sílẹ̀.