< Aịzaya 51 >

1 Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
「義を追い求め、主を尋ね求める者よ、わたしに聞け。あなたがたの切り出された岩と、あなたがたの掘り出された穴とを思いみよ。
2 Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
あなたがたの父アブラハムと、あなたがたを産んだサラとを思いみよ。わたしは彼をただひとりであったときに召し、彼を祝福して、その子孫を増し加えた。
3 Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.
主はシオンを慰め、またそのすべて荒れた所を慰めて、その荒野をエデンのように、そのさばくを主の園のようにされる。こうして、その中に喜びと楽しみとがあり、感謝と歌の声とがある。
4 Ndị m, geenụ m ntị; ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem, nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ; ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
わが民よ、わたしに聞け、わが国びとよ、わたしに耳を傾けよ。律法はわたしから出、わが道はもろもろの民の光となる。
5 Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ, nzọpụta m na-adịkwa nso. Aga m achịkwa mba niile. Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m; ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha.
わが義はすみやかに近づき、わが救は出て行った。わが腕はもろもろの民を治める。海沿いの国々はわたしを待ち望み、わが腕に寄り頼む。
6 Welienụ anya unu lee anya nʼelu, leekwanụ anya nʼụwa, nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ; ụwa ga-aka nka dịka akwa, ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji. Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
目をあげて天を見、また下なる地を見よ。天は煙のように消え、地は衣のようにふるび、その中に住む者は、ぶよのように死ぬ。しかし、わが救はとこしえにながらえ、わが義はくじけることがない。
7 Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma, unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu. Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu, unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu.
義を知る者よ、心のうちにわが律法をたもつ者よ、わたしに聞け。人のそしりを恐れてはならない、彼らのののしりに驚いてはならない。
8 Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa. Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ. Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
彼らは衣のように、しみに食われ、羊の毛のように虫に食われるからだ。しかし、わが義はとこしえにながらえ、わが救はよろず代に及ぶ」。
9 Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?
主のかいなよ、さめよ、さめよ、力を着よ。さめて、いにしえの日、昔の代にあったようになれ。ラハブを切り殺し、龍を刺し貫いたのは、あなたではなかったか。
10 Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?
海をかわかし、大いなる淵の水をかわかし、また海の深き所を、あがなわれた者の過ぎる道とされたのは、あなたではなかったか。
11 Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
主にあがなわれた者は、歌うたいつつ、シオンに帰ってきて、そのこうべに、とこしえの喜びをいただき、彼らは喜びと楽しみとを得、悲しみと嘆きとは逃げ去る。
12 “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,
「わたしこそあなたを慰める者だ。あなたは何者なれば、死ぬべき人を恐れ、草のようになるべき人の子を恐れるのか。
13 na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?
天をのべ、地の基をすえられたあなたの造り主、主を忘れて、なぜ、しえたげる者が滅ぼそうと備えをするとき、その憤りのゆえに常にひねもす恐れるのか。しえたげる者の憤りはどこにあるか。
14 Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala. Ha agaghị anwụ nʼime olulu, nri agakwaghị akọ ha.
身をかがめている捕われ人は、すみやかに解かれて、死ぬことなく、穴にくだることなく、その食物はつきることがない。
15 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
わたしは海をふるわせ、その波をなりどよめかすあなたの神、主である。その名を万軍の主という。
16 Etinyela m okwu m nʼọnụ gị, chebekwa gị nʼọbụaka m. Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya, dokwaa ntọala nke ụwa. Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’”
わたしはわが言葉をあなたの口におき、わが手の陰にあなたを隠した。こうして、わたしは天をのべ、地の基をすえ、シオンにむかって、あなたはわが民であると言う」。
17 Teta, teta, bilie gị Jerusalem, gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị, bụ iko nke oke iwe ya. Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.
エルサレムよ、起きよ、起きよ、立て。あなたはさきに主の手から憤りの杯をうけて飲み、よろめかす大杯を、滓までも飲みほした。
18 Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ, nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ o kwesiri ịgbaso.
その産んだもろもろの子のなかに、自分を導く者なく、その育てたもろもろの子のなかに、自分の手をとる者がない。
19 Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị. Onye ga-akasị gị obi? Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha, onye ga-akasị gị obi?
これら二つの事があなたに臨んだだれがあなたと共に嘆くだろうか荒廃と滅亡、ききんとつるぎ。だれがあなたを慰めるだろうか。
20 Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.
あなたの子らは息絶えだえになり、網にかかった、かもしかのように、すべてのちまたのすみに横たわり、主の憤りと、あなたの神の責めとは、彼らに満ちている。
21 Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu, ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
それゆえ、苦しめる者、酒にではなく酔っている者よ、これを聞け。
22 Lee ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi. “Lee, aga m esite nʼaka gị wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa, ị gaghị aṅụkwa site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
あなたの主、おのが民の訴えを弁護されるあなたの神、主はこう言われる、「見よ、わたしはよろめかす杯をあなたの手から取り除き、わが憤りの大杯を取り除いた。あなたは再びこれを飲むことはない。
23 Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị, bụ ndị sịrị gị, ‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’ I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ ebe ndị mmadụ si aga ije.”
わたしはこれをあなたを悩ます者の手におく。彼らはさきにあなたにむかって言った、『身をかがめよ、われわれは越えていこう』と。そしてあなたはその背を地のようにし、ちまたのようにして、彼らの越えていくにまかせた」。

< Aịzaya 51 >