< Aịzaya 40 >
1 Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru.
''Faraja, faraja watu wangu,'' amesema Mungu.
2 Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile.
''Ongea kwa upole kwa Yerusalemu; na tangaza vita vimeisha, maana maovu yao yamesamehewa, maana alipokea mara mbili kutoka kwa mkono wa Yahwe kwa dhambi zao.''
3 Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.
Sauti inalia nje, ''Katika jangwa tengeneza njia ya Yahwe; njoosha njia ya Araba katika njia kuu ya Mungu.''
4 A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.
Kila bonde litanyanyuliwa juu, kila mlima na kilima kitasawazishwa; na aridhi ya mwinuko itasawazishwa, mahali palipokwaruzwa patakuwa na usawa;
5 Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.”
na utukufu wa Mungu utafunuliwa, na watu wote wataona kwa pamoja; maana mdomo wa Yahwe umezungumza.
6 Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.
Sauti inasema, ''Lia.'' Jibu lingine, ''Kwa nini nilie?'' ''Mwili wote ni nyasi na maagano yaliyoaminika ni kama ua kwenye shamba.
7 Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.
Nyasi zinanyauka na maua yanaperuka pale Yehwe atakapo puliza punzi yake juu yake; hakika ubinadamu ni nyasi.
8 E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.”
Nyasi hunyauka, maua hupepea, lakini neno la Yahwe litasimama daima.''
9 Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.”
Nenda juu ya mlima mrefu, Sayuni, mbeba taarifa njema. waambie miji ya Yuda, ''Hapa ni Mungu wako!''
10 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
Angalia, Bwana Yahwe anakuja kama mpiganaji shujaa na jeshi imara linatawa juu yake. Ona, zawadi yako iko kwake, na wale walikombolewa wataenda mbele yake.
11 Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
Atalilisha kundi lake kama mchungaji, Atawakusanya kondoo katika jeshi lake, na kulichukua karibu na moyo wake, kwa upole atawongoza wake kuwauuguza watoto wao.
12 Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
Ni nani aliyepima maji ya mashimo kwa mkono wake, anayepima anga kwa urefu wa mkono wake, na kuweka vumbi za nchi katika kikapu, kupima milima kwa mizani, au vilima kwa usawa?
13 Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
Ni nani aliyeelewa akili za Yahwe, au kumuelekeza yeye kama mshauri?
14 Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?
Ni kutka kwa nani alipokea maelekezo milele? Nani alikufundisha njia sahihi ya kufanya vitu, kumfundisha yeye maarifa, au kumuonyesha njia ya ufahamu?
15 Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere; a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe; ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ.
Tazama, Mataifa ni kama tone katika ndoo, na kama mavumbi kwenye mizani; ona, na alipima kisiwa kama tundu.
16 Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
Lebanoni sio mafuta ya kutosha, wala wanyama pori wake hawatoshi kwa dhabihu ya kuteketezwa.
17 O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.
Mataifa yote hayatochelezi mbele yake; wanachukuliwa na yeye kama hakuna kitu.
18 Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
Ni nanibasi utayemlingalisha na Mungu? Ni kwa sanamu ipi utakayomfananisha nayo?
19 Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
Sanamu! ambayo fundi ameitupa: Mfua dhahabu ameka pamoja na mikufu bandi ya fedha.
20 Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure. Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma, onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada.
Kuafanya sadaka hii mtu atachagua kuni ambayo haiozi; anamtafuta fundi mwenye ujuzi wa kutengeneza sanamu ambayo haitaanguka.
21 Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
Je hamkujua? Je hamjasikia? Je hamkuambiwa tokea mwanzo? Je hamkuelewa toka misingi ya nchi?
22 Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya.
Yeye ndiye aketie juu ya upeo wa macho ya nchi? na wenyeji wake ni kama panzi mbele yake. Akijinyoosha nje ya mbingu ni kama pazia na kutawnya nje kama hema la kuishi.
23 Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
Anawapunguza viongozi kuwa si kitu na amewafanya viongozi wa nchi kwa sio wenye umuhimu.
24 Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Tazama wamekuwa wagumu kuotesha; tazama wamekuwa wagumu kupanda; imekuwa ni vigumu kuchukua mzizi katika nchi, kabla ajapuliza juu yao, na wakanyauka, na upepo unawaondosha mbali kama majani.
25 “Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.
Ni nani tena utakayemfananisha na mimi, ni nani ninayefanan nae?'' amesema mtakatifu.
26 Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
Tazama juu kwenye anga! Nani aliyeziumba nyota hizi zote? Analileta nje jeshi na anawaita kwa majina yote. Kwa ukuu wa nguvu zake na kwa uimara wa nguvu zake, hakuna hata mmoja atakayekosa.
27 Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
Kwa nini unasema, Yakobo, na kutangaza, Israeli, ''Njia yangu imefichwa Yahwe asione, na Mungu wangu hakuwekwa wazi kuhusiana na uthibitisho wangu''?
28 Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
Je hakufahamu? Mungu wa milele, Yahwe, Muumbaji wa miisho ya nchi, apatwi na uchovu wala hachoki; hakuna mipaka katika ufahamu wake.
29 Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
Anawapa nguvu waliochoka; na atawapa nguvu mpya waliowadhaifu.
30 Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
Hata vijana wadogo watapatwa na uchovu na kuchoka, vijana wadogo watapata mashaka na kuanguka:
31 ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Lakini wale watakao mngojea Yahwe watapewa nguvu mpya; na watapaa kwa mbawa kama malaika; watakimbia wala hawatachoka; watatembea wala hawatazimia.