< Aịzaya 46 >
1 Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu. Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu. Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ, ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!
ベルは伏しネボは屈む かれらの像はけものと家畜とのうへにあり なんぢらが擡げあるきしものは荷となりて疲れおとろへたるけものの負ところとなりぬ
2 Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu; ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha, ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.
かれらは屈みかれらは共にふし その荷となれる者をすくふこと能はずして己とらはれゆく
3 “Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb, unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel, unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
ヤコブの家よイスラエルのいへの遺れるものよ 腹をいでしより我におはれ胎をいでしより我にもたげられしものよ 皆われにきくべし
4 Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.
なんぢらの年老るまで我はかはらず白髮となるまで我なんぢらを負ん 我つくりたれば擡ぐべし我また負ひかつ救はん
5 “Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha? Onye ka unu ga-eji tụnyere m?
なんぢら我をたれに比べ たれに配ひ たれに擬らへ かつ相くらぶべきか
6 Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya, na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ, were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi, emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.
人々ふくろより黄金をかたぶけいだし權衡をもて白銀をはかり金工をやとひてこれを神につくらせ之にひれふして拜む
7 Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.
彼等はこれをもたげて肩にのせ 負ひゆきてその處に安置す すなはち立てその處をはなれず 人これにむかひて呼はれども答ふること能はず 又これをすくひて苦難のうちより出すことあたはず
8 “Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya, ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.
なんぢら此事をおもひいでて堅くたつべし 悖逆者よこのことを心にとめよ
9 Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.
汝等いにしへより以來のことをおもひいでよ われは神なり我のほかに神なし われは神なり我のごとき者なし
10 Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
われは終のことを始よりつげ いまだ成ざることを昔よりつげ わが謀畧はかならず立つといひ すべて我がよろこぶことを成んといへり
11 Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe, e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m. Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo; ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.
われ東より鷲をまねき遠國よりわが定めおける人をまねかん 我このことを語りたれば必らず來らすべし 我このことを謀りたればかならず成すべし
12 Geenụ m ntị, unu ndị isi ike, unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.
なんぢら心かたくなにして義にとほざかるものよ我にきけ
13 Ana m eweta ezi omume nso, ọ dịghị nʼebe dị anya, nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ. Aga m enye Zayọn nzọpụta, nyekwa Izrel ịma mma m.
われわが義をちかづかしむ可ればその來ること遠からず わが救おそからず 我すくひをシオンにあたへ わが榮光をイスラエルにあたへん