< Aịzaya 48 >

1 “Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.
“Sikilizeni hili, ee nyumba ya Yakobo, ninyi mnaoitwa kwa jina la Israeli, na mnaotoka katika ukoo wa Yuda, ninyi mnaoapa kwa jina la Bwana, mnaomwomba Mungu wa Israeli, lakini si katika kweli au kwa haki;
2 Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ninyi mnaojiita raiya wa mji mtakatifu, na kumtegemea Mungu wa Israeli, Bwana Mwenye Nguvu Zote ndilo jina lake:
3 Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.
Nilitoa unabii mambo ya kwanza tangu zamani, kinywa changu kiliyatangaza na kuyafanya yajulikane; kisha ghafula nikayatenda, nayo yakatokea.
4 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.
Kwa kuwa nalijua jinsi ulivyokuwa mkaidi; mishipa ya shingo yako ilikuwa chuma, kipaji chako cha uso kilikuwa shaba.
5 Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’
Kwa hiyo nilikuambia mambo haya tangu zamani, kabla hayajatokea nilikutangazia ili usije ukasema, ‘Sanamu zangu zilifanya hayo; kinyago changu cha mti na mungu wangu wa chuma aliyaamuru.’
6 Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu, ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu. “Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ nke m na-agwabeghị unu na mbụ.
Umesikia mambo haya; yaangalie hayo yote. Je, hutayakubali? “Kuanzia sasa na kuendelea nitakueleza mambo mapya, juu ya mambo yaliyofichika usiyoyajua.
7 Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’
Yameumbwa sasa, wala si tangu zamani; hukupata kuyasikia kabla ya siku ya leo. Hivyo huwezi kusema, ‘Naam, niliyajua hayo.’
8 E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.
Hujayasikia wala kuyaelewa, tangu zamani sikio lako halikufunguka. Ninafahamu vyema jinsi ulivyo mdanganyifu, uliitwa mwasi tangu kuzaliwa kwako.
9 Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.
Kwa ajili ya Jina langu mwenyewe ninaichelewesha ghadhabu yangu, kwa ajili ya sifa zangu nimeizuia isikupate, ili nisije nikakukatilia mbali.
10 Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.
Tazama, nimekusafisha, ingawa si kama fedha, nimekujaribu katika tanuru ya mateso.
11 Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a. Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ? Agaghị m enye onye ọzọ otuto m.
Kwa ajili yangu mwenyewe, kwa ajili yangu mwenyewe, nafanya hili. Jinsi gani niliache Jina langu lichafuliwe? Sitautoa utukufu wangu kwa mwingine.
12 “Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.
“Ee Yakobo, nisikilize mimi, Israeli, ambaye nimekuita: Mimi ndiye; mimi ndimi mwanzo na mwisho.
13 Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m.
Mkono wangu mwenyewe uliweka misingi ya dunia, nao mkono wangu wa kuume umezitanda mbingu; niziitapo, zote husimama pamoja.
14 “Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị. Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime? Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma ga-emezu nzube ya megide Babilọn, aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.
“Kusanyikeni, ninyi nyote, msikilize: Ni ipi miongoni mwa hizo sanamu ambayo imetabiri vitu hivi? Watu wa Bwana waliochaguliwa na kuungana watatimiza kusudi lake dhidi ya Babeli; mkono wa Mungu utakuwa dhidi ya Wakaldayo.
15 Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.
Mimi, naam, Mimi, nimenena; naam, nimemwita yeye. Nitamleta, naye atafanikiwa katika lile nililomtuma.
16 “Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya.
“Nikaribieni na msikilize hili: “Tangu tangazo la kwanza sikusema kwa siri; wakati litokeapo, nitakuwako hapo.” Sasa Bwana Mwenyezi amenituma, kwa Roho wake.
17 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
Hili ndilo asemalo Bwana, Mkombozi wako, yeye Aliye Mtakatifu wa Israeli: “Mimi ni Bwana, Mungu wako, nikufundishaye ili upate faida, nikuongozaye katika njia ikupasayo kuiendea.
18 A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
Laiti ungesikiliza kwa makini maagizo yangu, amani yako ingekuwa kama mto, haki yako kama mawimbi ya bahari.
19 Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”
Wazao wako wangekuwa kama mchanga, watoto wako kama chembe zake zisizohesabika; kamwe jina lao lisingefutiliwa mbali, wala kuangamizwa kutoka mbele zangu.”
20 Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”
Tokeni huko Babeli, kimbieni kutoka kwa Wakaldayo! Tangazeni hili kwa kelele za shangwe na kulihubiri. Lipelekeni mpaka miisho ya dunia; semeni, “Bwana amemkomboa mtumishi wake Yakobo.”
21 Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta.
Hawakuona kiu alipowaongoza kupita jangwani; alifanya maji yatiririke kutoka kwenye mwamba kwa ajili yao; akapasua mwamba na maji yakatoka kwa nguvu.
22 Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”
“Hakuna amani kwa waovu,” asema Bwana.

< Aịzaya 48 >