< Aịzaya 53 >
1 Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?
Ndianiko akatenda zvatakaparidza, uye ruoko rwaJehovha rwakaratidzwa kuna aniko?
2 Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.
Akamera pamberi pake sebukira nyoro, uye somudzi pavhu rakaoma. Akanga asina runako kana chimiro choumambo kuti atikwezve kwaari, hapana chatingada pakuratidzika kwake.
3 Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.
Akazvidzwa uye akarambwa navanhu, murume wokusuwa, uye anoziva kutambudzika. Somunhu anovanzirwa chiso navanhu, akazvidzwa, uye isu hatina kumukudza.
4 Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.
Zvirokwazvo akatakura matenda edu, uye akatakura kurwadziswa kwedu; asi isu takafunga kuti akarohwa naMwari, akarohwa naye uye akarwadziswa.
5 Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.
Asi akabayiwa nokuda kwokudarika kwedu, akakuvadzwa nokuda kwezvakaipa zvedu; kurohwa kwakativigira rugare kwaiva pamusoro pake, uye namavanga ake takaporeswa.
6 Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile.
Isu tose takanga takarasika samakwai, mumwe nomumwe nenzira yake, asi Jehovha akaisa pamusoro pake kuipa kwedu tose.
7 A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.
Akamanikidzwa uye akarwadziswa, asi haana kushamisa muromo wake; akatungamirirwa segwayana riri kundobayiwa, uye sokunyarara kwegwai pamberi pomuveuri waro, saizvozvo haana kushamisa muromo wake.
8 Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya. Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu? Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ; maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.
Akabviswa achimanikidzwa uye akatongwa. Uye ndianiko angataura rudzi rwake? Nokuti akagurwa kubva panyika yavapenyu, nokuda kwokudarika kwavanhu vangu, akarohwa.
9 E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.
Akapiwa guva rake pakati pavatadzi, uye akava navapfumi pakufa kwake, kunyange akanga asina kuita zvechisimba, uye kunyengera kusina kuwanikwa mumuromo make.
10 Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
Asi kwakanga kuri kuda kwaJehovha kuti amukuvadze uye aite kuti atambudzike, uye kunyange zvazvo Jehovha akaita kuti upenyu hwake huve chipiriso chezvivi, achaona zvibereko zvake uye achawedzera mazuva ake, uye kuda kwaJehovha kuchabudirira muruoko rwake.
11 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
Shure kwokutambudzika kwomweya wake, achaona chiedza choupenyu uye achagutsikana; nokuziva kwake, muranda wangu akarurama acharuramisira vazhinji, uye achatakura kuipa kwavo.
12 Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha, nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ, a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.
Naizvozvo ndichamupa mugove pakati pavakuru vakuru, uye achagoverana zvakapambwa navane simba, nokuti akadurura upenyu hwake kusvika parufu, akaverengwa pamwe chete navadariki. Nokuti akatakura chivi chavazhinji, akanyengeterera vadariki.