< Aịzaya 48 >

1 “Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume.
雅各伯家請聽這話:──你們以以色列的名字自稱,出自猶大之後,奉上主的名字起誓,又稱揚「以色列的天主,」但都不是出自誠心誠意;
2 Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
雖然你們自稱是出自聖城,依賴名為「萬軍上主」的以色列的天主──「
3 Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Mgbe m kwupụrụ ya, emekwara m ka ihe ahụ m kwuru mezuo.
那過去的事,我早就預言過了,由我口中所發出的,也叫人聽見了;轉瞬間我行了那事,那事也就成就了。
4 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike, matakwa na akwara dị unu nʼolu bụ igwe a na-apụghị ịrọji arọji. Amakwaara m na egedege ihu unu bụ bronz.
因為我知道你是頑固的,你的頸項似鐵槓,你的額是銅製的,
5 Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga ihe m gaje ime, ka unu ghara ị sị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ya. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na chi ọla m nyere iwu ka ha mee!’
為此我早就告訴了你,在事未發生之前我就向你說明了,免得你說:「是我的神像行了這事,是我雕刻鑄成的神像命定了這事。」
6 Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu, ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu. “Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ nke m na-agwabeghị unu na mbụ.
你既聽見了,也看見了這一切,難道你們不該作證嗎﹖如今我要宣佈新事,即你不知的隱密事。
7 Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie. Unu anụtụbeghị ihe banyere ya mbụ, ya mere, unu agaghị asị, ‘Ọ bụ ihe maara ihe banyere ya.’
這些事是現今而不是從前造成的,是今日之前你從沒有聽說過的,免得你說:「看,我早就知道了!」
8 E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.
你從來沒有聽過,也不知道,也是你的耳朵聞所未聞的。因為我知道你好背信叛逆,你實在可稱為「胎生的叛徒。」
9 Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.
但是為了我名的緣故,我暫緩發怒;為了我榮譽的緣故,我抑制了我自己,而沒有消滅你。
10 Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.
看啊!我只是鍛煉了你,有如銀子,在患難的爐中磨煉了你。
11 Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a. Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ? Agaghị m enye onye ọzọ otuto m.
為了我自己,為了我自己的緣故,我必要去行。我豈能讓我的名字受褻瀆﹖我決不將我的光榮讓與別人。」
12 “Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.
雅各伯啊!我所召叫的以色列啊!你聽我說:我就是那位,我是元始, 我也是終末。
13 Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m.
我的手奠定了大地,我的右手展開了諸天;我一叫它們,它們就一同出現。
14 “Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị. Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime? Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma ga-emezu nzube ya megide Babilọn, aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.
你們都集合起來聽罷!邪神中有誰預言了這事呢﹖「我所愛的,必實行我的旨意:攻擊巴比倫和加色丁的苗裔。」
15 Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.
只有我,只有我預言了這事,召叫了他,引導了他,使他所行的道路順利。
16 “Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya.
你們走近我前,聽這話罷!我從起初就沒有在暗處說過話,從實現之時起,我就在那裏。我上主現在即要施行救援。
17 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
你的救主上主,以色列的聖者這樣說:「我是上主你的天主,教訓你為你有益的事,引你走當走的道路。
18 A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
恨不得你一向聽從我的命令! 那麼你的安樂將似江河,你的幸福將似海濤;
19 Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”
你的子孫多如海沙,出於你身的苗裔多似沙粒;你的名字在我前決不會抹去,也決不會被刪除。」
20 Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”
你們出離巴比倫,逃出加色丁罷!你們要以歡樂的呼聲宣告此事,叫人聽見,傳佈到地極說:「上主救贖了他的僕人雅各伯。」
21 Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta.
當上主率領他們過曠野時,他們並不覺渴,因為他使水由巖石中流出給他們喝;他分開了巖石,水就湧流出來。
22 Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”
上主說:惡人決無平安!

< Aịzaya 48 >