< Aịzaya 57 >
1 Ndị ezi omume na-ala nʼiyi, ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi; a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ọ dịghị onye na-aghọta, na-ewezugara onye ezi omume pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
The righteous man perishes, and no man lays it to heart. And merciful men are taken away; none considering that the righteous man is taken away from the evil.
2 Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha na-abanye nʼudo. Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.
He enters into peace. They rest in their beds, each one who walks in his uprightness.
3 “Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.
But draw near here, ye sons of the sorceress, the seed of the adulterer and the harlot.
4 Onye ka unu na-akwa emo? Onye ka unu na-akọcha, na-arapụtakwara ire unu? Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi, mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?
Against whom do ye sport yourselves, against whom ye make a wide mouth, and put out the tongue? Are ye not children of transgression, a seed of falsehood,
5 Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla. Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.
ye who inflame yourselves among the oaks, under every green tree, who kill the children in the valleys, under the clefts of the rocks?
6 Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?
Among the smooth stones of the valley is thy portion. They, they are thy lot, even to them thou have poured a drink offering; thou have offered an oblation. Shall I be appeased for these things?
7 Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
Upon a high and lofty mountain thou have set thy bed. Thou also went up there to offer sacrifice.
8 Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
And behind the doors and the posts thou have set up thy memorial. For thou have uncovered thyself to another than me, and have gone up. Thou have enlarged thy bed, and made thee a covenant with them. Thou loved their bed where thou saw it.
9 Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. (Sheol )
And thou went to the king with oil, and increased thy perfumes, and sent thine ambassadors far off, and debased thyself even to Sheol. (Sheol )
10 Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.
Thou were wearied with the length of thy way, yet thou did not say, It is in vain. Thou found a quickening of thy strength, therefore thou were not faint.
11 “Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a? Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu? Ị naghị echetakwa m, ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị? Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile ka i ji hapụ ịtụ m egwu?
And of whom have thou been afraid and in fear, that thou lie, and have not remembered me, nor laid it to thy heart? Have I not held my peace even of long time, and thou do not fear me?
12 Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.
I will declare thy righteousness. And as for thy works, they shall not profit thee.
13 Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”
When thou cry, let those whom thou have gathered deliver thee. But the wind shall take them; a breath shall carry them all away. But he who takes refuge in me shall possess the land, and shall inherit my holy mountain.
14 A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”
And he will say, Cast ye up, cast ye up, prepare the way. Take up the stumbling-block out of the way of my people.
15 Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
For thus says the high and lofty One who inhabits eternity, whose name is Holy: I dwell in the high and holy place, also with him who is of a contrite and humble spirit, to revive the spirit of the humble, and to revive the heart of the contrite.
16 Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.
For I will not contend forever, nor will I always be angry, for the spirit would faint before me, and the souls that I have made.
17 Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
For the iniquity of his covetousness I was angry, and smote him. I hid my face and was angry, and he went on backsliding in the way of his heart.
18 Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.
I have seen his ways, and will heal him. I will lead him also, and restore comforts to him and to his mourners.
19 Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”
I create the fruit of the lips. Peace, peace, to him who is far off and to him who is near, says Jehovah, and I will heal him.
20 Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.
But the wicked are like the troubled sea, for it cannot rest, and its waters cast up mire and dirt.
21 “Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.
There is no peace, says my God, to the wicked.