< Aịzaya 55 >

1 Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.
« Bino nyonso oyo bozali na posa ya komela, boya, boya na esika oyo mayi ezali; ezala bino oyo bozali na mbongo te, boya kosomba mpe kolia; boya kosomba vino mpe miliki: ezali ya ofele, ya kosomba na mbongo te!
2 Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!
Mpo na nini bozali kobebisa mbongo mpo na bilei oyo etongaka nzoto te, mpe kobimisa motoki mpo na bilei oyo etondisaka te? Boyoka, boyoka Ngai mpe bolia bilei ya kitoko, mpe bokosepela na biloko ya elengi.
3 “Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.
Bopesa Ngai matoyi na bino mpe boya epai na Ngai, boyoka mpe bokozala na bomoi; nakosala boyokani ya libela elongo na bino, boyokani oyo nalakaki Davidi, na boyengebene mpe na bolingo na Ngai.
4 Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.
Tala, nakomisaki ye motatoli na Ngai na miso ya bato ya bikolo ebele, mokambi mpe motambolisi ya bato.
5 Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”
Solo, okobenga bikolo oyo oyebi te, mpe bikolo oyo eyebi yo te ekoya na lombangu epai na yo mpo na Yawe, Nzambe na yo, mpo na Mosantu ya Isalaele, pamba te alatisi yo nkembo. »
6 Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
Boluka Yawe wana akoki nanu komonana, bobelela Ye wana azali nanu pene.
7 Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
Tika ete moto mabe atika banzela na ye, mpe tika ete mosumuki atika makanisi na ye; tika ete azonga epai na Yawe mpo ete ayokela ye mawa, tika ete azonga epai ya Nzambe na biso, pamba te alimbisaka kaka.
8 “Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
« Makanisi na Ngai ezali makanisi na bino te, mpe banzela na Ngai ezali banzela na bino te, » elobi Yawe.
9 “Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
« Pamba te ndenge likolo eleki mosika na mabele, ndenge wana mpe banzela na Ngai ezali likolo koleka banzela na bino, mpe makanisi na Ngai ezali likolo koleka makanisi na bino.
10 Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.
Ndenge mvula mpe mvula ya pembe enokaka wuta na likolo mpe ezongaka te na likolo soki epolisi mabele te, soki ebotisi yango bambuma mpe bafololo te, soki epesi nkona te na moloni mpe bilei te na moto oyo aliaka,
11 Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
ndenge wana mpe liloba oyo ebimaka na monoko na Ngai ezalaka: ezongaka pamba te epai na Ngai, soki esali nanu te mokano na Ngai, mpe soki ekokisi nanu te mabongisi oyo natindelaki yango.
12 Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.
Bokobima na esengo, mpe bakotambolisa bino na kimia; bangomba milayi mpe bangomba mikuse ekoyemba nzembo ya elonga liboso na bino, mpe banzete nyonso ya zamba ekobeta maboko.
13 Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya; ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya. Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu, nke ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
Nzete ya sipele ekobota na esika ya banzube, nzete ya mirite ekobota na esika ya basende; ekozala, mpo na lokumu ya Kombo ya Yawe, elembo ya libela na libela, oyo ekotikala kobebisama te. »

< Aịzaya 55 >