< Aịzaya 51 >

1 Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
Nisikilizeni mimi, enyi mtendao haki, enyi mtafutaye Yahwe: Tazama katika mwamba uliouchonga nakuchimba kutoka pale ulipopakata.
2 Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
Mtazameni Ibrahimu, baba yenu, na Sara, aliyewazaa ninyi; maan alipokuwa na upweke yeye mwenyewe, Nilimuita yeye. Nikambariki yeye na kumfanya yeye kuwa wengi.
3 Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.
Ndio, Yahwe ataifariji Sayuni; Ataifariji miji yake yote iliyo na ukiwa; jangwa lake atalifanya kama Edeni, na jangwa lililo wazi pembeni ya bonde la mto Yordani kama bustani ya Yahwe; Furaha na shangwe vitakuwa kwake, shukrani, na sauti ya kuimba.
4 Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
''Kuwa makini kwangu, watu wangu; na nisikilizeni mimi, watu wangu! Maana nitatoa amri, na nitaifanya haki yangu kuwa sheria ya mataifa.
5 Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ, nzọpụta m na-adịkwa nso. Aga m achịkwa mba niile. Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m; ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha.
Haki yangu ipo karibu; wokovu wangu utaenda nje, na mikono yangu itahihukumu mataifa; Pwani itanisubiri mimi; maana wanashauku ya kuhusubiria mkono wangu.
6 Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
Nyanyueni macho yanu juu angani, na tazama nchi chini, maana mbingu zitatoweka mbali kama moshi, na nchi itachakaa kama vazi, na wenyeji wake watakufa kama inzi. Lakini wokovu wangu utaendelea daima, na haki yangu haitaacha kutenda kazi.
7 Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma, unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu. Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu, unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu.
Nisikizeni mimi, enyi mnaotambua ukweli, enyi watu wangu mliobeba sheria yangu katika mioyo yenu: Msiogope matusi ya watu, wala kukatishwa tamaa na unyanyasaji wao.
8 Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Maana Nonda watawala wao kama vazi, na minyoo itawala wao kama sufu; lakini haki yangu itakwa daima, na wokovu wangu katika vizazi vyote.''
9 Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?
Amka, amka, jivishe wewe mwenyewe kwa nguvu, mkono wa Yahwe. Amka kama siku za zamani, kizazi cha nyaktii za kale, Je sio wewe uliyeangamiza mnyama wa baharini, na uliyemchoma joka?
10 Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?
Je haukukausha bahari, maji ya kina kirefu, na kufanya kina cha bahari kuwa nija ya ukombozi kupita?
11 Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
Fidia ya Yahwe itarudi na kwenda Sayuni kwa kilio cha furaha na furaha ya milele itakuwa katika vichwa vyao, na huzuni na kuomboleza vitatoweka mbali.
12 “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,
''Mimi, mimi ndiye niwapae faraja. Kwa nini uwaogope watu, ambao wanakufa, watatoto wa wanadamu, waliofanywa kama majani?
13 na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?
Kwa nini umemsahau Yahwe Muumba, yeye azinyooshayembingu na kuweka misingi ya nchi? Nyie ambao mna hofu za mara kwa mara kila siku kwa sababu ya hasira ya moto ya wanyanyasaji anapo fanya maamuzi ya kuangamiza. Iko wapi hasira ya wanyanyasaji?
14 Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha.
Yeye aliyeinama chini, Yahwe atafanya haraka kumuachia; hatakufa wala kwenda chini katika shimo, wala hatakosa mkate.
15 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
Maana Yahwe Mungu wenu, anaye ifanya bahari itembee, hivyo mawimbi yake yavume kwa kishindo- Yahwe wa majeshi ndilo jina lake.
16 Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’”
Niweka maneno yangu mdomoni mwako, na nimekufunika wewe kwa kivuli cha mkono wangu, ili niweze kupanda mbingu, kuweka misingi ya nchi, na kutamkia Sayuni, 'ninyi ni watu wangu.''
17 Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.
Amka, amka, simama juu, Yerusalemu, ewe unyweae katika kikombe cha hasira ya Yahwe kutoka mkononi mwako; umekunjwa katika kikombe, kikombe cha mateso, na umekunjwa na kumaliza.
18 Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.
Hakuna hata mmoja miongoni mwa watoto aliyewazaa wa kumuongoza yeye; hakuna hata mmoja miongoni mwa wote aliyewalea wa kumshika mkono wake.
19 Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?
Shida hizi mbili ziliwatokea ninyi- ni nani atahuzunika pamja nanyi? - ukiwa na uharibifu, na njaa na upanga. Ni nani atakayekufariji wewe?
20 Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
Watoto wako walizimia; walilala kila kona ya mtaa, kama swala kwenye mtego; Wamejawa na hasira ya Yahwe, Laana ya Mungu wako.
21 Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
Lakini sasa sikiliza hili, ewe uliodhulumiwa na kulewa, lakini sio kwa mvinyo:
22 Lee ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
Bwana wenu Yahwe Mungu, anayewasihi watu wake, asema hivi, ''Tazama, Nimechukua kikombe cha ukubwa mkononi mwako- ukubwa wa kikombe cha hasira yangu - ili usiweze kunjwa tena.
23 Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”
Nitakuweka kwenye mikono ya watesaji, wale waliokuambia wewe, Lala chini, ili tutembee juu yako'; wameufanya mgongo wako kama uwanjwa na kama wao wa.''

< Aịzaya 51 >