< Aịzaya 57 >
1 Ndị ezi omume na-ala nʼiyi, ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi; a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ọ dịghị onye na-aghọta, na-ewezugara onye ezi omume pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
Mwenye haki hupotea, wala hakuna hata mmoja awazaye hilo moyoni mwake; watu wanaomcha Mungu huondolewa, wala hakuna hata mmoja anayeelewa kuwa wenye haki wameondolewa ili wasipatikane na maovu.
2 Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha na-abanye nʼudo. Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.
Wale waendao kwa unyofu huwa na amani; hupata pumziko walalapo mautini.
3 “Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
“Lakini ninyi: Njooni hapa, ninyi wana wa wachawi, ninyi wazao wa wazinzi na makahaba!
4 Onye ka unu na-akwa emo? Onye ka unu na-akọcha, na-arapụtakwara ire unu? Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi, mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?
Mnamdhihaki nani? Ni nani mnayemcheka kwa dharau, na kumtolea ndimi zenu? Je, ninyi si watoto wa waasi, uzao wa waongo?
5 Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla. Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
Mnawaka tamaa katikati ya mialoni na chini ya kila mti uliotanda matawi; mnawatoa kafara watoto wenu kwenye mabonde na chini ya majabali yenye mianya.
6 Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?
“Sanamu zilizo katikati ya mawe laini ya mabondeni ndizo fungu lenu; hizo ndizo sehemu yenu. Naam, kwa hizo mmemimina sadaka za vinywaji, na kutoa sadaka za nafaka. Katika haya yote, niendelee kuona huruma?
7 Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
Umeweka kitanda chako juu kwenye kilima kirefu kilichoinuka, huko ulikwenda kutoa dhabihu zako.
8 Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
Nyuma ya milango yako na miimo yako umeweka alama zako za kipagani. Kwa kuniacha mimi, ulifunua kitanda chako, umepanda juu yake na kukipanua sana; ulifanya patano na wale ambao unapenda vitanda vyao, nawe uliangalia uchi wao.
9 Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. (Sheol )
Ulikwenda kwa Moleki ukiwa na mafuta ya zeituni, na ukaongeza manukato yako. Ukawatuma wajumbe wako mbali sana, ukashuka kwenye kaburi lenyewe! (Sheol )
10 Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.
Ulikuwa umechoshwa na njia zako zote, lakini hukusema, ‘Hakuna tumaini.’ Ulipata uhuisho wa nguvu zako, kwa sababu hiyo hukuzimia.
11 “Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a? Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu? Ị naghị echetakwa m, ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị? Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
“Ni nani uliyemhofu hivyo na kumwogopa hata ukawa mwongo kwangu, wala hukunikumbuka au kutafakari hili moyoni mwako? Si ni kwa sababu nimekuwa kimya muda mrefu hata huniogopi?
12 Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
Nitaifunua haki yako na matendo yako, nayo hayatakufaidi.
13 Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”
Utakapolia kwa kuhitaji msaada, sanamu zako ulizojikusanyia na zikuokoe! Upepo utazipeperusha zote, pumzi peke yake itazipeperusha, Lakini mtu atakayenifanya kimbilio lake, atairithi nchi na kuumiliki mlima wangu mtakatifu.”
14 A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
Tena itasemwa: “Jengeni, jengeni, itengenezeni njia! Ondoeni vikwazo katika njia ya watu wangu.”
15 Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
Kwa maana hili ndilo asemalo Aliye juu, yeye aliyeinuliwa sana, yeye aishiye milele, ambaye jina lake ni Mtakatifu: “Ninaishi mimi mahali palipoinuka na patakatifu, lakini pia pamoja na yeye aliye na roho iliyotubu na mwenye roho ya unyenyekevu, ili kuzihuisha roho za wanyenyekevu na kuihuisha mioyo yao waliotubu.
16 Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
Sitaendelea kulaumu milele, wala sitakasirika siku zote, kwa kuwa roho ya mwanadamu ingezimia mbele zangu: yaani pumzi ya mwanadamu niliyemuumba.
17 Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
Nilighadhibika na tamaa yake ya dhambi; nilimwadhibu, nikauficha uso wangu kwa hasira, na bado aliendelea katika njia zake za tamaa.
18 Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.
Nimeziona njia zake, lakini nitamponya, nitamwongoza na kumrudishia upya faraja,
19 Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”
nikiumba sifa midomoni ya waombolezaji katika Israeli. Amani, amani, kwa wale walio mbali na kwa wale walio karibu,” asema Bwana. “Nami nitawaponya.”
20 Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.
Bali waovu ni kama bahari ichafukayo, ambayo haiwezi kutulia, mawimbi yake hutupa takataka na matope.
21 “Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.
Mungu wangu asema, “Hakuna amani kwa waovu.”