< Aịzaya 59 >
1 Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.
Lódodo ọwọ́ Olúwa kò kúrú láti gbàlà, tàbí kí etí rẹ̀ wúwo láti gbọ́.
2 Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.
Ṣùgbọ́n ẹ̀ṣẹ̀ yín ló ti yà yín kúrò lọ́dọ̀ Ọlọ́run yín; ẹ̀ṣẹ̀ yín ti fi ojú u rẹ̀ pamọ́ fún un yín tó bẹ́ẹ̀ tí òun kò fi le gbọ́.
3 Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
Nítorí ọwọ́ yín di aláìmọ́ fún ẹ̀jẹ̀, àti ìka ọwọ́ yín fún ẹ̀bi. Ètè yín ń pa irọ́ púpọ̀, ahọ́n yín sì ń sọ̀rọ̀ nǹkan ibi.
4 Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
Kò sí ẹni tí ó béèrè fún ìdájọ́ òdodo; kò sí ẹni tí ó ro ẹjọ́ rẹ̀ pẹ̀lú òtítọ́. Wọ́n gbẹ́kẹ̀lé àwíjàre asán àti ọ̀rọ̀ irọ́; wọ́n lóyún ìkà, wọn sì bí wàhálà.
5 Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
Wọn ń pa ẹ̀yin paramọ́lẹ̀ wọn sì ń ta owú aláǹtakùn. Ẹnikẹ́ni tí ó bá jẹ ẹyin wọn yóò kú, àti nígbà tí a pa ọ̀kan, paramọ́lẹ̀ ni ó jáde.
6 Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
Òwú wọn kò wúlò fún aṣọ rírán; wọn kò lè fi aṣọ tí wọ́n hun bo ara wọn. Iṣẹ́ wọn jẹ́ ti ibi, ìwà jàǹdùkú sì kún ọwọ́ wọn.
7 Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
Ẹsẹ̀ wọn yára bọ́ sínú ẹ̀ṣẹ̀; wọ́n yára láti ta ẹ̀jẹ̀ aláìṣẹ̀ sílẹ̀. Èrò wọn sì jẹ́ èrò ibi; ìparun àti ìdahoro ni ó wà ní ṣíṣe àmì ọ̀nà wọn.
8 Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.
Ọ̀nà àlàáfíà èyí ni wọn kò mọ̀; kò sí òdodo ní ojú ọ̀nà wọn wọ́n ti sọ wọ́n dì ọ̀nà kọ́rọkọ̀rọ, kò sí ẹni tí ó tọ ọ̀nà yìí tí yóò rí àlàáfíà.
9 Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.
Nítorí èyí ni ẹ̀tọ́ fi jìnnà sí wa, àti tí òdodo kò fi tẹ̀ wá lọ́wọ́. A ń wá ìmọ́lẹ̀, ṣùgbọ́n gbogbo rẹ̀ jẹ́ òkùnkùn; ìmọ́lẹ̀, ṣùgbọ́n à ń rìn nínú òjìji.
10 Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.
Gẹ́gẹ́ bí afọ́jú à ń táràrà lọ lẹ́gbẹ̀ẹ́ ògiri tí a ń wá ọ̀nà wa gẹ́gẹ́ bí ènìyàn tí kò ní ojú. Ní ọ̀sán gangan ni à ń kọsẹ̀ bí ẹni pé alẹ́ ni; láàrín alágbára àwa dàbí òkú.
11 Anyị na-agbọ ụja dịka bịa; anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ. Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka; anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ.
Gbogbo wa là ń ké bí i beari; àwa pohùnréré ẹkún bí àdàbà. A ń wá ìdájọ́ òdodo ṣùgbọ́n kò sí; à ń wọ́nà fún ìtúsílẹ̀, ṣùgbọ́n ó jìnnà réré.
12 Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị; ọ na-agbakwa ama megide anyị. E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ, nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile.
Nítorí àwọn àṣìṣe wa pọ̀ níwájú rẹ, àwọn ẹ̀ṣẹ̀ wa sì ń jẹ́rìí takò wá. Àwọn àìṣedéédéé wa sì wà pẹ̀lú wa, àwa pẹ̀lú sì mọ àìṣedéédéé wa,
13 Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị Onyenwe anyị; anyị esitela nʼiso Onyenwe anyị Chineke anyị wezuga onwe anyị, nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi. Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta.
ọ̀tẹ̀ àti àrékérekè wa sí Olúwa, kíkọ ẹ̀yìn wa sí Ọlọ́run, dídá yánpọnyánrin àti ìnilára sílẹ̀, pípààrọ̀ tí ọkàn wa ti gbèrò síta.
14 Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata.
Nítorí èyí ni a ṣe lé ìdájọ́ òdodo sẹ́yìn, àti ti òdodo dúró lókèèrè; òtítọ́ ti ṣubú ní òpópó ọ̀nà, òdodo kò sì le è wọlé.
15 E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.
A kò rí òtítọ́ mọ́, àti ẹni tí ó bá sá fun ibi tì di ìjẹ. Olúwa wò ó ọkàn rẹ̀ sì bàjẹ́ pé kò sí ìdájọ́ òdodo.
16 Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.
Òun rí i pé kò sí ẹnìkan, àyà fò ó pé kò sí ẹnìkan láti ṣèrànwọ́; nítorí apá òun tìkára rẹ̀ ló ṣiṣẹ́ ìgbàlà fún ara rẹ̀, àti òdodo òun tìkára rẹ̀ ló gbé e ró.
17 Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.
Ó gbé òdodo wọ̀ gẹ́gẹ́ bí ìgbàyà rẹ̀, àti àṣíborí ìgbàlà ní orí rẹ̀; ó gbé ẹ̀wù ẹ̀san wọ̀ ó sì yí ara rẹ̀ ní ìtara bí ẹ̀wù.
18 Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.
Gẹ́gẹ́ bí ohun tí wọ́n ti ṣe, bẹ́ẹ̀ ni yóò san án ìbínú fún àwọn ọ̀tá rẹ̀ àti ẹ̀san fún àwọn ọ̀tá rẹ̀; òun yóò san án fún àwọn erékùṣù ẹ̀tọ́ wọn.
19 Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị, sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya. Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.
Láti ìwọ̀-oòrùn, àwọn ènìyàn yóò bẹ̀rù orúkọ Olúwa, àti láti ìlà-oòrùn, wọn yóò bọ̀wọ̀ fún ògo rẹ̀. Nítorí òun yóò wá gẹ́gẹ́ bí i rírú omi èyí tí èémí Olúwa ń tì lọ.
20 “Onye mgbapụta ga-abịa na Zayọn; ọ ga-abịakwute ụmụ Jekọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Olùdáǹdè yóò wá sí Sioni, sí àwọn tí ó wà ní Jakọbu tí ó ronúpìwàdà ẹ̀ṣẹ̀ wọn,” ni Olúwa wí.
21 “Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
“Àti fún èmi, májẹ̀mú mi pẹ̀lú wọn nìyìí,” ni Olúwa wí, “Ẹ̀mí mi, tí ó wà nínú yín, àti ọ̀rọ̀ mi tí mo ti fi sí ẹnu yín, kì yóò kúrò lẹ́nu yín, tàbí lẹ́nu àwọn ọmọ yín, tàbí láti ẹnu àwọn ìrandíran wọn láti àkókò yìí lọ àti títí láéláé,” ni Olúwa wí.