< Aịzaya 60 >
1 “Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.
“Ondoka, angaza, kwa kuwa nuru yako imekuja na utukufu wa Bwana umezuka juu yako.
2 Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.
Tazama, giza litaifunika dunia na giza kuu litayafunika mataifa, lakini Bwana atazuka juu yako na utukufu wake utaonekana juu yako.
3 Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
Mataifa watakuja kwenye nuru yako na wafalme kwa mwanga wa mapambazuko yako.
4 “Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
“Inua macho yako na utazame pande zote: Wote wanakusanyika na kukujia, wana wako wanakuja toka mbali, nao binti zako wanabebwa mikononi.
5 Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
Ndipo utatazama na kutiwa nuru, moyo wako utasisimka na kujaa furaha, mali zilizo baharini zitaletwa kwako, utajiri wa mataifa utakujilia.
6 Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
Makundi ya ngamia yatajaa katika nchi yako, ngamia vijana wa Midiani na Efa. Nao wote watokao Sheba watakuja, wakichukua dhahabu na uvumba na kutangaza sifa za Bwana.
7 A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.
Makundi yote ya Kedari yatakusanyika kwako, kondoo dume wa Nebayothi watakutumikia, watakubalika kama sadaka juu ya madhabahu yangu, nami nitalipamba Hekalu langu tukufu.
8 “Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
“Ni nani hawa warukao kama mawingu, kama hua kuelekea kwenye viota vyao?
9 Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.
Hakika visiwa vinanitazama, merikebu za Tarshishi ndizo zinazotangulia, zikiwaleta wana wenu kutoka mbali, wakiwa na fedha na dhahabu zao, kwa heshima ya Bwana, Mungu wenu, yeye Aliye Mtakatifu wa Israeli, kwa maana amekujalia utukufu.
10 “Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
“Wageni watazijenga upya kuta zako, na wafalme wao watakutumikia. Ingawa katika hasira nilikupiga, lakini katika upendeleo wangu nitakuonyesha huruma.
11 Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
Malango yako yatakuwa wazi siku zote, kamwe hayatafungwa, mchana wala usiku, ili watu wapate kukuletea utajiri wa mataifa: wafalme wao wakiongoza maandamano ya ushindi.
12 Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha.
Kwa maana taifa au ufalme ule ambao hautakutumikia utaangamia; utaharibiwa kabisa.
13 “Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.
“Utukufu wa Lebanoni utakujilia, msunobari, mvinje pamoja na mteashuri, ili kupapamba mahali pangu patakatifu, nami nitapatukuza mahali pa miguu yangu.
14 Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel.
Wana wa wale waliokuonea watakuja wakisujudu mbele yako, wote wanaokudharau watasujudu kwenye miguu yako, nao watakuita Mji wa Bwana, Sayuni ya Aliye Mtakatifu wa Israeli.
15 “Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.
“Ingawa umeachwa na kuchukiwa, bila yeyote anayesafiri ndani yako, nitakufanya kuwa fahari ya milele, na furaha ya vizazi vyote.
16 Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
Utanyonya maziwa ya mataifa, na kunyonyeshwa matiti ya wafalme. Ndipo utakapojua kwamba Mimi, Bwana, ni Mwokozi wako, Mkombozi wako, niliye Mwenye Nguvu wa Yakobo.
17 Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.
Badala ya shaba nitakuletea dhahabu, na fedha badala ya chuma. Badala ya mti nitakuletea shaba, na chuma badala ya mawe. Nitafanya amani kuwa mtawala wako, na haki kuwa mfalme wako.
18 Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
Jeuri hazitasikika tena katika nchi yako, wala maangamizi au uharibifu ndani ya mipaka yako, lakini utaita kuta zako Wokovu, na malango yako Sifa.
19 Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
Jua halitakuwa tena nuru yako mchana, wala mwangaza wa mwezi hautakuangazia, kwa maana Bwana atakuwa nuru yako ya milele, naye Mungu wako atakuwa utukufu wako.
20 Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.
Jua lako halitazama tena, nao mwezi wako hautafifia tena; Bwana atakuwa nuru yako milele, nazo siku zako za huzuni zitakoma.
21 Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.
Ndipo watu wako wote watakuwa waadilifu, nao wataimiliki nchi milele. Wao ni chipukizi nililolipanda, kazi ya mikono yangu, ili kuonyesha utukufu wangu.
22 Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo, mba nta ga-aghọ obodo buru ibu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”
Aliye mdogo kwenu atakuwa elfu, mdogo kuliko wote atakuwa taifa lenye nguvu. Mimi ndimi Bwana; katika wakati wake nitayatimiza haya upesi.”