< Aịzaya 56 >
1 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị, “Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ihe ziri ezi. Nʼihi na nzọpụta m dị nso, ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.
Nanku okutshiwo nguThixo: “Londoloza ukulunga wenze okuqondileyo, ngoba ukusindisa kwami kuseduze lokulunga kwami kuzabonakaliswa masinyane.
2 Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a, bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike, onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya, nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”
Ubusisiwe umuntu okwenzayo lokhu, umuntu obambelela kukho, ogcina iSabatha engalingcolisi, athibe isandla sakhe ekwenzeni okubi.”
3 Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
Akungabi lowezizweni okuThixo othi, “Ngeqiniso uThixo uzangehlukanisa labantu bakhe.” Njalo lomthenwa kangavunyelwa ukusola athi, “Mina ngiyisihlahla esomileyo.”
4 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
Ngoba uThixo uthi: “Abathenwa abagcina amaSabatha ami bakhethe okungithokozisayo, babambelele kusivumelwano sami,
5 Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
ngizabanika, phakathi kwethempeli lami lemiduli yalo, isikhumbuzo lebizo elingcono kulamadodana lamadodakazi. Ngizabanika ibizo elingapheliyo. Elingayikukhohlakala.
6 Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
Labezizwe abazinikela kuThixo ukuba bamkhonze, bathande ibizo likaThixo, njalo bamkhonze, bonke abagcina iSabatha bengalingcolisi, babambelele kusivumelwano sami,
7 ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”
laba ngizabaletha entabeni yami engcwele, ngibaphe intokozo endlini yami yokukhulekela. Iminikelo yabo yokutshiswa, lemihlatshelo, kuzakwamukelwa e-alithareni lami; ngoba indlu yami izathiwa yindlu yokukhuleka yezizwe zonke.”
8 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”
UThixo Wobukhosi, yena oqoqa abaxotshwayo elizweni abako-Israyeli uthi: “Ngizaqoqela abanye kubo futhi ngaphandle kwalabo abavele sebeqoqiwe.”
9 Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa. Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.
Wozani lonke lina zilo zeganga; wozani lidle, lonke lina zilo zamagusu!
10 Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.
Abalindi bako-Israyeli bayiziphofu, bonke kabazi lutho; bonke bayimigaxa, izinja ezingakhonkothiyo; balala nje baphuphe; bathanda ukulala.
11 Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.
Bayizinja ezihlala zilomdlozela wokufuna ukudla, azisuthi. Bangabelusi abangaqedisisiyo, bonke bazazenzela abakufunayo, lowo lalowo udinga inzuzo yakhe.
12 Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya, ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị. Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
Lowo lalowo uthi, “Wozani, ngilethe iwayini. Kasinatheni utshwala sibusuthe. Kusasa kuzafana lanamuhla, loba kube ngcono kakhulu.”