< Aịzaya 42 >

1 “Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
Behold my servant, whom I uphold, My chosen, in whom my soul delighteth, I have put my spirit upon him; He shall cause law to go forth to the nations.
2 Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa, maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi.
He shall not cry aloud, nor lift up his voice, Nor cause it to be heard in the street.
3 Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
The bruised reed shall he not break, And the glimmering flax shall he not quench; He shall send forth law according to truth.
4 Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”
He shall not fail, nor become weary, Until he shall have established justice in the earth. And distant nations shall wait for his law.
5 Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.
Thus saith God Jehovah, Who created the heavens and stretched them out, Who spread forth the earth, and that which springeth forth from it, Who gave breath to the people upon it, And spirit to them that walk thereon:
6 “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m. Aga m echebe gị, gbaa gị ume, nʼihi na eweere m gị nye ndị m ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike. Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
I, Jehovah, have called thee for salvation; I will hold thee by the hand; I will defend thee, and make thee a covenant to the people, A light to the nations;
7 Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.
To open the blind eyes, To bring out the prisoners from the prison, And them that sit in darkness out of the prison-house.
8 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m.
I am Jehovah, that is my name; And my glory will I not give to another, Nor my praise to graven images.
9 Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”
The former things, behold! they are come to pass, And new things do I now declare; Before they spring forth, I make them known to you.
10 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu.
Sing to Jehovah a new song; His praise to the ends of the earth; Ye that go down upon the sea, and all that fill it; Ye distant coasts, and ye that dwell therein!
11 Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.
Let the desert cry aloud, and the cities thereof; The villages, that Kedar inhabiteth; Let the inhabitants of the rock sing; Let them shout from the top of the mountains!
12 Ka ha nye Onyenwe anyị ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.
Let them give glory to Jehovah, And proclaim his praise in distant lands!
13 Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha. Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya, ma merie ha.
Jehovah shall march forth like a hero; Like a mighty warrior shall he rouse his indignation, He shall cry aloud; he shall shout the war-cry, And show himself mighty against his enemies.
14 “Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị; ejidesịrị m onwe m aka ike. Ma ugbu a, aga m egosi iwe m; aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme.
“I have long held my peace; I have been still and refrained myself; But now will I cry like a woman in travail; I will destroy and swallow up at once.
15 Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị, meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ. Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara, meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ.
I will lay waste mountains and hills, And dry up all their herbs. I will make the river solid land, And dry up the pools of water.
16 Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.
Then will I lead the blind in a way which they know not, And in unknown paths will I guide them; I will make darkness light before them, And crooked paths straight; These things will I do for them, and not forsake them.”
17 Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi, ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’ a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere.
Then shall they be turned back, and be put to shame, Who trust in graven images; Who say to molten images, “Ye are our gods!”
18 “Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri, leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ.
Hear, O ye deaf! And look, ye blind, and see!
19 Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m? Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m? Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị?
Who is blind, if not my servant? And who so deaf as my messenger, whom I send? Who so blind as the friend of God, So blind as the servant of Jehovah?
20 Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”
Thou seest many things, but regardest them not; Thou hast thine ears open, but hearest not!
21 Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.
It pleased Jehovah for his goodness' sake To give him a law, great and glorious;
22 Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”
And yet it is a robbed and plundered people; They are all of them bound in prisons, And hid in dungeons; They have become a spoil, and none delivereth; A prey, and none saith, “Restore!”
23 Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
Who is there among you that will give ear to this, That will listen and attend for the time to come?
24 Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya.
Who gave Jacob to be a spoil, And Israel to plunderers? Was it not Jehovah, against whom we sinned, In whose ways we would not walk, And whose laws we would not obey?
25 Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya, ihe ike nke agha. Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya; o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.
Therefore hath he poured out upon Israel the fury of his wrath, and the violence of war; It kindled a flame around about him, yet he did not regard it; It set him on fire, yet he laid it not to heart.

< Aịzaya 42 >