< Aịzaya 58 >
1 “Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.
''Lia kwa sauti; usinyamaze. Paza sauti yako juu kama mbiu. Kabiliana na watu wangu wenye uasi, na nyumba ya Yakobo na dhambi zao.
2 Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.
Bali wananitafuta mimi kila siku na kufurahia katika maarifa ya njia zangu, kama taifa linalotenda haki na hawakuiacha sheria ya Mungu wao. Wananiuliza mimi kuhusu hukumu ya haki; wamepata furaha katika mawazo yao ya kwa kumkaribia Mungu
3 Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.
Kwa niini tulifunga; walisema, 'Lakini hamkuona hilo? Kwa nini tulijinyenyekeza wenywe, lakini hakutambua?' Tazama, siku ya kufunda kwanu utatafuta furaha yanu mwenyewe na kuwanyanyasa wafanyakazi wenu wote.
4 Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.
Tazama, ninyi mnafunga ili muwe wepesi wa kugombana na kupigana, na kupiga kwa ngumi ya uovu wako; haujafunga leo kuifanya sauti yako isikike juu.
5 Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara, naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala? Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara, nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ? Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ, ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?
Kwa uhalisi aina ya mfungo huu ndio ambao ninauhitaji: Siku ambayo kila mtu hunyenyekea mwenyewe, huinamisha kichwa chake chini kama mwanzi, na hutawanya mavazi ya magunia na majivu chini yake? Je kweli unauita huu ni mfungo, siku ya kumfurahisha Yahwe?
6 “Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?
Hii sio mfungo ambao niliuchagua mimi: kufungua vifungo vya waovu, kufungua kamba za nira, kuwaweka huru walioangamizwa, na kuharibu kila nira?
7 Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.
Sio kwamba kula mkate na wenye njaa na kuwaleta masikini na kuwaleta wasio na makazi katika nyuma yako?'' Unapomuana mtu yuko uchi, unatakiwa vumvishe mavazi; na usijifiche mwenyewe na ndugu zako.
8 Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
Halafu mwanga wako utafunguliwa kama jua, na uponyaji wako utachipukia juu kwa haraka; haki yako itaenda mbele zake, na na utukufu wa Yahwe utakuwa nyuma kukulinda.
9 Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,
Halafu utamuita, na Yahwe atakuitikia; utalia ukihitaji msaada, na atasema, ''Nipo hapa.'' Ikiwa utaitoa nira isiwepo miongoni mwako, kidole kinachoshataki, maongezi ya waovu,
10 ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.
Ikiwa wewe mwenyewe utawapa wenye njaa na kuwaridhisha wahitaji katika shida, na giza lako litakuwa kama mchana.
11 Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
Halafu Yahwe ataendelea kuwaongoza ninyi na kuwa ridhisha ninyi katika mikoa ambayo hakuna maji, Ataimarisha mifupa yenu. Mtakuwa kama bustani iliyonyeshewa maji, na kama mkondo wa maji, ambaopo maji yake hayapungui.
12 Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.
Baadhi yenu mtajenga tena sehumu za kale zilizoharibiwa; mtatengeneza sehemu zilizoharibiwana vizazi vingi; na mtaitwa ''Mrekebishaji wa ukuta,'' kuwarejesha katika mtaa ya kuishi.''
13 “Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ, sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m, ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu, ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị, na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
Tuseme kwamba ukigeuza nyuma miguu yenu kutoka safarini katika siku ya sabato, kufanya anasa siku yangu takatifu, Tuseme kwamba umeiita sabato siku ya furaha, na umeiita siku ya Bwana Yahwe mtakatifu na yenye kuheshimiwa. Tuseme kwamba unahieshimu sabato kwa kuacha biashara zako, na hautafuti anasa zako mwenyewe na uzungumzi maneno yako mwenyewe.
14 mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị, m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ, meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
''Halafu utapata furaha kwa Yahwe; na nitaifanya safari yako juu ya urefu wa nchi; Nitakulisha wewe kwenye urithi wa Yakobo baba yenu- maana mdomo wa Yahwe umezungumza.''